Levitikọs 13:1-59

13  Jehova wee gwa Mozis na Erọn, sị:  “Ọ bụrụ na mmadụ enwee ọkọ ma ọ bụ akpụkpa ma ọ bụ ntụpọ+ n’akpụkpọ ahụ́ ya, o wee ghọọ ọnyá ekpenta+ n’akpụkpọ ahụ́ ya, a ga-akpọrọ ya gakwuru Erọn bụ́ onye nchụàjà ma ọ bụ otu n’ime ụmụ ya bụ́ ndị nchụàjà.+  Onye nchụàjà ga-ele ọnyá ahụ dị n’akpụkpọ ahụ́ onye ahụ anya.+ Ọ bụrụ na ajị nke dị n’ọnyá ahụ na-achazi ọcha, ọ bụrụkwa na otú ọnyá ahụ dị n’anya gosiri na ọ bara ime n’akpụkpọ ahụ́ ya, ọ bụ ọnyá ekpenta. Onye nchụàjà ga-ele ya anya, ọ ga-ekwupụtakwa na ọ bụ onye na-adịghị ọcha.  Ma ọ bụrụ na ntụpọ ahụ na-acha ọcha n’akpụkpọ ahụ́ ya, ọ bụrụkwa na otú ọ dị n’anya gosiri na ọ baghị ime n’akpụkpọ ahụ́ ya, ọ bụrụkwa na ajị nke dị na ya achawabeghị ọcha, onye nchụàjà ga-akpọpụ onye ahụ nwere ọnyá iche+ ruo ụbọchị asaa.  Onye nchụàjà ga-ele ya anya n’ahụ́ n’ụbọchị nke asaa, ọ bụrụ na otú ọnyá ahụ dị n’anya na ọ kwụsịwo, ọnyá ahụ agbasaghịkwa n’akpụkpọ ahụ́ ya, onye nchụàjà ga-akpọpụkwa ya iche+ ruo ụbọchị asaa ọzọ.  “Onye nchụàjà ga-ele ya anya n’ahụ́ nke ugboro abụọ n’ụbọchị nke asaa, ọ bụrụ na ọnyá ahụ afịkpọọla, ọ bụrụkwa na ọnyá ahụ agbasaghị n’akpụkpọ ahụ́ ya, onye nchụàjà ga-ekwupụta na onye ahụ dị ọcha. Ọ bụ akpụkpa. Ọ ga-asụ uwe ya wee dị ọcha.  Ọ bụrụ na akpụkpa ahụ agbasawo n’akpụkpọ ahụ́ ya mgbe o gosichara onye nchụàjà onwe ya ka o wee kwupụta na ọ dị ọcha, ọ ga-abịa gosi onye nchụàjà onwe ya nke ugboro abụọ,+  onye nchụàjà ga-ele ya anya n’ahụ́; ọ bụrụ na akpụkpa ahụ agbasawo n’akpụkpọ ahụ́ ya, mgbe ahụ onye nchụàjà ga-ekwupụta na ọ bụ onye na-adịghị ọcha. Ọ bụ ekpenta.+  “Ọ bụrụ na ọnyá ekpenta apụta mmadụ n’ahụ́, a ga-akpọrọ ya kpọgara onye nchụàjà. 10  Onye nchụàjà ga-ele ya anya n’ahụ́;+ ọ bụrụ na ọkọ ọcha ghara ya n’akpụkpọ ahụ́, ọ bụrụkwa na o mewo ka ajị ya chawazie ọcha, ọnyá ọhụrụ+ apụtakwa n’ọkọ ahụ, 11  ihe pụtara ya n’akpụkpọ ahụ bụ ekpenta na-adịghị ala ala;+ onye nchụàjà ga-ekwupụtakwa na ọ bụ onye na-adịghị ọcha. Ọ dịghị mkpa ka ọ kpọpụ ya iche,+ n’ihi na ọ dịghị ọcha. 12  Ọ bụrụ na ekpenta ahụ apụta n’akpụkpọ ahụ́ ya, ọ bụrụkwa na ekpenta ahụ ekpuchie akpụkpọ ahụ́ dum nke onye ahụ nwere ọnyá, malite n’isi ya ruo n’ụkwụ ya, onye nchụàjà ahụ ahụkwa ya; 13  ọ bụrụkwa na onye nchụàjà elewo ya anya n’ahụ́, ma, lee, ekpenta ahụ kpuchiri ahụ́ ya dum, ọ ga-ekwupụta na onye ahụ nwere ọnyá bụ onye dị ọcha. Ha niile na-achazi ọcha. Onye ahụ dị ọcha. 14  Ma n’ụbọchị ọnyá ọhụrụ pụtara, ọ ga-abụ onye na-adịghị ọcha. 15  Onye nchụàjà+ ga-ahụ ọnyá ọhụrụ ahụ, ọ ga-ekwupụta na ọ bụ onye na-adịghị ọcha. Ọnyá ọhụrụ ahụ adịghị ọcha. Ọ bụ ekpenta.+ 16  Ma ọ bụ, ọ bụrụ na ọnyá ọhụrụ ahụ agbanwee ọzọ wee chawa ọcha, ọ ga-agakwuru onye nchụàjà. 17  Onye nchụàjà ga-ele ya anya n’ahụ́,+ ọ bụrụ na ọnyá ahụ agbanwewo chawa ọcha, onye nchụàjà ga-ekwupụta na onye ahụ nwere ọnyá ahụ bụ onye dị ọcha. Onye ahụ dị ọcha. 18  “Ma ọ bụrụ na etuto+ etoo mmadụ n’akpụkpọ ahụ́ wee laa, 19  ma ọkọ ọcha ma ọ bụ ntụpọ ọcha nke chatatụwara ọbara ọbara apụta n’ebe ahụ etuto ahụ toburu ya, ọ ga-egosi onye nchụàjà onwe ya. 20  Onye nchụàjà ga-ele ya anya n’ahụ́,+ ọ bụrụkwa na otú ọ dị n’anya gosiri na ọ bara ime n’akpụkpọ ahụ́ ya, ọ bụrụkwa na ajị nke dị na ya na-achazi ọcha, onye nchụàjà ga-ekwupụta na ọ bụ onye na-adịghị ọcha. Ọ bụ ọnyá ekpenta. Ọ pụtawo n’etuto ahụ. 21  Ma ọ bụrụ na onye nchụàjà elee ya anya n’ahụ́, ma, lee, ọ dịghị ajị na-acha ọcha dị na ya, ọ baghịkwa ime n’akpụkpọ ahụ́ ya, ọ fịkpọwokwa, onye nchụàjà ga-akpọpụ ya iche+ ruo ụbọchị asaa. 22  Ọ bụrụ na ọ gbasaa n’akpụkpọ ahụ́ ya, onye nchụàjà ga-ekwupụta na ọ bụ onye na-adịghị ọcha. Ọ bụ ọnyá. 23  Ma ọ bụrụ na ntụpọ apụta n’ebe ahụ, ọ gbasaghịkwa agbasa, ọ bụ etuto ahụ mere ka ebe ahụ zaa aza;+ onye nchụàjà ga-ekwupụtakwa na ọ dị ọcha.+ 24  “Ma ọ bụ, ọ bụrụ na ọkụ emee ka mmadụ nwee apa n’akpụkpọ ahụ́ ya, ọnyá ọhụrụ nke dị n’apa ahụ ewee nwee ntụpọ chatatụwara ọbara ọbara ma ọ bụ nke na-acha ọcha, 25  onye nchụàjà ga-ele ya anya n’ahụ́; ọ bụrụ na ajị nke dị ná ntụpọ ahụ na-achazi ọcha, ọ bụrụkwa na otú ọ dị n’anya gosiri na ọ bara ime n’akpụkpọ ahụ́, ọ bụ ekpenta. Ọ pụtawo n’apa ahụ, onye nchụàjà ga-ekwupụta na ọ bụ onye na-adịghị ọcha. Ọ bụ ọnyá ekpenta. 26  Ma ọ bụrụ na onye nchụàjà elee ya anya n’ahụ́, ma, lee, ajị ọcha adịghị ná ntụpọ ahụ, ọ baghịkwa ime n’akpụkpọ ahụ́ ya, ọ fịkpọkwara afịkpọ, onye nchụàjà ga-akpọpụ ya iche ruo ụbọchị asaa. 27  Onye nchụàjà ga-ele ya anya n’ahụ́ n’ụbọchị nke asaa. Ọ bụrụ na ọ gbasaa n’akpụkpọ ahụ́ ya, onye nchụàjà ga-ekwupụta na onye ahụ adịghị ọcha. Ọ bụ ọnyá ekpenta. 28  Ma ọ bụrụ na ntụpọ apụta n’ebe ahụ, ọ gbasaghịkwa n’akpụkpọ ahụ́ ya, ọ fịkpọkwara afịkpọ, ọ bụ apa ahụ mere ka ebe ahụ koo eko; onye nchụàjà ga-ekwupụta na onye ahụ dị ọcha, n’ihi na ọ bụ apa ahụ mere ka ebe ahụ zaa aza. 29  “Ma ọ bụrụ na nwoke ma ọ bụ nwaanyị enwee ọnyá n’isi ma ọ bụ n’agba, 30  onye nchụàjà+ ga-ahụ ọnyá ahụ; ọ bụrụ na otú ọ dị n’anya gosiri na ọ bara ime n’akpụkpọ ahụ́ ya, ntutu dị na ya ewee na-acha odo odo, dịrịkwa ole na ole, onye nchụàjà ga-ekwupụta na onye ahụ adịghị ọcha. Ọ bụ ọrịa ntutu ịdapụsị adapụsị.+ Ọ bụ ekpenta isi ma ọ bụ ekpenta agba. 31  Ma ọ bụrụ na onye nchụàjà elee ebe ahụ ntutu dapụsịrị anya, ma, lee! otú ọ dị n’anya gosiri na ọ baghị ime n’akpụkpọ ahụ́ ya, ntutu ojii adịghịkwa na ya, onye nchụàjà ga-akpọpụ onye ahụ nwere ọrịa ntutu ịdapụsị adapụsị iche+ ruo ụbọchị asaa.+ 32  Onye nchụàjà ga-ele ebe ahụ anya n’ụbọchị nke asaa; ọ bụrụ na ọrịa ahụ nke ntutu ịdapụsị adapụsị agbasaghị, ntutu na-acha odo odo apụtaghịkwa na ya, ọ bụrụkwa na otú ọ dị n’anya gosiri na ọrịa ntutu ịdapụsị adapụsị+ ahụ abaghị ime n’akpụkpọ ahụ́ ya, 33  a ga-akpụ ya isi, ma a gaghị akpụ ebe ahụ ntutu na-adapụsị;+ onye nchụàjà ga-akpọpụ onye ahụ nwere ọrịa ntutu ịdapụsị adapụsị iche ruo ụbọchị asaa ọzọ. 34  “Onye nchụàjà ga-ele ebe ahụ ntutu dapụsịrị anya n’ụbọchị nke asaa; ọ bụrụ na ọrịa ntutu ịdapụsị adapụsị ahụ agbasaghị n’akpụkpọ ahụ́ ya, ọ bụrụkwa na otú ọ dị n’anya gosiri na ọ baghị ime n’akpụkpọ ahụ́ ya, onye nchụàjà ga-ekwupụta na onye ahụ dị ọcha,+ ọ ga-asụkwa uwe ya wee dị ọcha. 35  Ma ọ bụrụ na ọrịa ntutu ịdapụsị adapụsị ahụ agbasaa n’akpụkpọ ahụ́ ya mgbe e kwupụtasịrị na ọ dị ọcha, 36  onye nchụàjà+ ga-ele ya ahụ́; ọ bụrụ na ọrịa ntutu ịdapụsị adapụsị ahụ agbasawo n’akpụkpọ ahụ́ ya, ọ dịghị mkpa ka onye nchụàjà nyochawa ma ọ̀ ga-ahụ ntutu na-acha odo odo; ọ bụ onye na-adịghị ọcha. 37  Ma ọ bụrụ na otú ọ dị n’anya na ọrịa ntutu ịdapụsị adapụsị ahụ agbasaghị, ọ bụrụkwa na ntutu ojii etowo na ya, ọrịa ntutu ịdapụsị adapụsị ahụ alawo. Onye ahụ dị ọcha, onye nchụàjà ga-ekwupụtakwa na ọ dị ọcha.+ 38  “Ma ọ bụrụ na nwoke ma ọ bụ nwaanyị enwee ntụpọ+ n’akpụkpọ ahụ́ ya, ntụpọ ọcha, 39  onye nchụàjà+ ga-ele ya anya n’ahụ́; ọ bụrụ na ntụpọ ndị pụtara ya n’akpụkpọ ahụ́ adịghị ezigbo ọcha, ọ bụ ọkọ nkịtị. Ọ pụtawo n’akpụkpọ ahụ́. Onye ahụ dị ọcha. 40  “Ma ọ bụrụ na ntutu adapụsịa nwoke n’isi,+ ọ bụ isi nkwọcha. Onye ahụ dị ọcha. 41  Ọ bụrụ na isi ya akwọchaa n’ebe ihu, ọ bụ isi nkwọcha n’ihu isi ya. Onye ahụ dị ọcha. 42  Ma ọ bụrụ na ntụpọ chatatụwara ọbara ọbara apụta n’isi nkwọcha ahụ, n’opu isi ya ma ọ bụ n’ihu isi ya, ọ bụ ekpenta nke pụtara n’isi nkwọcha ya, n’opu isi ya ma ọ bụ n’ihu isi ya. 43  Onye nchụàjà+ ga-ele ya anya n’ahụ́; ọ bụrụ na ntụpọ chatatụwara ọbara ọbara pụtara n’isi nkwọcha ya, n’opu isi ya ma ọ bụ n’ihu isi ya, dị ka ekpenta nke na-apụta n’akpụkpọ ahụ́, 44  ọ bụ onye ekpenta. Ọ bụ onye na-adịghị ọcha. Onye nchụàjà ga-ekwupụta na ọ bụ onye na-adịghị ọcha. Ọrịa ya mere ya n’isi. 45  Ma onye ekpenta ahụ nke nwere ọnyá ahụ, a ga-adọwa uwe ya,+ ọ gaghịkwa edozi isi ya edozi,+ ma ọ ga-ekpuchi afụ ọnụ* ya+ wee na-eti, sị, ‘Adịghị m ọcha, adịghị m ọcha!’+ 46  Ọ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ụbọchị niile o nwere ọrịa ahụ. Ọ bụ onye na-adịghị ọcha. Ọ ga-ebipụ iche. Ná mpụga ebe ha mara ụlọikwuu+ ka ọ ga-ebi. 47  “Ma ọ bụrụ na ntụpọ yiri ekpenta apụta n’uwe, ma ọ̀ bụ uwe e ji ajị anụ kpaa ma ọ bụ uwe ákwà linin, 48  ma ọ bụ n’owu ndị gara ogologo ogologo+ ma ọ bụ n’owu ndị gara uhiè uhiè, ma ọ bụ n’akpụkpọ anụ ma ọ bụ n’ihe ọ bụla e ji akpụkpọ anụ mee,+ 49  ọ bụrụkwa na ntụpọ ahụ nke na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ ma ọ bụ ọbara ọbara apụta n’uwe ma ọ bụ n’akpụkpọ anụ ma ọ bụ n’owu ndị gara ogologo ogologo ma ọ bụ n’owu ndị gara uhiè uhiè ma ọ bụ n’ihe ọ bụla e ji akpụkpọ anụ mee, ọ bụ ekpenta, a ga-egosi ya onye nchụàjà. 50  Onye nchụàjà+ ga-ahụ ntụpọ ahụ, ọ ga-edebekwa ihe ahụ ọ pụtara na ya iche+ ruo ụbọchị asaa. 51  Mgbe o lere ntụpọ ahụ anya n’ụbọchị nke asaa wee hụ na ntụpọ ahụ agbasawo n’uwe ahụ ma ọ bụ n’owu ndị gara ogologo ogologo ma ọ bụ n’owu ndị gara uhiè uhiè+ ma ọ bụ n’akpụkpọ anụ a pụrụ iji mee ụdị ihe ọ bụla e ji akpụkpọ anụ eme, ntụpọ ahụ bụ ajọ ekpenta.+ Ọ bụ ihe na-adịghị ọcha. 52  Ọ ga-akpọ uwe ahụ ọkụ ma ọ bụ owu ndị gara ogologo ogologo ma ọ bụ owu ndị gara uhiè uhiè n’ákwà ahụ e ji ajị anụ mee ma ọ bụ n’ákwà linin,+ ma ọ bụ n’ihe ọ bụla e ji akpụkpọ anụ mee nke ntụpọ ahụ pụtara na ya, n’ihi na ọ bụ ajọ+ ekpenta. A ga-akpọ ya ọkụ. 53  “Ma ọ bụrụ na onye nchụàjà elee ya anya, ma, lee, ntụpọ ahụ agbasaghị n’uwe ahụ ma ọ bụ n’owu ndị gara ogologo ogologo ma ọ bụ n’owu ndị gara uhiè uhiè ma ọ bụ n’ihe ọ bụla e ji akpụkpọ anụ mee,+ 54  onye nchụàjà ga-enye iwu ka a saa ihe ahụ ntụpọ dị na ya, ọ ga-edebekwa ya iche ruo ụbọchị asaa ọzọ. 55  Onye nchụàjà ga-ele ntụpọ ahụ anya mgbe a sasịworo ya, ọ bụrụ na ntụpọ ahụ agbanweghị ọdịdị ya, ọ gbasaghịkwa, ọ dịghị ọcha. Ị ga-akpọ ya ọkụ. O siwo n’elu ma ọ bụ n’okpuru rie ákwà ahụ. 56  Ma ọ bụrụ na onye nchụàjà elee ya anya, ma, lee, ntụpọ ahụ adịghị ezigbo ọcha mgbe a sasịworo ya, ọ ga-adọkapụ ya n’uwe ahụ ma ọ bụ n’akpụkpọ anụ ahụ ma ọ bụ n’owu ndị ahụ gara ogologo ogologo ma ọ bụ n’owu ndị gara uhiè uhiè. 57  Otú ọ dị, ọ bụrụ na ọ ka dị n’uwe ahụ ma ọ bụ n’owu ndị ahụ gara ogologo ogologo ma ọ bụ n’owu ndị gara uhiè uhiè+ ma ọ bụ n’ihe ọ bụla e ji akpụkpọ anụ mee, ọ ka na-apụta apụta. Ị ga-akpọ ihe ọ bụla ntụpọ ahụ dị na ya ọkụ.+ 58  Ma uwe ma ọ bụ owu ndị gara ogologo ogologo ma ọ bụ owu ndị gara uhiè uhiè ma ọ bụ ihe ọ bụla e ji akpụkpọ anụ mee nke ị sara, ọ bụrụ na ntụpọ ahụ apụọ na ha, a ga-asa ya nke ugboro abụọ; ọ ga-adịkwa ọcha. 59  “Nke a bụ iwu banyere ntụpọ yiri ekpenta nke pụtara n’uwe e ji ajị anụ mee ma ọ bụ n’ákwà linin,+ ma ọ bụ n’owu ndị gara ogologo ogologo ma ọ bụ n’owu ndị gara uhiè uhiè, ma ọ bụ n’ihe ọ bụla e ji akpụkpọ anụ mee, iji kwupụta na ọ dị ọcha ma ọ bụ iji kwupụta na ọ dịghị ọcha.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ya bụ, aji dị n’elu egbugbere ọnụ.