Abụ Ọma 54:1-7
Ntụziaka e nyere onye nduzi ụbọ akwara. Maskil. Abụ ọma Devid. Mgbe ndị Zif bịara gwa Sọl, sị: “Ị̀ makwa na Devid zoro n’etiti anyị?”+
54 Chineke, biko, jiri aha gị zọpụta m,+Jirikwa ike gị kpechite ọnụ m.+
2 Chineke, biko, nụrụ ekpere m;+Ṅaa ntị n’ihe ọnụ m na-ekwu.+
3 N’ihi na e nwere ndị iro* bụ́ ndị biliworo imegide m,Na ndị aka ike bụ́ ndị na-achọ mkpụrụ obi m.+Ha adịghị eme ka Chineke nọrọ n’ihu ha.+ Sila.
4 Lee! Chineke bụ onye na-enyere m aka;+Jehova nọnyeere ndị na-akwado mkpụrụ obi m.
5 Ọ ga-akwụ ndị iro m ụgwọ ihe ọjọọ ha;+Jiri eziokwu gị bibie ha.+
6 M ga-eji obi m dum chụọrọ gị àjà.+Jehova, m ga-eto aha gị n’ihi na ọ dị mma.+
7 N’ihi na ọ napụtara m ná nsogbu niile,+Ana m ele ndị iro m anya, na-achịkwa ha ọchị.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Otú e si dee ya n’asụsụ Hibru bụ “ndị ala ọzọ.”