Abụ Ọma 20:1-9
Ntụziaka e nyere onye nduzi. Abụ olu ụtọ Devid.
20 Ka Jehova za gị n’ụbọchị ahụhụ.+Ka aha Chineke nke Jekọb chebe gị.+
2 Ka o si n’ebe nsọ+ zitere gị enyemaka,Sikwa na Zayọn kwado gị.+
3 Ka o cheta onyinye inweta ihu ọma gị niile,+Ka ọ narakwa àjà nsure ọkụ gị dị ka à ga-asị na ọ bụ abụba.+ Sila.
4 Ka o nye gị ihe obi gị chọrọ,+Ka o mezuokwa ebumnobi gị niile.+
5 Anyị ga-eti mkpu ọṅụ n’ihi nzọpụta gị,+Anyị ga-ebulikwa ọkọlọtọ anyị n’aha Chineke anyị.+Ka Jehova mezuo ihe niile ị na-arịọ.+
6 Ugbu a ka m maara na Jehova na-azọpụta onye o tere mmanụ.+Ọ na-eji oké ọrụ nzọpụta nke aka nri ya na-arụ+Nọrọ n’eluigwe ya dị nsọ za ya.+
7 Ụfọdụ na-ekwu banyere ụgbọ ịnyịnya, ndị ọzọ na-ekwu banyere ịnyịnya,+Ma anyị onwe anyị ga na-ekwu banyere aha Jehova bụ́ Chineke anyị.+
8 Ha onwe ha adawo mbà wee daa;+Ma anyị onwe anyị ebiliwo, ka e wee mee ka anyị kwụrụ chịm.+
9 Jehova, biko, zọpụta eze!+Ọ ga-aza anyị n’ụbọchị anyị kpọrọ ya.+