Abụ Ọma 81:1-16

Ntụziaka e nyere onye nduzi nke Gitit.+ Abụ ọma Esaf. 81  Tikuonụ Chineke, bụ́ ike anyị, mkpu ọṅụ;+Tikuonụ Chineke Jekọb mkpu mmeri.+   Malitenụ ịbụ abụ olu ụtọ,+ werekwanụ obere ịgbà+Na une nke na-ada ụda dị ụtọ tinyere ụbọ akwara.+   Fụọnụ opi n’ụbọchị ememme ọnwa ọhụrụ;+Fụọnụ opi n’ụbọchị ọnwa gbazuru agbazu, maka ụbọchị ememme anyị.+   N’ihi na ọ bụ ụkpụrụ dịịrị Izrel,+Ọ bụkwa mkpebi ikpe nke Chineke Jekọb.   O nyere ya Josef ka ọ bụrụ ihe ncheta,+Mgbe ọ na-agabiga ala Ijipt.+M nọ na-anụ asụsụ m na-amaghị.+   “M mere ka ubu ya kwụsị ibu ibu arọ;+Aka ya kwụsịkwara ibu nkata.+   Ị kpọkuru m n’oge ahụhụ, m wee napụta gị;+M wee si n’ebe zoro ezo nke égbè eluigwe si agba za gị.+M wee lee gị ule na mmiri Meriba.+ Sila.   Ndị m, nụrụnụ, m ga-agbakwa akaebe megide unu,+Unu Izrel, nụrụnụ, ma ọ bụrụ na unu ga-ege m ntị.+   Chi ọzọ agaghị adị n’etiti gị;+Ị gaghịkwa akpọrọ chi ala ọzọ isiala.+ 10  Mụ onwe m, Jehova, bụ Chineke gị,+Onye kpọpụtara gị n’ala Ijipt.+Mepechaa ọnụ gị, m ga-emekwa ka ihe ju ya.+ 11  Ma ndị m egeghị ntị n’olu m;+Izrel achọghịkwa irubere m isi.+ 12  M wee hapụ ha ka ha buru isi ike nke dị n’obi ha gawa;+Ha wee na-eme dị ka atụmatụ nke ha si dị.+ 13  A sị nnọọ na ndị m gere m ntị,+A sị nnọọ na Izrel jere ije n’ụzọ m!+ 14  M gaara emeri ndị iro ha n’egbughị oge,+M gakwaara eme ka aka m bịakwasị ndị iro ha.+ 15  Ma ndị kpọrọ Jehova asị nke ukwuu ga-eji egwu bịakwute ya,+Oge ha ga-adịru mgbe a na-akaghị aka. 16  Ọ ga na-enyekwa ha ọka wit kasị mma,+M ga-ejikwa mmanụ aṅụ nke si n’oké nkume nyejuo gị afọ.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji