Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 58

Ọ Mụbara Achịcha, Kwuokwa Ka E Lezie Anya Maka Ihe Iko Achịcha

Ọ Mụbara Achịcha, Kwuokwa Ka E Lezie Anya Maka Ihe Iko Achịcha

MATIU 15:32–16:12 MAK 8:1-21

  • JIZỌS ENYE PUKU NDỊ IKOM ANỌ NRI

  • JIZỌS ADỌỌ NDỊ NA-ESO ỤZỌ YA AKA NÁ NTỊ GBASARA IHE IKO ACHỊCHA NKE NDỊ FARISII

Mgbe ahụ Jizọs nọ na Dikapọlis, n’ebe ọwụwa anyanwụ Osimiri Galili, ìgwè mmadụ bịakwutere ya ka ha nụrụ okwu ya nakwa ka ọ gwọọ ha. Ha bucha nnukwu nkata ihe oriri ha bịa.

Mgbe abalị ole na ole gara, Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Enwere m ọmịiko n’ebe ìgwè mmadụ a nọ, n’ihi na ka ọ dị ugbu a, mụ na ha anọwo ruo ụbọchị atọ, ha enweghịkwa ihe ha ga-eri; ọ bụrụkwa na mụ asị ha lawa n’ụlọ ha n’agụụ, ha ga-ada mbà n’okporo ụzọ. N’ezie, ụfọdụ n’ime ha si ebe dị anya.” Ma, ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya, sị: “Ebee ka mmadụ ga-esi nweta achịcha ga-eju ndị a afọ n’ebe a dịpụrụ adịpụ?”—Mak 8:2-4.

Jizọs jụrụ ha, sị: “Ogbe achịcha ole ka unu nwere?” Ha asị ya: “Asaa, na obere azụ̀ ole na ole.” (Matiu 15:34) Jizọs gwaziri ìgwè mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala. O weere ogbe achịcha ndị ahụ na azụ̀ ndị ahụ, kpegara Chineke ekpere ma nye ya ndị na-eso ụzọ ya ka ha kesaara ya ìgwè mmadụ ahụ. Ọ dị ịtụnanya na mmadụ niile rijuru afọ. Nke ha rifọrọ erifọ jukwara nkata asaa n’agbanyeghị na ndị riri ya dị puku ndị ikom anọ, n’agụnyeghị ụmụ nwaanyị na ụmụntakịrị.

Jizọs mechara zipụ ìgwè mmadụ ahụ ka ha lawa, ya na ndị na-eso ụzọ ya abanyezie n’ụgbọ kwọfeta n’ebe a na-akpọ Magadan, nke dị n’ebe ọdịda anyanwụ Osimiri Galili. Mgbe ha rutere ebe ahụ, ndị Farisii na ụfọdụ ndị Sadusii bịara ka ha nwaa Jizọs ọnwụnwa. Ha gwara ya ka o gosi ha ihe ịrịba ama si n’eluigwe.

Ma, Jizọs ma ihe ha bu n’obi. N’ihi ya, ọ gwara ha, sị: “Mgbe o ruru uhuruchi, unu na-asịkarị, ‘Ihu ígwé ga-adị mma, n’ihi na elu na-acha ọbara ọbara’; n’ụtụtụ, unu na-asịkwa, ‘Taa, mmiri ga-eruju n’ígwé, oyi ga-adịkwa, n’ihi na elu na-acha ọbara ọbara, ma gbaa ọchịchịrị.’ Unu maara otú e si akọwa ihu ígwé, ma unu apụghị ịkọwa ihe ịrịba ama nke oge ndị a.” (Matiu 16:2, 3) Jizọs gwaziri ha na o nweghị ihe ịrịba ama ọzọ a ga-egosi ha ma e wezụga nke Jona.

Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya banyeziri n’ụgbọ gawa Betseida nke dị nso n’ebe ugwu Osimiri Galili. Ka ha na-aga, ndị na-eso ụzọ ya chọpụtara na ha chefuru iweta achịcha ga-ezuru ha. Naanị otu ogbe achịcha ka ha ji. N’ihi ọnwụnwa ahụ ndị Farisii na ndị Sadusii na-akwado Herọd nwara Jizọs, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ghewenụ anya unu oghe, lezienụ anya maka ihe iko achịcha nke ndị Farisii nakwa maka ihe iko achịcha nke Herọd.” Ma, ndị na-eso ụzọ ya aghọtaghị ihe okwu ya pụtara. Ha chere na ọ na-ekwu gbasara achịcha ha chefuru iweta. Jizọs chọpụtara na ha aghọtaghị ihe o kwuru. Ọ gwaziri ha, sị: “Gịnị mere unu ji arụ ụka maka na unu ejighị achịcha?”—Mak 8:15-17.

Ọ dịbeghị anya Jizọs nyere ọtụtụ puku mmadụ achịcha, ha erie. Ihe a kwesịrị ime ka ndị na-eso ụzọ ya mata na ọ gaghị abụ gbasara achịcha nkịtị ka Jizọs na-ekwu. Jizọs jụrụ ha, sị: “Ùnu echetaghị, mgbe m nyawaara puku ndị ikom ise ahụ ogbe achịcha ise ahụ, nkata ole ka unu tụtụjuru achịcha e rifọrọ erifọ?” Ha asị ya: “Iri na abụọ.” Jizọs jụkwara ha, sị: “Mgbe m nyawaara puku ndị ikom anọ ahụ ogbe achịcha asaa ahụ, nkata ole ka unu tụtụjuru achịcha e rifọrọ erifọ?” Ha asị ya: “Asaa.”—Mak 8:18-20.

Jizọs jụziri ha, sị: “Olee otú unu si ghara ịghọta na ọ bụghị achịcha ka m gwara unu banyere ya?” Ọ gwaziri ha, sị: “Lezienụ anya maka ihe iko achịcha nke ndị Farisii na ndị Sadusii.”—Matiu 16:11.

N’ikpeazụ, ha ghọtara ihe ọ na-ekwu. Ihe iko achịcha bụ ihe a na-eji eme ka achịcha koo. Jizọs ji ya na-akọwa ihe na-emerụ mmadụ. Ọ na-adọ ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị ka ha kpachara anya “maka ozizi ndị Farisii na ndị Sadusii,” nke na-emerụ mmadụ.—Matiu 16:12.