IHE ODIDE NTỤKWASỊ
1914—Afọ Dị Ịrịba Ama n’Amụma Bible
ỌTỤTỤ iri afọ tupu afọ 1914, ndị mmụta Bible kpọsara na ihe ndị dị ịrịba ama ga-eme n’afọ ahụ. Gịnị bụ ihe omume ndị a, ihe ndị dịkwa aṅaa na-egosi na 1914 bụ afọ dị mkpa otú ahụ?
Dị ka e dekọrọ na Luk 21:24, Jizọs kwuru, sị: “Ndị mba ọzọ ga-azọ Jeruselem ụkwụ, ruo mgbe oge a kara aka nke ndị mba ọzọ [“oge ndị Jentaịl,” King James Version] ga-ezu.” Tupu mgbe ahụ, Jeruselem bụ isi obodo mba ndị Juu—ebe ndị eze sitere n’eriri Eze Devid si na-achị. (Abụ Ọma 48:1, 2) Otú ọ dị, ndị eze ndị a pụrụ iche n’ebe ndị ndú nke mba dị iche iche nọ. Ha nọkwasịrị “n’ocheeze Jehova” dị ka ndị nnọchianya Chineke n’onwe ya. (1 Ihe E Mere 29:23) Jeruselem si otú a bụrụ ihe nnọchianya nke ọchịchị Jehova.
Otú ọ dị, ọ̀ bụ n’ụzọ dị aṅaa ka ‘ndị mba ọzọ si malite ịzọ ọchịchị Chineke ụkwụ,’ oleekwa mgbe ha mere otú ahụ? Nke a mere n’afọ 607 T.O.A. mgbe ndị Babilọn meriri Jeruselem. O nweghịzi onye nọ ‘n’ocheeze Jehova,’ a kwụsịtụkwara inwe ndị eze sitere n’eriri Devid. (2 Ndị Eze 25:1-26) ‘Ịzọ ụkwụ’ a ọ̀ ga-adịru mgbe ebighị ebi? Ee e, n’ihi na amụma Ezikiel kwuru banyere eze ikpeazụ nke Jeruselem, bụ́ Zedekaịa, sị: “Wezụga ákwà nkuku isi ahụ, bupụ okpueze ahụ: . . . ọ gaghị adị ruo mgbe ọ ga-abịa, bụ́ onye o ruru aka; M ga-ewerekwa ya nye ya.” (Ezikiel 21:26, 27) Onye okpueze Devid “ruru aka” bụ Jizọs Kraịst. (Luk 1:32, 33) N’ihi ya, ‘ịzọ ụkwụ’ ahụ ga-akwụsị mgbe Jizọs ghọrọ Eze.
Olee mgbe ihe ahụ dị ịrịba ama ga-eme? Jizọs gosiri na ndị Jentaịl ga-achị ruo oge a kapịrị ọnụ. Ihe e dekọrọ na Daniel isi nke 4 nwere ihe ndị na-enye aka ịgụkọ ogologo oge nke ahụ ga-ewe. Ọ na-akọ banyere nrọ amụma nke Eze Nebukadneza nke Babilọn rọrọ. Ọ hụrụ nnukwute osisi e gbuturu egbutu. Úkwù ya enweghị ike ito n’ihi na e ji ígwè na ọla kee ya agbụ. Otu mmụọ ozi kwuru, sị: ‘Ka oge asaa gabigakwa ya n’isi.’—Daniel 4:10-16.
N’ime Bible, mgbe ụfọdụ a na-eji osisi edochi anya ọchịchị. (Ezikiel 17:22-24; 31:2-5) N’ihi ya, mgbutu e gbuturu osisi ihe atụ ahụ na-egosi otú a ga-esi kwụsịtụ ịchịisi Chineke, bụ́ nke ndị eze nọ na Jeruselem nọchiri anya ya. Otú ọ dị, ọhụụ ahụ gosiri na ‘ụkwụ a a ga-azọ Jeruselem’ agaghị adịte aka—“oge asaa.” Olee otú oge ahụ hà n’ogologo?
Mkpughe 12:6, 14 na-egosi na oge atọ na ọkara hà ka “otu puku ụbọchị na narị ụbọchị abụọ na iri isii.” Ya mere, “oge asaa” ga-aka nke ahụ okpukpu abụọ, ma ọ bụ ọ ga-eru ụbọchị 2,520. Ma ndị Jentaịl akwụsịghị ‘ịzọ’ ịchịisi Chineke ụkwụ nanị n’ụbọchị 2,520 nkịtị ka Jeruselem dasịrị. N’ihi ya, o doro anya na amụma a na-ekwu banyere oge ka nnọọ nke ahụ ogologo. Dabere n’ihe e dere n’Ọnụ Ọgụgụ 14:34 nakwa n’Ezikiel 4:6, bụ́ ndị na-ekwu banyere “otu ụbọchị otu afọ,” “oge asaa” ahụ ga-eru afọ 2,520.
Afọ 2,520 malitere n’October 607 T.O.A., mgbe ndị Babilọn meriri Jeruselem, e wepụkwara eze sitere n’eriri Devid n’ocheeze ya. Oge ahụ kwụsịrị n’October 1914. N’oge ahụ, “oge a kara aka nke ndị mba ọzọ” bịara ná njedebe, e chikwara Jizọs Kraịst echichi dị ka Eze eluigwe nke Chineke. *—Abụ Ọma 2:1-6; Daniel 7:13, 14.
Matiu 24:3-8; Luk 21:11) Ihe omume ndị dị otú ahụ na-agba nnọọ akaebe na afọ 1914 bụ oge a mụrụ Alaeze eluigwe nke Chineke n’ezie, ọ bụkwa oge ‘ụbọchị ikpeazụ’ nke ajọ usoro ihe dị ugbu a malitere.—2 Timoti 3:1-5.
Dị ka Jizọs buru n’amụma, “ọnụnọ” ya dị ka Eze eluigwe abụwo nke ihe ndị dị ịrịba ama na-eme n’ụwa kara akara—agha, ụkọ nri, ala ọma jijiji, na ọrịa na-efe efe. (^ par. 9 Site n’October 607 T.O.A. ruo n’October 1 T.O.A. dị afọ 606. Site n’October 1 T.O.A. ruo n’October 1914 nke O.A. dị afọ 1,914. Ọ bụrụ na anyị agbakọta afọ 606 na afọ 1,914, anyị ga-enweta afọ 2,520. Iji nweta ihe ọmụma banyere ọdịda Jeruselem dara na 607 T.O.A., lee akwụkwọ bụ́ Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel! peeji nke 94-97, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.