Jọn 12:1-50

12  Ya mere, mgbe ọ fọrọ ụbọchị isii ka ememme ngabiga malite, Jizọs bịarutere Betani,+ bụ́ ebe Lazarọs+ onye Jizọs si ná ndị nwụrụ anwụ kpọlite nọ.  Ya mere, ha meere ya oriri anyasị n’ebe ahụ, Mata+ nọkwa na-eje ozi,+ ma Lazarọs bụ otu n’ime ndị ya na ha nọ na-eri ihe na tebụl.+  Meri wee were mmanụ na-esi ísì ụtọ nke dị otu paụnd n’ịdị arọ, bụ́ ezigbo mmanụ nad,+ nke dị nnọọ oké ọnụ, tee n’ụkwụ Jizọs ma jiri ntutu isi ya hichaa ya ụkwụ.+ Ísì mmanụ ahụ nke na-esi ísì ụtọ wee jupụta ụlọ ahụ.  Ma Judas Iskarịọt,+ otu n’ime ndị na-eso ụzọ ya, bụ́ onye na-aga ịrara ya nye, sịrị:  “Gịnị mere na e reghị mmanụ a na-esi ísì ụtọ+ narị mkpụrụ ego dinarịọs atọ ma nye ya ndị ogbenye?”+  Otú ọ dị, ihe mere o ji kwuo ihe a abụghị n’ihi na ihe banyere ndị ogbenye na-emetụ ya n’obi, kama ọ bụ n’ihi na ọ bụ onye ohi,+ ọ bụkwa ya na-eji igbe ego,+ ọ na-ewerekwa ego e tinyere na ya.  Ya mere, Jizọs sịrị: “Hapụnụ ya, ka o mee ihe a maka ụbọchị olili m.+  N’ihi na unu na ndị ogbenye+ nọ mgbe niile, ma mụ na unu agaghị anọ mgbe niile.”  Ya mere, oké ìgwè mmadụ bụ́ ndị Juu matara na ọ nọ n’ebe ahụ, ha wee bịa, ọ bụghị n’ihi naanị Jizọs, kamakwa ka ha hụ Lazarọs, onye o si ná ndị nwụrụ anwụ kpọlite.+ 10  Ndị isi nchụàjà wee gbaa izu igbukwa Lazarọs,+ 11  n’ihi na ọ bụ maka ya ka ọtụtụ n’ime ndị Juu ji na-aga n’ebe ahụ ma na-enwe okwukwe n’ebe Jizọs nọ.+ 12  N’echi ya, mgbe oké ìgwè mmadụ ndị bịara ememme ahụ nụrụ na Jizọs na-abịa Jeruselem, 13  ha chịịrị igu nkwụ+ gaa izute ya. Ha wee malite iti mkpu,+ sị: “Biko, zọpụta ya!+ Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ nke na-abịa n’aha Jehova bụ,+ bụ́ eze+ Izrel!” 14  Ma mgbe Jizọs hụrụ otu nwa ịnyịnya ibu,+ ọ nọkwasịrị na ya, dị nnọọ ka e dere, sị: 15  “Atụla egwu, ada bụ́ Zayọn. Lee! Eze gị na-abịa,+ ọ nọkwasịrị na nwa ịnyịnya ibu.”+ 16  Ndị na-eso ụzọ ya aghọtaghị ihe ndị a na mbụ,+ ma mgbe e mere ka Jizọs dị ebube,+ ha chetara na e dere ihe ndị a banyere ya, chetakwa na ha meere ya ihe ndị a.+ 17  Ya mere, ìgwè mmadụ ahụ ndị nọ mgbe ọ kpọpụtara Lazarọs+ n’ili ncheta ma si ná ndị nwụrụ anwụ kpọlite ya nọ na-agba akaebe.+ 18  N’ihi ya, ìgwè mmadụ ahụ zutekwara ya, n’ihi na ha nụrụ na o mewo ihe ịrịba ama a.+ 19  Ya mere, ndị Farisii+ kwuru n’etiti onwe ha, sị: “Unu ahụla na ọ dịghị ebe unu ji azụ aga. Lee! Ụwa dum esorola ya.”+ 20  Ma e nwere ụfọdụ ndị Grik+ so n’etiti ndị ahụ bịara ife ofufe n’ememme ahụ. 21  Ya mere, ha bịakwutere Filip+ onye Betseida nke Galili, ha wee malite ịrịọ ya, sị: “Nna anyị ukwu, anyị chọrọ ịhụ Jizọs.”+ 22  Filip bịara kọọrọ Andru. Andru na Filip wee bịa kọọrọ Jizọs. 23  Ma Jizọs zara ha, sị: “Oge awa eruwo ka e mee ka Nwa nke mmadụ dị ebube.+ 24  N’ezie, n’ezie, ana m asị unu, Ọ bụrụ na otu mkpụrụ ọka wit adaghị n’ala wee nwụọ, ọ na-abụ otu mkpụrụ ọka; ma ọ bụrụ na ọ nwụọ,+ ọ na-amị ọtụtụ mkpụrụ. 25  Onye hụrụ mkpụrụ obi ya n’anya na-ebibi ya,+ ma onye kpọrọ mkpụrụ obi ya asị n’ụwa a ga-echebe ya maka ndụ ebighị ebi.+ 26  Ọ bụrụ na onye ọ bụla ga-ejere m ozi, ya sowe m, ebe m nọ ka onye ozi m ga-anọkwa.+ Ọ bụrụ na onye ọ bụla ga-ejere m ozi, Nna m ga-eme ka o nwee ùgwù.+ 27  Ọ dị ihe na-echegbu mkpụrụ obi m ugbu a,+ gịnịkwa ka m ga-ekwu? Nna, zọpụta m n’oge awa a.+ Otú o sina dị, ọ bụ nke a mere m ji bịaruo n’oge awa a. 28  Nna, mee ka aha gị dị ebube.” Ya mere, otu olu+ si n’eluigwe kwuo, sị: “Emewo m ka ọ dị ebube, m ga-emekwa ka ọ dị ebube ọzọ.”+ 29  N’ihi ya, ìgwè mmadụ ndị guzo nso n’ebe ahụ, ndị nụkwara ya, malitere ikwu na ọ bụ égbè eluigwe gbara. Ndị ọzọ malitere ịsị: “Mmụọ ozi agwawo ya okwu.” 30  Jizọs zara, sị: “Olu a kwuru okwu abụghị n’ihi m, kama ọ bụ n’ihi unu.+ 31  A na-ekpe ụwa a ikpe ugbu a; ugbu a, a ga-achụpụ+ onye na-achị ụwa a.+ 32  Ma mụ onwe m, ọ bụrụ na e si n’ụwa welie m,+ m ga-adọta ụdị mmadụ niile n’ebe m nọ.”+ 33  Ọ nọ na-ekwu ihe a n’ezie iji gosi ụdị ọnwụ ọ na-aga ịnwụ.+ 34  Ya mere, ìgwè mmadụ ahụ zara ya, sị: “Anyị nụrụ n’ime Iwu ahụ na Kraịst ga-anọgide ruo mgbe ebighị ebi;+ oleekwanụ otú i si na-asị na a ghaghị iweli Nwa nke mmadụ elu?+ Ònye ka Nwa nke mmadụ a bụ?”+ 35  Jizọs wee sị ha: “Ìhè ahụ ga-anọtụkwu nwa oge n’etiti unu. Na-ejegharịnụ mgbe unu nwere ìhè ahụ, ka ọchịchịrị+ wee ghara ikpuchi unu; onye na-ejegharị n’ọchịchịrị adịghịkwa ama ebe ọ na-aga.+ 36  Mgbe unu ka nwere ìhè ahụ, nweenụ okwukwe n’ìhè ahụ, ka unu wee bụrụ ụmụ nke ìhè.”+ Jizọs kwuru ihe ndị a wee gaa zoo ka ha ghara ịhụ ya. 37  N’agbanyeghị na o mere ọtụtụ ihe ịrịba ama n’ihu ha, ha enweghị okwukwe n’ebe ọ nọ, 38  nke mere na e mezuru ihe Aịzaya onye amụma kwuru, sị: “Jehova, ònye nwere okwukwe n’ihe anyị nụrụ?+ Ònyekwa ka e kpugheere ogwe aka Jehova?”+ 39  Ihe mere na ha enweghị ike ikwere bụ na Aịzaya kwukwara, sị: 40  “O mewo ka anya ha kpuo ìsì, o mewokwa ka obi ha kpọọ nkụ,+ ka ha wee ghara iji anya ha hụ ụzọ, gharakwa iji obi ha ghọta ihe ma chigharịa, ka m wee gwọọ ha.”+ 41  Aịzaya kwuru ihe ndị a n’ihi na ọ hụrụ ebube ya,+ o wee kwuo banyere ya. 42  Otú ọ dị, ọbụna n’etiti ndị na-achị achị, ọtụtụ ndị nwere okwukwe n’ezie n’ebe ọ nọ,+ ma n’ihi ndị Farisii, ha adịghị ekwupụta ya, ka e wee ghara ịchụpụ ha n’ụlọ nzukọ;+ 43  n’ihi na ha hụrụ otuto mmadụ n’anya karịa ọbụna otuto Chineke.+ 44  Otú ọ dị, Jizọs kwuru n’olu dara ụda, sị: “Onye nwere okwukwe n’ebe m nọ nwere okwukwe, ọ bụghị naanị n’ebe m nọ, kamakwa n’ebe onye zitere m nọ;+ 45  onye na-ahụ m na-ahụkwa onye zitere m.+ 46  Abịawo m dị ka ìhè n’ime ụwa,+ ka onye ọ bụla nke nwere okwukwe n’ebe m nọ wee ghara ịnọgide n’ọchịchịrị.+ 47  Ma ọ bụrụ na onye ọ bụla anụ okwu m ma ọ dịghị edebe ya, adịghị m ekpe ya ikpe;+ n’ihi na abịara m, ọ bụghị ikpe ụwa ikpe, kama ịzọpụta ụwa.+ 48  Onye na-eleda m anya, nke na-adịghịkwa anabata ihe m na-ekwu, nwere onye ga-ekpe ya ikpe. Ọ bụ okwu+ m kwuru ga-ekpe ya ikpe n’ụbọchị ikpeazụ; 49  n’ihi na ihe m kwuru esighị n’echiche m, kama ọ bụ Nna m bụ́ onye zitere m nyere m iwu ihe m ga-akọ na ihe m ga-ekwu.+ 50  Amakwaara m na iwu ya pụtara ndụ ebighị ebi.+ Ya mere, ihe niile m na-ekwu, dị nnọọ ka Nna m si kọọrọ m ha, otú ahụ ka m si na-ekwu ha.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji