Diuterọnọmi 6:1-25

6  “Ndị a bụ ihe e nyere n’iwu, ụkpụrụ na mkpebi ikpe ndị Jehova bụ́ Chineke unu nyere iwu ka a kụziere unu,+ ka unu wee debe ha n’ala ahụ unu na-agafe ebe ahụ ịga nweta;  ka i wee tụọ egwu+ Jehova bụ́ Chineke gị iji debe ụkpụrụ ya niile na iwu ya niile m na-enye gị, gị na nwa gị na nwa nwa gị,+ ụbọchị niile nke ndụ gị, ka ụbọchị gị wee dị ogologo.+  Nụrụ, Izrel, leziekwa anya idebe+ ha, ka ihe wee gaziere gị,+ ka unu wee dị nnọọ ọtụtụ, dị nnọọ ka Jehova bụ́ Chineke nna nna gị hà kwere gị ná nkwa,+ banyere ala ahụ nke mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.  “Nụrụ, Izrel: Jehova bụ́ Chineke anyị bụ otu Jehova.+  Jiri obi gị dum+ na mkpụrụ obi gị dum+ na ike gị dum+ hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.  Okwu ndị a m na-enye gị n’iwu taa ga-adị n’obi gị;+  kụnye ha n’ime ụmụ gị,+ kwuokwa okwu banyere ha mgbe ị nọ ọdụ n’ụlọ gị na mgbe ị na-eje ije n’okporo ụzọ na mgbe i dina ala+ nakwa mgbe i biliri ọtọ.  Kee ha dị ka ihe ịrịba ama n’aka gị,+ ha ga-abụkwa ihe ị na-ekegide n’egedege ihu gị, n’agbata anya gị abụọ;+  deekwa ha n’awara ụzọ ụlọ gị nakwa n’ọnụ ụzọ ámá gị.+ 10  “Ọ ga-erukwa na mgbe Jehova bụ́ Chineke gị ga-akpọbata gị n’ala ahụ ọ ṅụụrụ nna nna gị hà, bụ́ Ebreham, Aịzik na Jekọb, iyi inye gị,+ bụ́ nnukwu obodo mara mma ndị ọ na-abụghị gị wuru,+ 11  na ụlọ ndị jupụtara n’ihe ọma niile ọ na-abụghị gị kwajuru, na olulu mmiri e gwuru egwu ndị ọ na-abụghị gị gwuru, ubi vaịn na osisi oliv ndị ọ na-abụghị gị kụrụ, ị ga-eri ihe wee rijuo afọ,+ 12  lezie anya ka ị ghara ichefu+ Jehova, bụ́ onye kpọpụtara gị n’ala Ijipt, n’ụlọ ndị ohu. 13  Ọ bụ Jehova bụ́ Chineke gị ka ị ga-atụ egwu,+ ọ bụkwa ya ka ị ga-efe,+ ọ bụkwa aha ya ka ị ga-eji ṅụọ iyi.+ 14  Unu esola chi ọzọ dị iche iche, chi ọ bụla nke ndị nọ gburugburu unu,+ 15  (n’ihi na Jehova bụ́ Chineke gị, bụ́ onye nọ n’etiti unu, bụ Chineke nke chọrọ ofufe a na-ekewaghị ekewa,)+ ka Jehova bụ́ Chineke gị ghara iweso gị iwe dị ọkụ,+ o wee kpochapụ gị n’elu ala.+ 16  “Unu elela Jehova bụ́ Chineke unu ule,+ dị ka unu lere ya ule na Masa.+ 17  Hụkwanụ na unu debere iwu Jehova bụ́ Chineke+ unu na ihe àmà+ ya na ụkpụrụ+ ya bụ́ ndị o nyere unu.+ 18  Meekwa ihe ziri ezi na ihe dị mma n’anya Jehova, ka ihe wee gaziere gị,+ ka i wee banye ma nweta ezi ala ahụ Jehova ṅụụrụ nna nna gị hà iyi inye ha,+ 19  site n’isi n’ihu gị kwapụ ndị iro gị niile, dị nnọọ ka Jehova kwere ná nkwa.+ 20  “Ọ bụrụ na nwa gị ajụọ gị n’ọdịnihu,+ sị, ‘Gịnị ka ihe àmà na ụkpụrụ na mkpebi ikpe ndị Jehova bụ́ Chineke anyị nyere unu pụtara?’ 21  ị ga-agwa nwa gị, sị, ‘Anyị ghọrọ ndị ohu Fero n’Ijipt, ma Jehova ji aka dị ike+ kpọpụta anyị n’Ijipt. 22  Jehova wee na-eme ka ihe ịrịba ama na ọrụ ebube+ ndị dị ukwuu na ndị na-akpata ọdachi dakwasị Ijipt, dakwasịkwa Fero na ezinụlọ ya dum n’ihu anyị.+ 23  O wee kpọpụta anyị n’ebe ahụ ka o wee kpọta anyị ebe a iji nye anyị ala ahụ ọ ṅụụrụ nna nna anyị hà iyi inye ha.+ 24  N’ihi ya, Jehova nyere anyị iwu ka anyị debe ụkpụrụ ndị a niile,+ ịtụ egwu Jehova bụ́ Chineke anyị ka o wee dịrị anyị mma mgbe niile,+ ka anyị wee dịrị ndụ dị ka anyị dị taa.+ 25  Ọ ga-abụkwara anyị ezi omume+ ma ọ bụrụ na anyị elezie anya debe iwu a dum n’ihu Jehova bụ́ Chineke anyị, dị nnọọ ka o nyere anyị n’iwu.’+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji