Jọn 3:1-36

3  E nwere otu nwoke n’ime ndị Farisii, aha ya bụ Nikọdimọs.+ Ọ bụ otu n’ime ndị na-achị ndị Juu.  Onye a bịakwutere ya n’abalị,+ sị ya: “Rabaị,+ anyị maara na ị bụ onye ozizi+ nke si n’ebe Chineke nọ bịa;+ n’ihi na ọ dịghị onye pụrụ ime ihe ịrịba ama ndị a+ ị na-eme ma ọ bụrụ na Chineke anọnyereghị ya.”+  Jizọs zara ya, sị:+ “N’ezie, n’ezie, ana m asị gị, Ọ bụrụ na a mụghị mmadụ ọzọ,+ ọ pụghị ịhụ alaeze Chineke.”+  Nikọdimọs sịrị ya: “Olee otú a pụrụ isi mụọ mmadụ mgbe o mere agadi? Ọ̀ pụrụ ịbanye n’afọ nne ya nke ugboro abụọ ka a mụọ ya?”  Jizọs zara, sị: “N’ezie, n’ezie, ana m asị gị, Ọ bụrụ na a mụghị mmadụ site na mmiri+ na mmụọ nsọ,+ ọ pụghị ịbanye n’alaeze Chineke.  Ihe a mụrụ site n’anụ ahụ́ bụ anụ ahụ́, ihe a mụkwara site na mmụọ nsọ bụ mmụọ.+  Ya ejula gị anya na m sịrị gị, A ghaghị ịmụ unu ọzọ.+  Ifufe+ na-efega n’ebe ọ chọrọ, ị na-anụkwa ụda ya, ma ị dịghị ama ebe o si abịa na ebe ọ na-eje. Otú a ka ọ dị onye ọ bụla a mụrụ site na mmụọ nsọ.”+  Nikọdimọs wee sị ya: “Olee otú ihe ndị a pụrụ isi mee?” 10  Jizọs zara ya, sị: “Ị̀ bụ onye nkụzi n’Izrel ma ị maghị ihe ndị a?+ 11  N’ezie, n’ezie, ana m asị gị, Ihe anyị maara ka anyị na-ekwu, ihe anyị hụkwara ka anyị na-agba àmà ya,+ ma unu adịghị anabata àmà anyị na-agba.+ 12  Ọ bụrụ na m gwara unu ihe nke ụwa ma unu ekwetaghị, olee otú unu ga-esi kwere ma ọ bụrụ na mụ agwa unu ihe nke eluigwe?+ 13  Ọ dịghịkwa onye ọ bụla rịgowooro n’eluigwe +ma e wezụga onye ahụ nke si n’eluigwe rịdata,+ bụ́ Nwa nke mmadụ.+ 14  Dịkwa nnọọ ka Mozis weliri agwọ+ elu n’ala ịkpa, otú ahụ ka a na-aghaghị iweli Nwa nke mmadụ elu,+ 15  ka onye ọ bụla nke kwere na ya wee nwee ndụ ebighị ebi.+ 16  “N’ihi na Chineke hụrụ ụwa n’anya+ nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya,+ ka e wee ghara ibibi+ onye ọ bụla nke nwere okwukwe+ na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.+ 17  N’ihi na Chineke zitere Ọkpara ya n’ụwa, ọ bụghị ka o kpee ụwa ikpe,+ kama ka e wee site n’aka ya zọpụta ụwa.+ 18  A gaghị ekpe onye nwere okwukwe na ya ikpe.+ E kpeworị onye na-enweghị okwukwe ikpe, n’ihi na o nweghị okwukwe n’aha Ọkpara Chineke mụrụ naanị ya.+ 19  Nke a bụ ihe a ga-eji kpee ikpe, na ìhè+ ahụ abịawo n’ụwa+ ma ụmụ mmadụ hụrụ ọchịchịrị n’anya kama ìhè,+ n’ihi na ọrụ ha dị njọ. 20  N’ihi na onye na-eme ihe ọjọọ+ kpọrọ ìhè ahụ asị, ọ dịghịkwa abịa n’ìhè ahụ, ka e wee ghara ịkatọ ọrụ ya.+ 21  Ma onye na-eme ezi ihe na-abịa n’ìhè ahụ,+ ka e wee mee ka ọrụ ya pụta ìhè na a rụrụ ha dị ka uche Chineke si dị.” 22  Mgbe ihe ndị a gasịrị, Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya banyere n’obodo Judia, ya na ha nọtụrụ n’ebe ahụ, o mekwara ndị mmadụ baptizim.+ 23  Ma Jọn+ nọkwa na-eme baptizim n’Inọn nke dị Selim nso, n’ihi na e nwere mmiri buru ibu+ n’ebe ahụ, ndị mmadụ nọkwa na-abịa, a na-eme ha baptizim;+ 24  n’ihi na a tụbabeghị Jọn n’ụlọ mkpọrọ.+ 25  Ya mere, arụmụka bilitere n’etiti ndị na-eso ụzọ Jọn na otu onye Juu banyere ịdị ọcha.+ 26  N’ihi ya, ha bịakwutere Jọn wee sị ya: “Rabaị, nwoke ahụ gị na ya nọ n’ofe Jọdan, onye ị gbara àmà banyere ya,+ lee, ọ na-eme baptizim, mmadụ niile na-agakwurukwa ya.”+ 27  Jọn wee sị ha: “Mmadụ apụghị inweta otu mkpụrụ ihe ma ọ bụrụ na e sighị n’eluigwe nye ya onye ahụ.+ 28  Unu onwe unu ga-agbara m akaebe na m sịrị, Abụghị m Kraịst,+ kama, e zitere m ka m buru ya ụzọ bịa.+ 29  Onye nwe nwaanyị a na-alụ ọhụrụ bụ nwoke na-alụ ya.+ Otú ọ dị, mgbe enyi nke nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ guzo ọtọ wee nụ olu ya, ọ na-enwe oké ọṅụ n’ihi olu nwoke ahụ nke na-alụ nwaanyị ọhụrụ. Ya mere, e mewo ka ọṅụ a m nwere zuo ezu.+ 30  Onye ahụ ga na-eto eto, ma mụ onwe m ga na-atalata atalata.” 31  Onye ahụ nke si n’elu bịa ka ndị ọzọ niile.+ Onye ahụ nke si n’ụwa sitere n’ụwa, ọ na-ekwukwa banyere ihe nke ụwa.+ Onye ahụ nke si n’eluigwe bịa ka ndị ọzọ niile.+ 32  Ọ bụ ihe ọ hụrụ na ihe ọ nụrụ ka ọ na-agba àmà ya,+ ma ọ dịghị onye na-anabata àmà ya.+ 33  Onye nabatara àmà ya akanyewo akara ya na nke a na Chineke bụ onye eziokwu.+ 34  N’ihi na onye ahụ Chineke zitere na-ekwu ihe Chineke kwuru,+ n’ihi na ọ dịghị atụ̀ mmụọ nsọ ọ na-enye atụ̀.+ 35  Nna m hụrụ Ọkpara ya n’anya,+ o nyefewokwa ihe niile n’aka ya.+ 36  Onye nwere okwukwe+ n’Ọkpara ahụ nwere ndụ ebighị ebi;+ onye na-enupụrụ Ọkpara ahụ isi agaghị ahụ ndụ,+ kama ọnụma Chineke na-adịgide n’ahụ́ ya.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji