Abụ Ọma 142:1-7
Maskil. Abụ ọma Devid, mgbe ọ nọ n’ime ọgba.+ Ekpere.
142 Eji m olu m kpọkuo Jehova ka o nyere m aka;+Eji m olu m malite itiku Jehova ka o meere m amara.+
2 M nọ na-awụpụ nchegbu m n’ihu ya dị ka mmiri.+M nọ na-akọ nhụjuanya m n’ihu ya,+
3 Mgbe ike gwụrụ mmụọ m+ n’ime m.Mgbe ahụ, gị onwe gị maara okporo ụzọ m.+Ha siiri m ọnyà+N’ụzọ m si agafe.+
4 Lee anya n’aka nri hụNa ọ dịghị onye na-eme ka ọ̀ ma onye m bụ.+Enwekwaghị m ebe mgbaba;+Ọ dịghị onye na-ajụ ase mkpụrụ obi m.+
5 Jehova, akpọkuru m gị ka i nyere m aka.+Asịrị m: “Ị bụ ebe mgbaba m,+Bụrụkwa òkè m+ n’ala ndị dị ndụ.”+
6 Ṅaa ntị n’ákwá m na-ebesara gị,+N’ihi na ike agwụla m kpamkpam.+Napụta m n’aka ndị na-akpagbu m,+N’ihi na ha ka m ike.+
7 Mee ka mkpụrụ obi m si n’ụlọ mkpọrọ pụta+Ka m wee too aha gị.+Ka ndị ezi omume zukọta gburugburu m,+N’ihi na ị na-emeso m ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị.+