Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 104

Ndị Juu Anụ Olu Chineke, ma Hà Ga-enwenụ Okwukwe?

Ndị Juu Anụ Olu Chineke, ma Hà Ga-enwenụ Okwukwe?

JỌN 12:28-50

  • ỌTỤTỤ NDỊ NỤRỤ OLU CHINEKE

  • IHE A GA-EJI KPEE HA IKPE

Mgbe Jizọs nọ n’ụlọ nsọ na Mọnde, abalị iri n’ọnwa Naịsan, o kwuru gbasara ọnwụ ọ na-aga ịnwụ n’oge na-adịghị anya. Ọ nọ na-echegbu onwe ya gbasara otú ọnwụ ya ga-esi mee ka a kọchaa Chineke. N’ihi ya, ọ gwara Chineke, sị: “Nna, mee ka aha gị dị ebube.” Otu olu si n’eluigwe kwuo, sị: “Emewo m ka ọ dị ebube, m ga-emekwa ka ọ dị ebube ọzọ.”—Jọn 12:27, 28.

Olu a gbara ndị nọ nso gharịị. Ụfọdụ chere na ọ bụ égbè eluigwe gbara. Ndị ọzọ kwuru, sị: “Mmụọ ozi agwawo ya okwu.” (Jọn 12:29) Ma, ọ bụ olu Jehova ka ha nụrụ. Ihe a abụghịkwa nke mbụ ụmụ mmadụ na-anụ olu Chineke n’oge Jizọs nọ n’ụwa.

Nke mbụ bụ mgbe e mere Jizọs baptizim. N’oge ahụ, Jọn Onye Na-eme Baptizim nụrụ ka Chineke kwuru banyere Jizọs, sị: “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya, onye ihe ya masịrị m.” Nke abụọ bụ mgbe e mechara Ememme Ngabiga nke afọ 32. N’oge ahụ, Jizọs nwoghara n’ihu Jems, Jọn, na Pita. Ha atọ nụrụ ka Chineke kwuru, sị: “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya, onye ihe ya masịrị m; geenụ ya ntị.” (Matiu 3:17; 17:5) Ma, na nke ugboro atọ a Jehova kwuru okwu, o kwuru ya otú ọtụtụ ndị ga-anụ ya.

Jizọs sịrị: “Olu a kwuru okwu abụghị n’ihi m, kama ọ bụ n’ihi unu.” (Jọn 12:30) Olu ahụ ndị Juu nụrụ gosiri na Jizọs bụ Ọkpara Chineke n’eziokwu, ya bụ, Mesaya ahụ e kwere ná nkwa.

Ihe ọzọ bụ na otú Jizọs si bie ndụ ya mere ka a mara otú ụmụ mmadụ kwesịrị isi na-ebi ndụ. O gosikwara na Setan bụ́ Ekwensu, bụ́ onye na-achị ụwa, kwesịrị ọnwụ. Jizọs kwuru, sị: “A na-ekpe ụwa a ikpe ugbu a; ugbu a, a ga-achụpụ onye na-achị ụwa a.” Jizọs ịnwụ apụtaghị na e meriela ya, kama, ọ pụtara na o meriela. Gịnị mere nke a ji bụrụ eziokwu? O kwuru, sị: “Ma mụ onwe m, ọ bụrụ na e si n’ụwa welie m, m ga-adọta ụdị mmadụ niile n’ebe m nọ.” (Jọn 12:31, 32) Jizọs ga-esi n’ọnwụ ọ ga-anwụ n’osisi ịta ahụhụ dọta ndị mmadụ n’ebe ọ nọ ma mee ka ha nweta ndụ ebighị ebi.

Mgbe Jizọs kwuchara banyere ‘isi n’ụwa welie ya,’ ìgwè mmadụ ahụ gwara ya, sị: “Anyị nụrụ n’ime Iwu ahụ na Kraịst ga-anọgide ruo mgbe ebighị ebi; oleekwanụ otú i si na-asị na a ghaghị iweli Nwa nke mmadụ elu? Ònye ka Nwa nke mmadụ a bụ?” (Jọn 12:34) N’agbanyeghị olu Chineke ha nụrụ na ihe ndị ọzọ merenụ, ọtụtụ n’ime ha ekweghị na Jizọs bụ Nwa nke mmadụ n’eziokwu, nakwa na ọ bụ Mesaya ahụ e kwere ná nkwa.

Jizọs kwukwara ọzọ na ya bụ “ìhè.” (Jọn 8:12; 9:5) Ọ gwara ìgwè mmadụ ahụ, sị: “Ìhè ahụ ga-anọtụkwu nwa oge n’etiti unu. Na-ejegharịnụ mgbe unu nwere ìhè ahụ, ka ọchịchịrị wee ghara ikpuchi unu . . . Mgbe unu ka nwere ìhè ahụ, nweenụ okwukwe n’ìhè ahụ, ka unu wee bụrụ ụmụ nke ìhè.” (Jọn 12:35, 36) Mgbe Jizọs kwuchara ihe a, ọ gara zoo n’ihi na abalị iri n’ọnwa Naịsan abụghị oge ọ ga-anwụ. Ọ bụ n’oge Ememme Ngabiga, n’abalị iri na anọ n’ọnwa Naịsan, ka ‘a ga-eweli ya,’ ya bụ, ka a ga-akpọgide ya n’osisi ịta ahụhụ.—Ndị Galeshia 3:13.

Ọ bụrụ na anyị eleba anya n’ihe mere n’oge Jizọs na-eje ozi ya n’ụwa, anyị ga-achọpụta na okwukwe ndị Juu na-enweghị na Jizọs mezuru amụma dị na Baịbụl. Aịzaya buru amụma na a ga-anyachi ndị mmadụ anya, meekwa ka obi ha kpọọ nkụ nke na ha agaghị echegharị, a gwọọ ha. (Aịzaya 6:10; Jọn 12:40) N’eziokwu, ọtụtụ ndị Juu ekwetaghị n’ihe ndị gosiri na Jizọs bụ Onye Nnapụta ahụ e kwere ná nkwa, bụ́ onye ha ga-esi n’aka ya nweta ndụ ebighị ebi.

Nikọdimọs, Josef onye Arimatia, na ọtụtụ ndị ọzọ na-achị achị “nwere okwukwe n’ezie” na Jizọs. Ma, hà ga-emenụ ihe ndị gosiri na ha nwere okwukwe, ka egwu ịchụpụ ha n’ụlọ nzukọ, ma ọ bụ ‘ịhụ otuto mmadụ n’anya,’ ọ̀ ga-eme ka ha ghara ime ihe ndị gosiri na ha nwere okwukwe?—Jọn 12:42, 43.

Jizọs kwuru otu n’ime ihe inwe okwukwe na ya pụtara. Ọ sịrị: “Onye nwere okwukwe n’ebe m nọ nwere okwukwe, ọ bụghị naanị n’ebe m nọ, kamakwa n’ebe onye zitere m nọ; onye na-ahụ m na-ahụkwa onye zitere m.” Ihe Chineke gwara Jizọs kụzie, bụ́kwanụ ihe Jizọs nọgidere na-akụzi, dị ezigbo mkpa nke na Jizọs sịrị: “Onye na-eleda m anya, nke na-adịghịkwa anabata ihe m na-ekwu, nwere onye ga-ekpe ya ikpe. Ọ bụ okwu m kwuru ga-ekpe ya ikpe n’ụbọchị ikpeazụ.”—Jọn 12:44, 45, 48.

Jizọs mechiziri okwu ya, sị: “Ihe m kwuru esighị n’echiche m, kama ọ bụ Nna m bụ́ onye zitere m nyere m iwu ihe m ga-akọ na ihe m ga-ekwu. Amakwaara m na iwu ya pụtara ndụ ebighị ebi.” (Jọn 12:49, 50) Jizọs ma na n’oge na-adịghị anya, ọ ga-eji ndụ ya chụọ àjà maka ndị nwere okwukwe na ya.—Ndị Rom 5:8, 9.