IHE ỌMỤMỤ NKE 20
Mee Ka Okwu Mmechi Gị Kpoo Ọkụ
Ekliziastis 12:13, 14
IHE Ị GA-EME: I mechiwe okwu gị, gbaa ndị na-ege ntị ume ka ha jisie ike mee ihe ha mụtara.
OTÚ Ị GA-ESI EME YA:
-
I mechiwe okwu gị, ka ihe ị ga-ekwu daba n’isiokwu ihe omume gị. Kwughachi isiokwu gị na ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ n’okwu gị.
-
Gbaa ndị na-ege gị ntị ume. Gwa ndị na-ege gị ntị ihe ha kwesịrị ime, gwakwa ha ezigbo ihe mere ha ji kwesị ime ya. Jiri ịnụ ọkụ n’obi kwuo okwu otú gosiri na ihe ị na-ekwu doro gị anya nakwa na ọ dị mkpa.
-
Ka ihe ị ga-ekwu ma i mechiwe okwu gị dị nkenke ma dị mfe nghọta. Ekwula ihe ọhụrụ ná mmechi okwu gị. Kwuo okwu ole na ole iji gbaa ndị ị na-agwa okwu ume ka ha mee ihe ha mụtara.