Jenesis 36:1-43

36  Nke a bụ akụkọ banyere Isọ, ya bụ, Idọm.+  Isọ si n’etiti ndị inyom Kenan lụta ndị nwunye ya:+ Eda+ bụ́ ada Ilọn onye Het+ na Oholibema+ ada Ena, nwa nwa Zibiọn onye Haịvaịt,  nakwa Basemat,+ ada Ishmel, bụ́ nwanne nwaanyị Nebeyọt.+  Eda wee mụọrọ Isọ Elifaz, Basemat wee mụọ Ruel,  Oholibema wee mụọ Jiọsh na Jelam na Kora.+ Ọ bụ ndị a bụ ụmụ ndị ikom Isọ bụ́ ndị a mụụrụ ya n’ala Kenan.  E mesịa, Isọ kpọọrọ ndị nwunye ya na ụmụ ya ndị ikom na ụmụ ya ndị inyom na mkpụrụ obi niile nọ n’ụlọ ya, chịrịkwa ehi ya na anụmanụ ya niile ndị ọzọ na akụ̀ niile ọ kpatara+ n’ala Kenan, si n’ebe Jekọb nwanne ya nọ gaa n’ala ọzọ,+  n’ihi na akụ̀ ha adịwo ukwuu nke na ha apụghị ibikọta ọnụ, ala ha biri dị ka ndị ọbịa enweghịkwa ike izuru ha n’ihi ìgwè anụ ụlọ ha.+  Isọ wee biri n’ógbè Sia bụ́ ugwu ugwu.+ Isọ bụ Idọm.+  Nke a bụ akụkọ banyere Isọ, nna ndị Idọm, bụ́ ndị bi n’ógbè Sia bụ́ ugwu ugwu.+ 10  Ndị a bụ aha ụmụ ndị ikom Isọ: Elifaz nwa Eda, bụ́ nwunye Isọ; Ruel nwa Basemat, bụ́ nwunye Isọ.+ 11  Ụmụ ndị ikom Elifaz wee bụrụ Timan,+ Oma, Zifo na Getam na Kinaz.+ 12  Timna+ wee bụrụ iko Elifaz, nwa Isọ. Ka oge na-aga, ọ mụụrụ Elifaz Amalek.+ Ọ bụ ndị a bụ ụmụ ndị ikom Eda, nwunye Isọ. 13  Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Ruel: Nehat na Zira, Shama na Miza.+ Ndị a wee bụrụ ụmụ ndị ikom Basemat,+ nwunye Isọ. 14  Ndị a wee bụrụ ụmụ ndị ikom Oholibema nwunye Isọ, bụ́ nwa Ena na nwa nwa Zibiọn, n’ihi na ọ mụụrụ Isọ Jiọsh na Jelam na Kora.+ 15  Ndị a bụ ndị isi+ n’ime ụmụ ndị ikom Isọ: Ụmụ Elifaz bụ́ ọkpara Isọ: Onyeisi bụ́ Timan;+ onyeisi bụ́ Oma, onyeisi bụ́ Zifo, onyeisi bụ́ Kinaz, 16  onyeisi bụ́ Kora, onyeisi bụ́ Getam, onyeisi bụ́ Amalek. Ọ bụ ndị a bụ ndị isi Elifaz+ mụrụ n’ala Idọm. Ha bụ ụmụ ndị ikom Eda mụrụ. 17  Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Ruel, nwa Isọ: Onyeisi bụ́ Nehat, onyeisi bụ́ Zira, onyeisi bụ́ Shama, onyeisi bụ́ Miza. Ọ bụ ndị a bụ ndị isi Ruel mụrụ n’ala Idọm.+ Ha bụ ụmụ ndị ikom Basemat, bụ́ nwunye Isọ, mụrụ. 18  N’ikpeazụ, ndị a bụ ụmụ ndị ikom Oholibema, nwunye Isọ: Onyeisi bụ́ Jiọsh, onyeisi bụ́ Jelam, onyeisi bụ́ Kora. Ọ bụ ndị a bụ ndị isi Oholibema, ada Ena, bụ́ nwunye Isọ, mụrụ. 19  Ọ bụ ndị a bụ ụmụ ndị ikom Isọ, ọ bụkwa ndị a bụ ndị isi ha mụrụ. Ọ bụ ya bụ Idọm.+ 20  Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Sia onye Horaịt, bụ́ ndị bi n’ala ahụ:+ Lotan na Shobal na Zibiọn na Ena+ 21  na Daịshọn na Iza na Daịshan.+ Ọ bụ ha bụ ndị isi ndị Horaịt, bụ́ ụmụ Sia, n’ala Idọm. 22  Ụmụ ndị ikom Lotan wee bụrụ Horaị na Himam; nwanne nwaanyị Lotan bụ Timna.+ 23  Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Shobal: Alvan na Manahat na Ibal, Shifo na Onam. 24  Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Zibiọn: Eya na Ena. Ọ bụ Ena a bụ onye hụrụ isi iyi dị ọkụ n’ala ịkpa mgbe ọ na-elekọtara Zibiọn nna ya ịnyịnya ibu.+ 25  Ndị a bụ ụmụ Ena: Daịshọn na Oholibema ada Ena. 26  Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Daịshọn: Hemdan na Eshban na Itran na Kiran.+ 27  Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Iza: Bilhan na Zeavan na Ekan. 28  Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Daịshan: Ọz na Eran.+ 29  Ndị a bụ ndị isi ndị Horaịt: Onyeisi bụ́ Lotan, onyeisi bụ́ Shobal, onyeisi bụ́ Zibiọn, onyeisi bụ́ Ena, 30  onyeisi bụ́ Daịshọn, onyeisi bụ́ Iza, onyeisi bụ́ Daịshan.+ Ọ bụ ndị a bụ ndị isi ndị Horaịt dị ka ndị isi ha nwere n’ala Sia si dị. 31  Ndị a bụ ndị eze chịrị n’ala Idọm+ tupu eze ọ bụla achịwa ụmụ Izrel.+ 32  Bila nwa Biọ wee chịwa n’Idọm,+ aha obodo ya bụ Dinhaba. 33  Mgbe Bila nwụrụ, Jobab nwa Zira onye Bọzra+ malitere ịchị n’ọnọdụ ya.+ 34  Mgbe Jobab nwụrụ, Husham bụ́ onye si n’ala ndị Timan+ malitere ịchị n’ọnọdụ ya.+ 35  Mgbe Husham nwụrụ, Hedad nwa Bidad, bụ́ onye meriri ndị Midian+ n’ala Moab,+ malitere ịchị n’ọnọdụ ya, aha obodo ya bụ Evit.+ 36  Mgbe Hedad nwụrụ, Samla onye Masrika malitere ịchị n’ọnọdụ ya.+ 37  Mgbe Samla nwụrụ, Sheọl onye Rehobọt, nke dị n’akụkụ Osimiri Yufretis, malitere ịchị n’ọnọdụ ya.+ 38  Mgbe Sheọl nwụrụ, Bel-henan nwa Akbọ malitere ịchị n’ọnọdụ ya.+ 39  Mgbe Bel-henan nwa Akbọ nwụrụ, Heda malitere ịchị n’ọnọdụ ya; aha obodo ya bụ Peyu, aha nwunye ya bụ Mehetabel ada Metred bụ́ ada Mizahab.+ 40  Ya mere, ndị a bụ aha ndị isi Isọ mụrụ dị ka ezinụlọ ha si dị, dịkwa ka obodo ha si dị, n’aha n’aha: Onyeisi bụ́ Timna, onyeisi bụ́ Alva, onyeisi bụ́ Jitet,+ 41  onyeisi bụ́ Oholibema, onyeisi bụ́ Ila, onyeisi bụ́ Paịnọn,+ 42  onyeisi bụ́ Kinaz, onyeisi bụ́ Timan, onyeisi bụ́ Mibza,+ 43  onyeisi bụ́ Magdiel, onyeisi bụ́ Aịram. Ọ bụ ndị a bụ ndị isi Idọm+ dị ka ebe ndị ha biri si dị, n’ala ha nwetara. Ọ bụ onye a bụ Isọ, nna ndị Idọm.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji