Abụ Ọma 3:1-8

Abụ olu ụtọ Devid bụrụ mgbe ọ na-agba ọsọ n’ihi Absalọm nwa ya.+ 3  Jehova, gịnị mere ndị iro m ji dị ọtụtụ?+Gịnị mere ọtụtụ ndị ji na-ebili imegide m?+   Ọtụtụ ndị na-ekwu banyere mkpụrụ obi m, sị:“Chineke agaghị azọpụta ya.”+ Sila.   Ma gị onwe gị, Jehova, bụ ọta nke gbara m gburugburu,+Ebube m+ na Onye na-ebuli isi m elu.+   M ga-eji olu m kpọkuo Jehova,Ọ ga-esikwa n’ugwu nsọ ya za m.+ Sila.   Ma mụ onwe m ga-edina ala rahụ ụra;M ga-eteta, n’ihi na Jehova na-akwado m.+   M gaghị atụ puku mmadụ iri egwu,Bụ́ ndị gbara m gburugburu imegide m.+   Jehova, biko, bilie!+ Chineke m,+ biko, zọpụta m!+Tie ndị iro m niile ihe n’agba.+Kụpụsịa ndị ajọ omume ezé.+   Ọ bụ Jehova nwe nzọpụta.+Ngọzi gị dị n’ahụ́ ndị gị.+ Sila.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji