Diuterọnọmi 14:1-29

14  “Unu bụ ụmụ Jehova bụ́ Chineke unu.+ Unu ebekasịla+ onwe unu ahụ́, unu akpụchapụla+ iku anya* unu n’ihi onye nwụrụ anwụ.  N’ihi na unu bụ ndị dị nsọ+ nye Jehova bụ́ Chineke unu, Jehova ahọrọwokwa unu ịbụ ndị ya, ihe onwunwe pụrụ iche,+ n’etiti ndị niile nọ n’elu ala.  “Erila ụdị ihe ọ bụla rụrụ arụ.+  Nke a bụ ụdị anụmanụ unu nwere ike iri:+ ehi, atụrụ na ewu,  oké ele na nne mgbada na mmoro+ na ewu ọhịa na mgbada na atụrụ ọhịa na anịgọ;  nakwa anụmanụ ọ bụla ụkwụ ya wara njakpa, nke ụkwụ ya nwekwara mkpịwa, anụmanụ ọ bụla nke na-atagharị ọnụ.+ Unu nwere ike iri ya.  Ọ bụ naanị ụdị a ka unu na-agaghị eri n’ime ndị na-atagharị ọnụ ma ọ bụ ndị ụkwụ ha wara njakpa, ndị ụkwụ ha nwekwara mkpịwa: kamel+ na ùrúrù+ na ewi nkume,+ n’ihi na ha na-atagharị ọnụ ma ụkwụ ha awaghị njakpa. Ha bụụrụ unu ihe na-adịghị ọcha.  Tinyere ézì,+ n’ihi na ụkwụ ya wara njakpa ma ọ dịghị atagharị ọnụ. Ọ bụụrụ unu ihe na-adịghị ọcha. Unu erila nke ọ bụla n’anụ ha, unu emetụkwala ozu ha aka.+  “N’ime ihe niile nọ na mmiri, ụdị a ka unu nwere ike iri: Ihe ọ bụla nke nwere ntù na akpịrịkpa ka unu pụrụ iri.+ 10  Unu erikwala ihe ọ bụla na-enweghị ntù na akpịrịkpa.+ Ọ bụụrụ unu ihe na-adịghị ọcha. 11  “Unu pụrụ iri nnụnụ ọ bụla dị ọcha. 12  Ma ndị a ka unu na-agaghị eri nke ọ bụla n’ime ha: ugo na ugo na-eri azụ̀ na udele ojii,+ 13  na égbé uhie na égbé ojii+ na agụ nkwọ n’ụdị ya dị iche iche; 14  na ugoloọma+ niile, n’ụdị ya dị iche iche; 15  na enyí nnụnụ+ na ikwiikwii na nnụnụ mmiri nakwa ndagbù n’ụdị ya dị iche iche; 16  ikwiikwii nta na ikwiikwii ntị ogologo+ na ọbọgwụ mmiri, 17  na okwolo+ na udele na nnụnụ mmiri bụ́ kọmọrant, 18  na ụgbala na ụgbala mmiri n’ụdị ya dị iche iche, na nnụnụ huupu nakwa ụsụ.+ 19  Ihe ọ bụla e kere eke na-enupụta n’ìgwè nke nwere nku bụụrụ unu ihe na-adịghị ọcha.+ A gaghị eri ha eri. 20  Unu nwere ike iri anụ ufe ọ bụla dị ọcha. 21  “Unu erila anụ ọ bụla nwụrụ anwụ.+ I nwere ike inye ya onye mbịarambịa nke bi n’obodo gị, ọ ga-eri ya; ma ọ bụ, a pụrụ iresị ya onye mba ọzọ, n’ihi na unu bụ ndị dị nsọ nye Jehova bụ́ Chineke unu. “Esila nwa ewu n’ime mmiri ara nne ya.+ 22  “Hụ na ị na-enye otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe niile mkpụrụ gị mịpụtara, bụ́ nke a na-eweta n’ubi kwa afọ.+ 23  N’ihu Jehova bụ́ Chineke gị, n’ebe ọ ga-ahọrọ ka aha ya biri, ka ị ga-eri otu ụzọ n’ụzọ iri nke ọka* gị,+ nke mmanya ọhụrụ gị na nke mmanụ gị na nke anụ ndị e bu ụzọ mụọ n’ìgwè ehi gị na n’ìgwè ewu na atụrụ gị;+ ka i wee mụta ịtụ egwu Jehova bụ́ Chineke gị mgbe niile.+ 24  “Ọ bụrụkwa na njem ahụ adịrị gị anya nke ukwuu,+ n’ihi na ị gaghị enwe ike iburu ya, ebe ọ bụ na ebe Jehova bụ́ Chineke gị ga-ahọrọ ime ka aha ya dịrị+ dị gị anya nke ukwuu, (n’ihi na Jehova bụ́ Chineke gị ga-agọzi gị,)+ 25  ị ga-agbanwezi ya ka ọ bụrụ ego, ị ga-ekechikwa ego ahụ ma jiri ya gaa n’ebe ahụ Jehova bụ́ Chineke gị ga-ahọrọ. 26  Ị ga-enyekwa ego ahụ maka ihe ọ bụla pụrụ ịgụ mkpụrụ obi gị agụụ,+ dị ka ehi na atụrụ na ewu na mmanya na ihe ọṅụṅụ na-egbu egbu+ nakwa ihe ọ bụla mkpụrụ obi gị pụrụ ịchọ ka i nye ya; ị ga-erikwa ihe n’ebe ahụ n’ihu Jehova bụ́ Chineke gị ma ṅụrịa ọṅụ,+ gị na ezinụlọ gị. 27  Agbahapụla onye Livaị,+ bụ́ onye bi n’obodo gị, n’ihi na ọ dịghị òkè ma ọ bụ ihe nketa o nwere n’etiti unu.+ 28  “Mgbe afọ atọ gwụchara, ị ga-ewepụta otu ụzọ n’ụzọ iri dum nke mkpụrụ gị n’afọ ahụ,+ ị ga-edebekwa ya n’ime obodo gị. 29  Ebe ọ bụ na onye Livaị+ enweghị òkè ma ọ bụ ihe nketa n’etiti unu, ya onwe ya na onye mbịarambịa+ na nwa na-enweghị nna na nwaanyị di ya nwụrụ,+ bụ́ ndị bi n’obodo gị, ga-abịa, ha ga-erikwa ihe wee rijuo afọ; ka Jehova bụ́ Chineke gị wee gọzie+ gị n’ihe niile ị ga-eji aka gị rụọ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ, “unu akpụchapụla ajị dị n’ihu isi unu.”
Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.