Ịdị Nwayọọ
Olee otú anyị si mara na Jehova dị nwayọọ?
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
1 Eze 19:12—Mgbe obi na-erughị Ịlaịja onye amụma ala maka nsogbu ọ nọ na ya, Jehova “weturu olu” gwa ya okwu
Jona 3:10–4:11—N’agbanyeghị na Jona ji iwe gwa Jehova okwu, Jehova weturu obi kụziere ya banyere imere ndị ọzọ ebere
Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị dị nwayọọ?
Ilu 15:1; Efe. 4:1-3; Taị. 3:2; Jems 3:13, 17; 1 Pita 3:15
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
Ọnụ Ọgụ. 11:26-29—Mgbe Joshụa gwara Mosis onye amụma ka ọ kwụsị ụfọdụ ndị ime ka ndị amụma, Mosis weturu obi zaghachi ya
Ikpe 8:1-3—Mgbe Gidiọn onyeikpe weturu obi gwa ụfọdụ ndị iwe ji okwu, obi ha dajụrụ