Abụ Ọma 43:1-5
43 Chineke, biko, kpee m ikpe,+Kpechite ọnụ m+ n’ikpe mụ na mba nke na-adịghị eguzosi ike n’ihe nwere.Meere m ụzọ m ga-esi gbapụ n’aka onye aghụghọ nke bụkwa onye ajọ omume.+
2 N’ihi na ị bụ Chineke m, nke bụ́ ebe m e wusiri ike.+Gịnị mere i ji jụ m?Gịnị mere m ji na-ejegharị ná mwute n’ihi mmegbu si n’aka onye iro?+
3 Zipụ ìhè gị nakwa eziokwu gị.+Ka ha na-edu m.+Ka ha duru m rute n’ugwu nsọ gị nakwa n’ụlọikwuu gị dị ebube.+
4 M ga-abịakwa n’ebe ịchụàjà nke Chineke,+Bịakwute Chineke, bụ́ oké ọṅụ m.+M ga-ejikwa ụbọ akwara too gị, Chineke, bụ́ Chineke m.+
5 Mkpụrụ obi m, gịnị mere i ji daa mbà,+Gịnịkwa mere i ji na-agba ghara ghara n’ime m?Chere Chineke,+N’ihi na m ka ga-enye ya otuto dị ka onye na-enye m nzọpụta dị ukwuu nakwa dị ka Chineke m.+