Abụ Ọma 14:1-7

Ntụziaka e nyere onye nduzi. Abụ ọma Devid. 14  Onye nzuzu asịwo n’obi ya:“Jehova adịghị.”+Ha emewo omume na-eweta mbibi,+ ha emewo arụ n’omume ha.Ọ dịghị onye na-eme ihe ọma.+   Ma Jehova si n’eluigwe ledata anya lee ụmụ mmadụ,+Iji hụ ma ọ̀ dị onye nwere nghọta, onye na-achọ Jehova.+   Ha niile esiwo n’ụzọ pụọ,+ ha niile rụrụ arụ;+Ọ dịghị onye na-eme ihe ọma,+Ọbụnadị otu onye.+   Ọ̀ bụ na ọ dịghị onye ọ bụla maara ihe n’ime ndị na-eme ihe ọjọọ,+Bụ́ ndị na-eri ndị m dị ka à ga-asị na ha bụ nri?+Ha adịghị akpọku Jehova.+   Oké ụjọ jidere ha n’ebe ahụ,+N’ihi na Jehova nọ n’etiti ọgbọ onye ezi omume.+   Unu na-eme ka atụmatụ nke onye nọ n’ahụhụ bụrụ ihe ihere,N’ihi na Jehova bụ ebe mgbaba ya.+   A sị nnọọ na nzọpụta ga-esi na Zayọn bịara Izrel!+Mgbe Jehova ga-akpọlata ndị ya a dọọrọ n’agha,+Ka Jekọb ṅụrịa ọṅụ, ka Izrel nwee obi ụtọ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji