Jenesis 16:1-16
16 Seraị, nwunye Ebram, amụtaghịrị ya nwa;+ ma o nwere nwaanyị na-ejere ya ozi bụ́ onye Ijipt, aha ya bụ Hega.+
2 Seraị wee sị Ebram: “Lee! Jehova egbochiwo m ịmụ nwa.+ Biko, gị na nwaanyị na-ejere m ozi nwee mmekọahụ. Ma eleghị anya, m ga-enweta ụmụ site n’aka ya.”+ Ebram wee gee ntị n’olu Seraị.+
3 Seraị, nwunye Ebram, wee kpọrọ Hega, nwaanyị na-ejere ya ozi bụ́ onye Ijipt, kpọnye Ebram di ya ka ọ bụrụ nwunye ya,+ mgbe afọ iri Ebram biwere n’ala Kenan gwụchara.
4 Ya na Hega wee nwee mmekọahụ, o wee tụrụ ime. Mgbe ọ matara na ya dị ime, ọ malitere ileda nne ya ukwu anya.+
5 Seraị wee sị Ebram: “Ka ihe ọjọọ e mere m dịrị n’isi gị. Mụ onwe m kpọnyere gị nwaanyị na-ejere m ozi ka ọ dabere n’obi gị, o wee mata na ya adịla ime, o wee malite ileda m anya. Ka Jehova kpee ikpe n’etiti mụ na gị.”+
6 Ebram wee sị Seraị:+ “Lee! Nwaanyị na-ejere gị ozi nọ gị n’aka. Mee ya ihe masịrị gị.”+ Seraị wee malite iweda ya ala nke mere na ọ gbapụrụ n’ụlọ ya.+
7 E mesịa, mmụọ ozi Jehova+ hụrụ ya n’otu isi mmiri nke dị n’ala ịkpa, n’isi mmiri nke dị n’ụzọ gara Shọọ.+
8 O wee malite ịsị: “Hega, nwaanyị na-ejere Seraị ozi, olee ebe i si bịa, ebeekwa ka ị na-aga?” O wee zaa, sị: “Ọ bụ n’ụlọ Seraị nne m ukwu ka m si gbapụ.”
9 Mmụọ ozi Jehova wee gaa n’ihu ịsị ya: “Laghachikwuru nne gị ukwu, wedakwa onwe gị ala n’okpuru ya.”+
10 Mmụọ ozi Jehova wee sị ya: “M ga-eme ka mkpụrụ gị mụbaa nke ukwuu,+ nke na a gaghị agụta ya ọnụ n’ihi otú ọ ga-esi dị ọtụtụ.”+
11 Mmụọ ozi Jehova gwakwara ya, sị: “Lee, ị dị ime, ị ga-amụkwa nwa nwoke, ị ga-agụkwa ya Ishmel;+ n’ihi na ahụ́ a na-emekpa gị eruwo Jehova ntị.+
12 Ma ya onwe ya ga-aghọ nwoke nke dị ka ịnyịnya ọhịa. Aka ya ga-emegide onye ọ bụla, aka onye ọ bụla ga-emegidekwa ya;+ ọ ga-ebikwa n’ụlọikwuu n’ihu ụmụnne ya niile.”+
13 O wee malite ịkpọ aha Jehova, bụ́ onye nọ na-agwa ya okwu, sị: “Ị bụ Chineke nke na-ahụ ụzọ,”+ n’ihi na nwaanyị ahụ sịrị: “M̀ hụwo onye ahụ nke na-ahụ m?”
14 Ọ bụ ya mere e ji kpọọ olulu mmiri ahụ Bia-lehaị-rọị.+ Lee, ọ dị n’agbata Kedesh na Bired.
15 E mesịa, Hega mụụrụ Ebram nwa nwoke, Ebram wee gụọ nwa ya nwoke, nke Hega mụrụ, Ishmel.+
16 Ebram gbara afọ iri asatọ na isii mgbe Hega mụụrụ Ebram Ishmel.