Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 26

Chineke nke “Dị Njikere Ịgbaghara Mmehie”

Chineke nke “Dị Njikere Ịgbaghara Mmehie”

1-3. (a) Ibu arọ dị aṅaa ka ọbụ abụ bụ́ Devid buru, oleekwa otú o si nweta nkasi obi maka ihe na-enye ya nsogbu n’obi? (b) Mgbe anyị mere mmehie, ibu arọ dị aṅaa ka anyị pụrụ iburu n’ihi ya, ma gịnị ka Jehova na-emesi anyị obi ike banyere ya?

“AJỌ omume m nile agabigawo n’elu isi m,” ka ọbụ abụ bụ́ Devid dere. “Dị ka ibu arọ ha dịkara m arọ. Ahụ́ m esinwụwo, e gwepịawokwa m nke ukwuu.” (Abụ Ọma 38:4, 8) Devid maara otú akọ na uche ịma mmadụ ikpe pụrụ isi bụrụ nnọọ ibu arọ. Ma o nwetara nkasi obi maka ihe nyere ya nsogbu n’obi. Ọ ghọtara na ọ bụ ezie na Jehova kpọrọ mmehie asị, Ọ dịghị akpọ onye ahụ mere mmehie asị ma ọ bụrụ na o chegharịa n’ezie ma jụ ụzọ mmehie ya. N’inwe okwukwe zuru ezu ná njikere Jehova dị imere ndị nwere nchegharị ebere, Devid kwuru, sị: “Gị onwe gị, Onyenwe anyị . . . bụkwa onye [“dị njikere ịgbaghara,” NW] mmehie.”—Abụ Ọma 86:5.

2 Mgbe anyị mere mmehie, akọ na uche anyị pụkwara ịdị na-enye anyị nsogbu. Mmetụta dị otú a nke ịkwa ụta bara uru. Ọ pụrụ ịkpali anyị ime ihe ndị dị mkpa iji dozie ihe ndị anyị mehiere. Otú ọ dị, e nwere ihe ize ndụ nke ịghọ onye obi amamikpe rikpuru. Obi anyị nke na-ama anyị ikpe pụrụ ịnọgide na-agwa anyị na Jehova agaghị agbaghara anyị, n’agbanyeghị otú anyị nweruru nchegharị. Ọ bụrụ na anyị aghọọ ndị obi amamikpe ‘lodara,’ Setan pụrụ ịgbalị ime ka anyị daa mbà, ka anyị na-eche na Jehova na-ele anyị anya dị ka ndị na-abaghị uru, ndị na-erughị eru ijere ya ozi.—2 Ndị Kọrint 2:5-11.

3 Ọ̀ bụ otú ahụ ka Jehova si ele ihe anya? Ọ dịghị ma ọlị! Mgbaghara mmehie bụ otu akụkụ nke oké ịhụnanya Jehova. N’ime Okwu ya, ọ na-emesi anyị obi ike na mgbe anyị gosipụtara ezi nchegharị nke sitere n’obi, ọ dị njikere ịgbaghara anyị. (Ilu 28:13) Iji zere mgbaghara Jehova iyi anyị mgbe ọ bụla ka ihe a na-apụghị inweta enweta, ka anyị nyochaa ihe mere o ji na-agbaghara mmehie na otú o si na-agbaghara mmehie.

Ihe Mere Jehova Ji “Dị Njikere Ịgbaghara Mmehie”

4. Gịnị ka Jehova na-echeta banyere ọdịdị anyị, oleekwa otú nke a si emetụta ụzọ o si na-emeso anyị?

4 Jehova maara adịghị ike anyị. Abụ Ọma 103:14 na-ekwu, sị: “Ya onwe ya maara otú a kpụworo anyị; Ọ na-echeta na ájá ka anyị bụ.” Ọ dịghị echefu na anyị bụ ndị e ji ájá kpụọ, ndị nwere amaghị eme, ma ọ bụ adịghị ike dị iche iche, n’ihi ezughị okè. Okwu ahụ bụ́ na ọ maara “otú a kpụworo anyị” na-echetara anyị na Bible ji Jehova tụnyere ọkpụite ma jiri anyị tụnyere arịa ndị o ji ụrọ na-akpụ. * (Jeremaịa 18:2-6) Ọkpụite Ukwu ahụ na-emeso anyị dị ka adịghị ike nke ọdịdị ime mmehie anyị si dị, daberekwa n’otú anyị si na-agbaso ma ọ bụ ghara ịdị na-agbaso nduzi ya.

5. Olee otú akwụkwọ Ndị Rom si kọwaa aka siri ike mmehie ji anyị?

5 Jehova na-aghọta otú mmehie nweruru ike. Okwu ya na-akọwa mmehie dị ka ikike siri ike nke ji mmadụ aka n’ụzọ pụrụ ịkpata ọnwụ. Olee nnọọ otú mmehie jisiruru ụmụ mmadụ aka ike? N’akwụkwọ Ndị Rom, Pọl onyeozi na-akọwa, sị: Anyị nọ “n’okpuru mmehie,” otú ndị agha si anọ n’okpuru ọchịagha ha (Ndị Rom 3:9); mmehie ‘achịwo’ ihe a kpọrọ mmadụ dị ka eze (Ndị Rom 5:21); o “bi” ebi n’ime anyị (Ndị Rom 7:17, 20); “iwu” ya na-arụ ọrụ mgbe nile n’ime anyị, ya bụ, na-achọ ịchịkwa ụzọ ndụ anyị. (Ndị Rom 7:23, 25) Lee otú mmehie si jisie anụ ahụ́ anyị na-ezughị okè aka ike!—Ndị Rom 7:21, 24.

6, 7. (a) Olee otú Jehova si ele ndị ji obi ịkwa ụta na-achọ ebere ya anya? (b) N’ihi gịnị ka anyị na-ekwesịghị iji jiri ebere Chineke na-eme ihe n’ụzọ ejighị ihe kpọrọ ihe?

6 N’ihi ya, Jehova maara na nrubeisi zuru okè agaghị ekwe anyị omume, n’agbanyeghị otú ọ pụrụ isi gụsie anyị agụụ ike irubere ya isi. O ji ịhụnanya na-emesi anyị obi ike na mgbe anyị ji obi ịkwa ụta chọọ ebere ya, ọ ga-agbaghara anyị. Abụ Ọma 51:17 na-ekwu, sị: “Àjà nile nke Chineke bụ mmụọ tiwara etiwa: obi tiwara etiwa na nke e gwepịara egwepịa, Chineke, Ị dịghị eleda ya anya.” Ọ dịghị mgbe Jehova ga-ajụ, ma ọ bụ gbakụta, obi ‘tiwara etiwa na nke e gwepịara egwepịa’ n’ihi obi amamikpe azụ.

7 Otú ọ dị, nke a ọ̀ pụtara na anyị pụrụ iji ebere Chineke na-eme ihe n’ụzọ ejighị ihe kpọrọ ihe, jiri ọdịdị ime mmehie anyị na-emere ihe ngọpụ iji nọgide na-eme mmehie? Ọ dịghị ma ọlị! Jehova adịghị eme ihe dabere nanị ná mmetụta uche efu. Ebere ya nwere ókè. Ọ gaghị agbaghara ha ma ọlị, bụ́ ndị ji ịkpọ obi nkụ mara ụma na-eme mmehie n’egosighị nchegharị ọ bụla. (Ndị Hibru 10:26) N’aka nke ọzọ, mgbe ọ hụrụ obi na-akwa ụta, ọ na-adị njikere ịgbaghara. Ugbu a, ka anyị tụlee ụfọdụ n’ime okwu ndị na-enye nkọwa doro anya bụ́ ndị e ji mee ihe n’ime Bible iji kọwaa akụkụ a magburu onwe ya nke ịhụnanya Jehova.

Ruo Ókè Ha Aṅaa Ka Jehova Na-agbaghara Mmehie Kpam Kpam?

8. Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, gịnị ka Jehova na-eme mgbe ọ gbaghaara anyị mmehie anyị, obi ike dịkwa aṅaa ka nke a na-enye anyị?

8 Devid, bụ́ onye nwere nchegharị kwuru, sị: “Ana m emerị ka Ị mara mmehie m, ekpuchighịkwa m ajọ omume m: . . . Gị onwe gị [gbaghaara, NW] ajọ omume nke mmehie m.” (Abụ Ọma 32:5, ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Okwu bụ́ “gbaghaara” na-asụgharị okwu Hibru nke pụtara n’ụzọ bụ́ isi “bulie” ma ọ bụ “buru.” Otú e si jiri ya mee ihe n’ebe a na-egosi iwezụga “obi amamikpe, mmehie, njehie.” Ya mere, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, Jehova buuru mmehie Devid bupụ ha. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na nke a belatara obi amamikpe nke Devid nọworo na-enwe. (Abụ Ọma 32:3) Anyị onwe anyị kwa pụrụ inwe obi ike zuru ezu n’ebe Chineke nọ, bụ́ onye na-ebupụ mmehie nke ndị na-achọ mgbaghara ya ná ndabere nke okwukwe ha nwere n’àjà mgbapụta Jizọs.—Matiu 20:28.

9. Ruo n’ókè ha aṅaa ka Jehova na-eme ka mmehie anyị dị anya site n’ebe anyị nọ?

9 Devid ji okwu ọzọ na-enye nkọwa doro anya kọwaa mgbaghara Jehova: “Dị ka ọwụwa anyanwụ si dị anya site n’ọdịda anyanwụ, otú ahụ ka O meworo ka njehie anyị dị anya n’ebe anyị nọ.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche; Abụ Ọma 103:12, The Amplified Bible) Olee otú ọwụwa anyanwụ dịruru n’anya site n’ọdịda anyanwụ? N’otu echiche, ọwụwa anyanwụ na-abụkarị ebe kasị dị anya a pụrụ ichetụ n’echiche site n’ọdịda anyanwụ; ọ dịghị mgbe ha abụọ pụrụ izute. Otu ọkà mmụta na-ekwu na okwu a pụtara “ịdị anya ruo n’ókè o kwere mee; ịdị anya ruo n’ókè anyị pụrụ ichetụ n’echiche.” Ihe ndị Devid kwuru site n’ike mmụọ nsọ na-agwa anyị na mgbe Jehova gbaghaara anyị, ọ na-eme ka mmehie anyị dị anya ruo n’ókè anyị pụrụ ichetụ n’echiche site n’ebe anyị nọ.

‘A ga-eme ka mmehie unu dị ọcha dị ka snow’

10. Mgbe Jehova gbaghaara anyị mmehie anyị, n’ihi gịnị ka anyị na-ekwesịghị iji na-eche na anyị ga-ebu ntụpọ nke mmehie ndị dị otú ahụ ogologo ndụ anyị nile?

10 Ọ̀ dịtụwo mgbe ị gbalịrị ịsapụ ntụpọ dị n’uwe nwere àgwà na-enwupụ enwupụ? Ma eleghị anya, n’agbanyeghị mgbalị nile i mere, a ka na-ahụ ntụpọ ahụ anya. Rịba ama otú Jehova si kọwaa ókè ọ na-agbaghararu mmehie: “Ọ bụrụ na mmehie unu adị ka uwe uhie, ọ bụ dị ka snow ka ha ga-adị ọcha; ọ bụrụ na ha achaa uhie uhie dị ka ogho uhie, ọ bụ dị ka ajị ọcha ka ha ga-adị.” (Aịsaịa 1:18, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Okwu ahụ bụ́ “uhie” na-egosi àgwà ọbara ọbara. * “Uhie” bụ otu n’ime àgwà ndị guru egu ndị na-adị n’ákwà e sijiri esiji. (Nehum 2:3) Anyị apụghị ma ọlị ihichapụ ntụpọ nke mmehie site ná mgbalị anyị. Ma Jehova pụrụ iwere mmehie ndị dị ka uhie mee ka ha dị ọcha ka snow ma ọ bụ ogho a na-esijighị esiji. Mgbe Jehova gbaghaara anyị mmehie anyị, ọ dịghị anyị mkpa ichewe na anyị ga-ebu ntụpọ nke mmehie dị otú ahụ ogologo ndụ anyị nile.

11. N’echiche dị aṅaa ka Jehova na-atụfu mmehie anyị n’azụ ya?

11 N’abụ ekele na-akpali akpali nke Hezekaịa dere mgbe a napụtara ya n’ọrịa nke gaara igbu ya, ọ gwara Jehova, sị: “Ị tụfuru mmehie m nile n’azụ Gị.” (Aịsaịa 38:17, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.) A kọwara Jehova n’ebe a dị ka onye na-ewere mmehie nke onye mmehie nwere nchegharị tụfuo ha n’azụ Ya, ebe Ọ na-agaghị ahụkwa ha ma Ọ bụ mara banyere ha. Dị ka otu akwụkwọ na-ekwu, a pụrụ isi otú a kwuo echiche a na-enye n’ebe a: “I mewo ka [mmehie m] dị ka à ga-asị na e mebeghị ha.” Ọ̀ bụ na nke ahụ adịghị emesi obi ike?

12. Olee otú Maịka onye amụma si gosi na mgbe Jehova gbaghaara, Ọ na-ewepụ mmehie anyị kpam kpam?

12 N’otu nkwa mweghachi, Maịka onye amụma kwupụtara nkwenye o nwere na Jehova ga-agbaghara ndị ya nwere nchegharị mmehie ha: “Ònye bụ Chineke dị ka Gị, . . . na-agabigakwa njehie nke dịịrị ndị ala nketa Ya fọdụrụ? . . . Ị ga-atụbakwa mmehie nile ha n’ebe dịkarịsịrị omimi nke oké osimiri.” (Maịka 7:18, 19, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Cheedị echiche ihe okwu ndị ahụ pụtara nye ndị ahụ biri ndụ n’oge e dere Bible. Ọ̀ dị otú ọ bụla ọ pụrụ isi kwe omume ịgụpụta ihe a tụbara “n’ebe dịkarịsịrị omimi nke oké osimiri”? Ya mere, ihe Maịka kwuru na-egosi na mgbe Jehova gbaghaara, ọ na-ewepụ mmehie anyị kpam kpam.

13. Gịnị ka okwu Jizọs bụ́ “Gbaghakwara anyị ụgwọ ndị anyị ji” pụtara?

13 Jizọs ji mmekọrịta na-adị n’etiti ndị e ji ụgwọ na ndị ji ha ụgwọ mee ihe atụ iji gosi mgbaghara Jehova. Jizọs gbara anyị ume ka anyị na-ekpe ekpere, sị: “Gbagharakwa anyị ụgwọ ndị anyị ji.” (Matiu 6:12) Jizọs si otú a jiri mmehie tụnyere ụgwọ. (Luk 11:4) Mgbe anyị mehiere, anyị na-aghọ ‘ndị ji Jehova ụgwọ.’ Banyere ihe ngwaa Grik a sụgharịrị ‘gbaghara’ pụtara, otu akwụkwọ e ji eme nnyocha na-ekwu, sị: “Ilefuru ụgwọ anya, ịhapụ ya, n’agbaghị ya.” N’otu echiche, mgbe Jehova gbaghaara anyị, ọ na-akagbu ụgwọ a gaara agụrụ anyị na anyị ji. Ya mere, ndị mmehie nwere nchegharị pụrụ inwe nkasi obi. Ọ dịghị mgbe Jehova ga-agba anyị ụgwọ ọ kagbuworo!—Abụ Ọma 32:1, 2.

14. Okwu bụ́ “ka e wee hichapụ mmehie unu” na-echetara anyị gịnị?

14 A kọwakwuru mgbaghara Jehova n’Ọrụ 3:19: “Ya mere, chegharịanụ, chigharịakwanụ ka e wee hichapụ mmehie unu.” Okwu ahụ bụ́ “hichapụ” bụ nsụgharị nke ngwaa Grik nke pụrụ ịpụta “ihichapụ, . . . ịkagbu ma ọ bụ ibibi.” Dị ka ụfọdụ ndị ọkà mmụta si kwuo, echiche ọ na-enye bụ nke ihicha ihe e ji aka dee. Olee otú nke a si ekwe omume? Ihe a na-eji eme ink ndị a na-ejikarị eme ihe n’oge ochie bụ carbon, mgbá, na mmiri a gwakọtara ọnụ. Ngwa ngwa e ji ink dị otú ahụ desịa ihe, mmadụ pụrụ iji ogbo dị mmiri hichaa ihe odide ahụ. Nke a bụ ihe atụ mara mma nke mgbaghara Jehova. Mgbe ọ gbaghaara anyị mmehie anyị, ọ na-adị ka o ji ogbo hichaa ha.

Jehova chọrọ ka anyị mara na ọ ‘dị njikere ịgbaghara mmehie’

15. Gịnị ka Jehova chọrọ ka anyị mara banyere ya?

15 Mgbe anyị tụgharịrị uche n’ihe atụ ndị a dịgasị iche iche, ọ̀ bụ na o doghị anya na Jehova chọrọ ka anyị mara na ya dị njikere n’ezie ịgbaghara anyị mmehie anyị ma ọ bụrụhaala na ọ chọpụta na anyị nwere nchegharị n’ezie? Ọ dịghị mkpa ka anyị na-atụ egwu na ọ ga na-echeta mmehie ndị ahụ ma jiri ha taa anyị ahụhụ n’ọdịnihu. Ihe ọzọ Bible na-ekpughe banyere ebere dị ukwuu nke Jehova na-egosipụta nke a: Mgbe ọ gbaghaara, ọ na-echezọ ya!

“M Gaghị Echetakwa Mmehie Ha Ọzọ”

16, 17. Mgbe Bible kwuru na Jehova na-echezọ mmehie anyị, gịnị ka ọ pụtara, n’ihi gịnịkwa ka i ji zaa otú ahụ?

16 Jehova kwere nkwa banyere ndị nọ n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, sị: “M ga-agbaghara ajọ omume ha, M gaghị echetakwa mmehie ha ọzọ.” (Jeremaịa 31:34) Nke a ọ̀ pụtara na mgbe Jehova gbaghaara mmehie, na o nwekwaghị ike icheta mmehie? Nke ahụ abụghị ihe ọ pụtara ma ọlị. Bible na-agwa anyị banyere mmehie nke ọtụtụ ndị Jehova gbaghaara mmehie ha mere, gụnyere Devid. (2 Samuel 11:1-17; 12:13) O doro anya na Jehova ka maara njehie nile ha jehiere. E chekwawo ihe ndekọ banyere mmehie ha, nakwa banyere nchegharị ha na mgbaghara Chineke gbaghaara ha, maka abamuru anyị. (Ndị Rom 15:4) Ya bụrụ otú ahụ, gịnịzi ka Bible na-ekwu mgbe ọ sịrị na Jehova adịghị ‘echeta’ mmehie nke ndị ọ gbaghaara mmehie ha?

17 Ngwaa Hibru a sụgharịrị ‘m ga-echeta’ na-agụnye ihe karịrị nanị icheta ihe gara aga. Akwụkwọ bụ́ Theological Wordbook of the Old Testament na-ekwu na ọ na-agụnye “echiche ndị ọzọ nke ime ihe kwesịrị ekwesị.” Ya mere, n’echiche a, ‘icheta’ mmehie na-agụnye ime ihe megide ndị mmehie. (Hosea 9:9) Ma mgbe Chineke sịrị, “M gaghị echetakwa mmehie ha ọzọ,” ọ na-emesi anyị obi ike na ozugbo ọ gbaghaara ndị mmehie nwere nchegharị, ọ gaghị eme ha ihe ọ bụla n’ọdịnihu n’ihi mmehie ndị ahụ. (Ezikiel 18:21, 22) N’ụzọ dị otú a, Jehova na-echezọ n’echiche bụ́ na ọ dịghị ewelite mmehie anyị ugboro ugboro iji boo anyị ebubo ma ọ bụ taa anyị ahụhụ ugboro ugboro. Ọ́ bụghị ihe nkasi obi ịmara na Chineke anyị na-agbaghara ma na-echezọ?

Gịnị Banyere Ihe Ndị Na-esi na Ya Apụta?

18. N’ihi gịnị ka mgbaghara mmehie na-ejighị pụta na a ga-echebe onye mmehie nwere nchegharị pụọ n’ihe nile pụrụ isi n’ụzọ ọjọọ ya pụta?

18 Njikere Jehova dị ịgbaghara mmehie ọ̀ pụtara na a ga-echebe onye mmehie nwere nchegharị pụọ n’ihe nile pụrụ isi n’ụzọ ọjọọ ya pụta? Ọ dịghị ma ọlị. Anyị apụghị ime mmehie n’anataghị ntaramahụhụ. Pọl dere, sị: “Mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha, nke a ka ọ ga-aghọrọkwa.” (Ndị Galeshia 6:7) Anyị pụrụ iche ihe ụfọdụ si n’omume anyị pụta ihu. Nke a apụtaghị na mgbe Jehova gbagharasịịrị anyị, na ọ na-eme ka ihe ọjọọ dakwasị anyị. Mgbe nsogbu bilitere, Onye Kraịst ekwesịghị iche, sị, ‘Ikekwe Jehova na-ata m ahụhụ n’ihi mmehie ndị m mere n’oge gara aga.’ (Jems 1:13) N’aka nke ọzọ, Jehova adịghị echebe anyị pụọ n’ihe nile pụrụ isi n’omume ọjọọ anyị pụta. Ịgba alụkwaghịm, afọ ime a na-achọghị, ọrịa a na-ebute site ná mmekọahụ, abụkwaghị onye a pụrụ ịtụkwasị obi ma ọ bụ onye a na-akwanyere ùgwù—ihe ndị a nile pụrụ ịbụ ihe ọjọọ, ndị a na-apụghị izere ezere, ndị na-esi ná mmehie apụta. Cheta na ọbụna mgbe ọ gbagharasịịrị Devid mmehie ya n’okwu banyere Bat-sheba na Yuraịa, Jehova echebeghị Devid pụọ n’ajọ ọdachi ndị si na ya pụta.—2 Samuel 12:9-14.

19-21. (a) Olee otú iwu ahụ e dekọrọ na Levitikọs 6:1-7 si baara ma onye e mejọrọ ma onye mejọrọ emejọ uru? (b) Ọ bụrụ na anyị mejọrọ ndị ọzọ site ná mmehie anyị, obi na-adị Jehova ụtọ mgbe anyị mere gịnị?

19 Ihe ndị ọzọ pụrụ isi ná mmehie anyị pụta, karịsịa ma ọ bụrụ na ihe anyị mere mejọrọ ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, tụlee ihe ndekọ dị na Levitikọs isi 6. N’ebe a, Iwu Mozis na-ekwu banyere ọnọdụ ebe mmadụ mere mmehie dị oké njọ site n’iweghara ihe onwunwe nke onye Izrel ibe ya n’ike site n’izu ohi, ịpụnara ya apụnara, ma ọ bụ ịnara ya site n’igwu wayo. Mgbe ahụ, onye ahụ mere mmehie ekwuo na ikpe amaghị ya, ọbụna nwee anyaike ịṅụ iyi ụgha. Ọ bụ okwu otu onye megide nke onye ọzọ. Otú ọ dị, akọ na uche onye mmehie ahụ emesịa maa ya ikpe, o wee kwupụta mmehie ya. Iji nweta mgbaghara Chineke, ọ ghaghị ime ihe atọ ọzọ: iweghachi ihe o zuru, ịkwụ onye o zuru ihe ya nhá ga-abụ otu ụzọ n’ụzọ ise nke ọnụ ahịa ihe ndị o zuru, ọ ga-ewetakwa ebulu iji chụọ àjà ikpe ọmụma. Mgbe ahụ, iwu ahụ na-ekwu, sị: “Onye nchụàjà ga-ekpuchikwara ya mmehie ya n’ihu Jehova, a ga-agbagharakwa ya ya.”—Levitikọs 6:1-7.

20 Iwu a bụ ndokwa obi ebere nke Chineke mere. Ọ baara onye e zuru ihe ya uru, bụ́ onye e weghachiiri ihe ya, onye ihe ịrụ ụka na-adịghịkwa ya na ọ ga-enwe nnọọ obi iru ala mgbe onye mmehie ahụ mesịrị kweta mmehie ya. N’otu oge ahụ, iwu ahụ bakwaara onye ahụ uru, bụ́ onye akọ na uche ya mesịrị kpalie ya ikweta mmehie ya ma mezie mmejọ ya. N’ezie, ọ bụrụ na ọ jụ ime otú ahụ, Chineke agaghị agbaghara ya mmehie ya.

21 Ọ bụ ezie na anyị anọghị n’okpuru Iwu Mozis, Iwu ahụ na-eme ka anyị ghọta uche Jehova, gụnyere ihe bụ́ echiche ya banyere mgbaghara mmehie. (Ndị Kọlọsi 2:13, 14) Ọ bụrụ na anyị emejọwo ndị ọzọ site ná mmehie anyị, obi na-adị Chineke ụtọ mgbe anyị mere ihe anyị nwere ike ime iji mezie mmejọ ahụ. (Matiu 5:23, 24) Nke a pụrụ ịgụnye anyị ikweta mmehie anyị, ikweta na ikpe mara anyị, na ọbụna ịrịọ onye anyị mejọrọ mgbaghara. Mgbe ahụ, anyị pụrụ ịrịọ Jehova arịrịọ dabere n’àjà Jizọs ma nweta mmesi obi ike na Chineke agbagharawo anyị.—Ndị Hibru 10:21, 22.

22. Gịnị ka ya na mgbaghara Jehova pụrụ iso?

22 Dị ka nne ma ọ bụ nna ọ bụla nke na-ahụ n’anya, Jehova pụrụ inyetụ ịdọ aka ná ntị mgbe ọ na-agbaghara. (Ilu 3:11, 12) A pụrụ ịnapụ Onye Kraịst nwere nchegharị ihe ùgwù ije ozi ya dị ka okenye, ohu na-eje ozi, ma ọ bụ onye na-ezisa ozi ọma nke nọ n’ozi oge nile. Ọ pụrụ iwute ya na ọ gaghị enwekwa ihe ùgwù ndị o ji kpọrọ ihe nke ukwuu ruo oge ụfọdụ. Otú ọ dị, ịdọ aka ná ntị dị otú ahụ apụtaghị na Jehova ajụwo ịgbaghara ya. Anyị aghaghị icheta na ịdọ aka ná ntị sitere n’aka Jehova bụ ihe àmà nke ịhụnanya o nwere n’ebe anyị nọ. Ịnakwere na itinye ya n’ọrụ bụ maka ọdịmma anyị kasịnụ.—Ndị Hibru 12:5-11.

23. N’ihi gịnị ka anyị na-ekwesịghị iji kwubie ma ọlị na Jehova apụghị imere anyị ebere, n’ihi gịnịkwa ka anyị kwesịrị iji ṅomie mgbaghara ya?

23 Lee ka o si bụrụ ihe na-enye ume ọhụrụ ịmara na Chineke anyị ‘dị njikere ịgbaghara mmehie’! N’agbanyeghị mmehie ndị anyị pụrụ imeworị, anyị ekwesịghị ikwubi ma ọlị na Jehova apụghị imere anyị ebere. Ọ bụrụ na anyị echegharịa n’ezie, mee ihe iji mezie ihe ndị ahụ anyị mehiere, kpesiekwa ekpere ike maka mgbaghara na-adabere n’ọbara Jizọs a wụsịrị, anyị pụrụ inwe obi ike zuru ezu na Jehova ga-agbaghara anyị. (1 Jọn 1:9) Ka anyị ṅomie mgbaghara ya n’ụzọ anyị si emeso ibe anyị ihe. E kwuwerị, ọ bụrụ na Jehova, bụ́ onye na-adịghị eme mmehie, pụrụ nnọọ iji ịhụnanya gbaghara anyị, ọ̀ bụ na anyị onwe anyị bụ́ ụmụ mmadụ na-eme mmehie ekwesịghị ime ihe nile anyị nwere ike ime iji na-agbaghara ibe anyị?

^ par. 4 A na-ejikwa okwu Hibru a sụgharịrị ịbụ “otú a kpụworo anyị” eme ihe n’ihe banyere arịa ndị ọkpụite ji ụrọ kpụọ.—Aịsaịa 29:16.

^ par. 10 Otu ọkà mmụta na-ekwu na uhie “bụ àgwà mmiri na-adịghị asachapụ, ma ọ bụ nke na-adịghị apụ apụ. Ma igirigi, ma mmiri ozuzo, ma ịsa ya mmiri, ma iji ya eme ihe ruo ogologo oge, adịghị nke ga-eme ka ọ pụọ.”