Ọpụpụ 39:1-43

39  Ha jikwa eri na-acha anụnụ anụnụ na ajị anụ e sijiri odo odo na eri na-acha uhie uhie+ kpaa uwe+ dị iche iche nke ọma maka ije ozi n’ebe nsọ.+ Ha wee kpaa uwe nsọ+ Erọn, dị nnọọ ka Jehova nyere Mozis n’iwu.  O wee jiri ọlaedo, eri na-acha anụnụ anụnụ na ajị anụ e sijiri odo odo na eri na-acha uhie uhie na ezigbo eri linin a kpara akpa, kwee efọd+ ahụ.  Ha wee kụọ mbadamba ọlaedo dị iche iche ka ha dị fere fere, o wee bepụta eri ndị ọ ga-akpakọta ha na eri ahụ na-acha anụnụ anụnụ na ajị anụ ahụ e sijiri odo odo na eri ahụ na-acha uhie uhie na ezigbo eri linin ahụ, dị ka nke onye na-akpa ihe n’ákwà kpara.+  Ha wee dụọ ubu ya bụ́ ndị e jikọtara ejikọta. E jikọtara ya ejikọta na nsọtụ ya abụọ.  Otú e si kwee efọd ahụ ka e si kwee eriri ya nke dị n’elu ya iji na-ekesi ya ike, e jikwa otu ihe ahụ e ji kwee efọd ahụ, bụ́ eri na-acha anụnụ anụnụ na ajị anụ e sijiri odo odo na eri na-acha uhie uhie na ezigbo eri linin a kpara akpa, kwee ya,+ dị nnọọ ka Jehova nyere Mozis n’iwu.  Ha wee kwụnye nkume ọnịks+ n’ihe mbadamba e ji ọlaedo kpụọ, bụ́ ndị a kanyere aha ụmụ Izrel na ha dị ka ihe a kanyere na mgbaaka e ji aka ihe akara.+  O wee tinye ha n’ubu efọd ahụ ka ha bụrụ nkume ncheta+ nye ụmụ Izrel, dị nnọọ ka Jehova nyere Mozis n’iwu.  O wee kwee akpa obi+ ahụ dị ka ihe onye na-akpa ihe n’ákwà kpara, dị ka e si kwee efọd ahụ, nke e ji ọlaedo, eri na-acha anụnụ anụnụ na ajị anụ e sijiri odo odo na eri na-acha uhie uhie na ezigbo eri linin a kpara akpa, kwee.+  O nwere akụkụ anọ há nhata ma a pịajie ya. Ha mere akpa obi ahụ ka ọ dị otu ntụ ọbụ aka n’ogologo nakwa otu ntụ ọbụ aka n’obosara, ma a pịajie ya.+ 10  Ha wee tinye ya ahịrị nkume anọ. Ahịrị nke mbụ bụ rubi, topaz na emerad.+ 11  Ahịrị nke abụọ+ bụ tọkwọiz na safaya+ na jaspa.+ 12  Ahịrị nke atọ+ bụ nkume leshem, aget na ametist. 13  Ahịrị nke anọ+ bụ krisolaịt na ọnịks+ na jed. E tinyere ha n’oghere ha bụ́ ndị e ji ọlaedo mee. 14  Nkume ndị ahụ dị ole aha ụmụ Izrel dị. Ha dị iri na abụọ dị ka aha ha si dị, ndị a kanyere dị ka ihe a kanyere na mgbaaka e ji aka ihe akara, ebo nke ọ bụla, dị ka aha ya si dị, maka ebo iri na abụọ ahụ.+ 15  Ha wee jiri ọlaedo a na-agwaghị agwa mee ụdọ ígwè, dị ka eriri, n’elu akpa obi ahụ.+ 16  Ha wee jiri ọlaedo kpụọ ihe mbadamba abụọ, jirikwa ọlaedo kpụọ ihe abụọ yiri mgbaaka ma tinye ihe abụọ ahụ yiri mgbaaka na nsọtụ abụọ nke akpa obi ahụ.+ 17  E mesịa, ha ganyere eriri abụọ ahụ e ji ọlaedo kpụọ n’ihe abụọ ahụ yiri mgbaaka dị na nsọtụ akpa obi ahụ.+ 18  Ha wee ganye isi abụọ nke eriri abụọ ahụ n’ihe mbadamba abụọ ahụ. Ha wee kegide ha n’ubu efọd ahụ, n’ihu ya.+ 19  Ọzọ, ha ji ọlaedo kpụọ ihe abụọ yiri mgbaaka ma kwụnye ha na nsọtụ abụọ nke akpa obi ahụ, n’ọnụ ọnụ ya nke dị n’ime, n’akụkụ chere efọd ahụ ihu.+ 20  Ha wee jiri ọlaedo kpụọ ihe abụọ yiri mgbaaka ma si n’okpuru kwụnye ha n’ubu abụọ nke efọd ahụ, n’ihu ya, n’akụkụ ebe a dụkọtara ya adụkọta, n’elu eriri efọd ahụ.+ 21  N’ikpeazụ, ha ji eriri na-acha anụnụ anụnụ kekọta ihe ahụ yiri mgbaaka nke dị n’akpa obi ahụ na ihe ahụ yiri mgbaaka nke dị n’efọd ahụ, ka o wee na-adị n’elu eriri efọd ahụ, ka akpa obi ahụ gharakwa isi n’elu efọd ahụ dapụ, dị nnọọ ka Jehova nyere Mozis n’iwu.+ 22  O wee kwee uwe na-enweghị aka+ nke efọd ahụ, nke onye na-ekwe ákwà kwere, e ji naanị eri na-acha anụnụ anụnụ kwee ya. 23  Uwe ahụ na-enweghị aka nwere oghere n’etiti ya, dị ka oghere na-adị n’uwe agha. A dụrụ ọnụ ọnụ oghere ya adụ gbaa gburugburu ka ọ ghara ịdọka adọka.+ 24  Ha wee jiri eri na-acha anụnụ anụnụ na ajị anụ e sijiri odo odo na eri na-acha uhie uhie kpaa mkpụrụ pọmigranet n’ọnụ ọnụ ala uwe ahụ na-enweghị aka, ndị a kpakọtara akpakọta.+ 25  Ha jikwa ọlaedo a na-agwaghị agwa kpụọ mgbịrịgba ma tinye mgbịrịgba ndị ahụ n’agbata mkpụrụ pọmigranet+ ndị dị gburugburu ọnụ ọnụ ala uwe ahụ na-enweghị aka, n’agbata mkpụrụ pọmigranet ndị ahụ; 26  otu mgbịrịgba na otu mkpụrụ pọmigranet, otu mgbịrịgba na otu mkpụrụ pọmigranet gbaa gburugburu ọnụ ọnụ ala uwe ahụ na-enweghị aka,+ maka ije ozi, dị nnọọ ka Jehova nyere Mozis n’iwu. 27  Ọzọ, ha ji ezigbo eri linin kwee uwe mwụda dị iche iche,+ ndị onye na-ekwe ákwà kwere, maka Erọn na ụmụ ya ndị ikom, 28  jirikwa ezigbo eri linin kwee ákwà a na-eke n’isi+ na ákwà ịchọ mma a na-afụ n’isi+ na uwe úkwù+ nke e ji ezigbo eri linin a kpara akpa kwee, 29  na ákwà a na-eke n’úkwù+ nke e ji ezigbo eri linin a kpara akpa na eri na-acha anụnụ anụnụ na ajị anụ e sijiri odo odo na eri na-acha uhie uhie kwee, nke onye na-ekwe ákwà kwere, dị nnọọ ka Jehova nyere Mozis n’iwu. 30  N’ikpeazụ, ha ji ọlaedo a na-agwaghị agwa mee ihe mbadamba na-egbuke egbuke, ihe àmà dị nsọ nke nraranye ma kanye ihe n’elu ya dị ka ihe a kanyere na mgbaaka e ji aka ihe akara: “Ịdị nsọ bụ nke Jehova.”+ 31  Ha wee ganye ya eriri na-acha anụnụ anụnụ iji kegide ya n’elu ákwà ahụ a na-eke n’isi,+ dị nnọọ ka Jehova nyere Mozis n’iwu. 32  Ọrụ niile nke ụlọikwuu ahụ, ya bụ, ụlọikwuu nzute, wee gwụ, n’ihi na ụmụ Izrel nọ na-eme ihe niile Jehova nyere Mozis n’iwu.+ Ha mere nnọọ otú ahụ. 33  Ha wee butere Mozis ụlọikwuu ahụ,+ ihe niile e ji rụọ ya+ na arịa ya niile,+ nko ya,+ awara osisi ya,+ osisi ntụhie+ ya na ogidi ya na ntọala ya ndị nwere oghere,+ 34  na ihe mkpuchi ya nke e ji akpụkpọ ebule e sijiri+ ọbara ọbara mee na ihe mkpuchi ya nke e ji akpụkpọ anụ sil+ mee na ákwà mgbochi ya,+ 35  na igbe+ ihe àmà ahụ na okporo osisi+ ya na ihe mkpuchi ya,+ 36  na tebụl ahụ,+ na arịa ya niile+ na achịcha a na-eche n’ihu Chineke, 37  na ihe ndọba oriọna+ ahụ nke e ji ọlaedo a na-agwaghị agwa rụọ, oriọna ya, bụ́ oriọna ndị dị n’ahịrị,+ na arịa ya niile+ na mmanụ ọkụ ya,+ 38  na ebe ịchụàjà+ ahụ e ji ọlaedo rụọ na mmanụ e ji ete mmadụ mmanụ+ na ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ+ na ákwà ngebichi+ nke ọnụ ụzọ ụlọikwuu ahụ, 39  ebe ịchụàjà+ e ji ọla kọpa rụọ na ihe ahụ e ji ọla kọpa kpaa+ nke e tinyere n’ime ya, okporo osisi+ ya na arịa ya niile,+ efere+ na ihe ndọkwasị ya,+ 40  ákwà ngechi+ ogige ahụ, ogidi+ ya na ntọala ya ndị nwere oghere+ na ákwà ngebichi+ nke ọnụ ụzọ ogige ahụ, ụdọ ụlọikwuu+ ya na mkpọ́ ụlọikwuu+ ya na arịa niile+ a rụrụ maka ije ozi n’ụlọ nsọ ahụ, maka ụlọikwuu nzute ahụ, 41  uwe+ ndị a kpara nke ọma maka ije ozi n’ebe nsọ ahụ, uwe+ nsọ nke Erọn onye nchụàjà na ụmụ ya ndị ikom ga-eyi na-arụ ọrụ dị ka ndị nchụàjà.+ 42  Dị ka ihe niile Jehova nyere Mozis n’iwu si dị, otú ahụ ka ụmụ Izrel rụrụ ọrụ ahụ dum.+ 43  Mozis wee hụ ọrụ ahụ dum, ma, lee! ha rụrụ ya dị ka Jehova nyere n’iwu. Otú ahụ ka ha mere. N’ihi ya, Mozis gọziri ha.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji