Abụ Ọma 59:1-17
Ntụziaka e nyere onye nduzi. “Alala m n’iyi.” Abụ ọma Devid. Miktam. Mgbe Sọl dunyere ndị mmadụ, ha wee gaa na-eche ụlọ Devid nche, ka ha gbuo ya.+
59 Chineke m, biko, napụta m n’aka ndị iro m;+Chebe m ka m ghara ịdaba n’aka ndị na-ebili imegide m.+
2 Napụta m n’aka ndị na-eme ihe ọjọọ,+Zọpụtakwa m n’aka ndị ikpe ọbara mara.
3 N’ihi na, lee! ha echebiriwo mkpụrụ obi m;+Jehova, ndị dị ike na-awakpo m,+Mgbe ọ na-adịghị isi m nupụrụ, mgbe ọ na-adịghịkwa mmehie m mere.+
4 Ọ bụ ezie na ejehieghị m, ha na-eji ọsọ gaa jikere.+Mgbe m kpọkuru gị, bilie hụrụ.+
5 Gị onwe gị, Jehova Chineke nke ụsụụ ndị agha, bụ Chineke Izrel.+Teta chee ihu gị n’ebe mba niile nọ.+Emerela ndị ọjọọ ọ bụla na-arara mmadụ nye amara.+ Sila.
6 Ha na-alaghachite n’oge anyasị;+Ha na-agbọ ụja dị ka nkịta+ ma na-agagharị n’obodo.+
7 Lee! Ha na-agbọpụtasị okwu ọjọọ n’ọnụ ha;+Mma agha dị n’egbugbere ọnụ ha,+N’ihi na ha na-asị: “Ònye na-ege ntị?”+
8 Ma gị onwe gị, Jehova, ga-achị ha ọchị;+Ị ga-akwa mba niile emo.+
9 Ike m, n’ebe ị nọ ka anya m ga-adị;+N’ihi na Chineke bụ ebe m dị elu e wusiri ike.+
10 Chineke nke na-egosi m obiọma* ga-ezute m;+Chineke ga-eme ka m na-ele ndị iro m anya, na-achị ha ọchị.+
11 Egbula ha, ka ndị m wee ghara ichefu.+Jehova bụ́ ọta anyị, biko, jiri ike gị mee ka ha wagharịa,+Kwada ha,+
12 N’ihi mmehie ha ji ọnụ ha mee, bụ́ okwu nke si n’egbugbere ọnụ ha;+Ka e jidekwa ha na nganga ha,+Ee, n’ihi ọbụbụ ọnụ na okwu aghụghọ ha na-ekwu ugboro ugboro.
13 Jiri ọnụma gị laa ha n’iyi;+Laa ha n’iyi, ka ha ghara ịdịkwa;Ka ha wee mara na ọ bụ Chineke na-achị n’ime Jekọb ruo na nsọtụ ụwa.+ Sila.
14 Ka ha laghachite n’oge anyasị;Ka ha gbọọ ụja dị ka nkịta ma gagharịa n’obodo.+
15 Ka ha wagharịa chọọ ihe ha ga-eri;+Ka afọ ghara iju ha, ka ha gharakwa ịhụ ebe ha ga-ehi ụra abalị.+
16 Ma mụ onwe m ga-abụ abụ banyere ike gị,+M ga-ejikwa ọṅụ kọọ banyere obiọma gị n’ụtụtụ.+N’ihi na ị bụụrụ m ebe dị elu e wusiri ike+Nakwa ebe m ga-agbaba n’ụbọchị m nọ n’ahụhụ.+
17 Ike m, ọ bụ gị ka m ga-abụku abụ olu ụtọ,+N’ihi na Chineke bụ ebe m dị elu e wusiri ike, bụrụkwa Chineke nke na-egosi m obiọma.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”