Abụ Ọma 40:1-17

Ntụziaka e nyere onye nduzi. Abụ ọma Devid, abụ olu ụtọ. 40  N’ebe Jehova nọ ka m nwere olileanya siri ike,+O wee tọọrọ m ntị n’ala nụ mkpu enyemaka m tiri.+   O wee dọpụta m n’olulu nke mmiri dị n’ime ya na-eme mkpọtụ,+Nakwa n’apịtị nke ala ụrọ.+O wee mee ka m guzoro na nkume dị elu;+O mere ka ụkwụ m guzosie ike.+   O tinyekwara abụ ọhụrụ n’ọnụ m,Bụ́ otuto m ga-enye Chineke anyị.+Ọtụtụ ndị ga-ahụ ya wee tụọ egwu,+Ha ga-atụkwasịkwa Jehova obi.+   Obi ụtọ na-adịrị nwoke nke tụkwasịrị Jehova obi,+Nke na-adịghị echigharịkwuru ndị isi ike,Ma ọ bụ ndị na-adaba n’ụgha.+   I mewo ọtụtụ ihe,+Jehova bụ́ Chineke m, bụ́ ọrụ gị ndị dị ebube nakwa ihe ndị ị na-eche banyere anyị;+Ọ dịghị onye a ga-eji tụnyere gị.+Ọ bụrụ na mụ asị ka m kọwa ha ma ọ bụ kwuwe banyere ha,Ha dị ọtụtụ karịa otú m pụrụ ịkọ.+   Àjà na onyinye atọghị gị ụtọ;+Ọ bụ gị meghere ntị m abụọ ndị a.+Ị sịghị ka a chụọrọ gị àjà nsure ọkụ na àjà mmehie.+   N’ihi nke ahụ, asịrị m: “Lee, abịawo m,+E dere ihe banyere m n’akwụkwọ mpịakọta.+   Chineke m, ime uche gị na-atọ m ụtọ,+Iwu gị dịkwa n’ime obi m.+   Ana m ezi ozi ọma ezi omume n’ọgbakọ buru ibu.+Lee! Adịghị m emechi ọnụ.+Jehova, gị onwe gị maara nke ahụ nke ọma.+ 10  Ekpuchighị m ezi omume gị n’ime obi m.+Akọsawo m ikwesị ntụkwasị obi gị na nzọpụta gị.+Ezobeghị m obiọma* gị nakwa eziokwu gị n’ọgbakọ buru ibu.”+ 11  Gị onwe gị, Jehova, biko, ahapụla inwere m ọmịiko.+Ka obiọma gị nakwa eziokwu gị na-eche m nche mgbe niile.+ 12  N’ihi na ọdachi gbara m gburugburu ruo mgbe a na-apụghị ịgụta ha ọnụ.+Njehie m rikpuru m karịa otú m nwere ike ịhụ;+Ha dị ọtụtụ karịa ntutu isi m,+Adara m mbà n’obi.+ 13  Jehova, biko, ka ọ dị gị mma ịnapụta m.+Jehova, biko, bịa ngwa ngwa nyere m aka.+ 14  Ka ihere mee ha, ka e mechuokwa ha niile ihu,+Bụ́ ndị na-achọ mkpụrụ obi m ka ha bibie ya.+Ka ndị ọdachi m na-atọ ụtọ laghachi azụ, ka e menyekwa ha ihere.+ 15  Ka ha kporopụ anya n’ihi ihere na-eme ha,+Bụ́ ndị na-asị m: “Ntọọ! Ntọọ!”+ 16  Ka ha nwee obi ụtọ ma ṅụrịa ọṅụ n’ime gị,+Bụ́ ndị niile na-achọ gị.+Ka ha na-ekwu mgbe niile, sị: “Ka e too Jehova,”+Bụ́ ndị hụrụ nzọpụta gị n’anya.+ 17  Ma anọ m n’ahụhụ, adakwara m ogbenye.+Jehova na-echeta m.+Ị bụ onye na-enyere m aka na Onye na-emere m ụzọ mgbapụ.+Chineke m, biko, egbula oge.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”