Ịchụ Mmadụ n’Ọgbakọ
Gịnị mere ndị okenye ọgbakọ ji kwesị ịmụrụ anya ka ha nwee ike ime ka ọgbakọ dịrị ọcha?
Olee otú àgwà ọjọọ otu nwanna na-akpa nwere ike isi kpaa ndị niile nọ n’ọgbakọ aka ọjọọ?
-
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
-
Josh. 7:1, 4-14, 20-26—Ndị Izrel niile tara ahụhụ n’ihi mmehie Ekan na ezinụlọ ya mere
-
Jona 1:1-16—Ọ fọrọ obere ka ndị niile ha na Jona nọ n’ụgbọ mmiri nwụchaa n’ihi na o nupụụrụ Jehova isi
-
Olee ụdị àgwà onye nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst na-ekwesịghị ịna-akpa?
Rom 16:17, 18; 1 Kọr. 5:11; 1 Tim. 1:20; Taị. 3:10, 11
Gụọkwa isiokwu bụ́ “Otú Ndị Kraịst Si Ebi Ndụ”
Gịnị ka e kwesịrị ime Ndị Kraịst mere baptizim ndị na-ekweghị akwụsị ime mmehie dị oké njọ?
I nwekwara ike ịgụ 1 Jọn 3:4, 6
Gịnị ka ndị okenye so na kọmitii ikpe kwesịrị ijide n’aka tupu ha ekpebie ikpe?
I nwekwara ike ịgụ Ilu 18:13; 1 Tim. 5:21
Olee otú ndị okenye si ekpebi ma mmadụ ò meela mmehie dị oké njọ, nakwa ma à ga-ehiwe kọmitii ga-eleba okwu ya anya?
Olee ihe mere e ji kwesị ịchụpụ ụfọdụ ndị n’ọgbakọ ma ọ bụkwanụ dọọ ha aka ná ntị? Oleekwa uru ọ ga-abara ọgbakọ?
Olee otú Baịbụl kwuru anyị kwesịrị isi na-emeso ndị a chụpụrụ n’ọgbakọ?
Gịnị ka a ga-eme ma onye a chụpụrụ n’ọgbakọ mechaa chegharịa?
Gụọkwa isiokwu bụ́ “Nchegharị”
Olee otú anyị niile nwere ike isi nye aka mee ka ọgbakọ na-adị ọcha?
I nwekwara ike ịgụ Diut. 13:6-11
Gịnị mere na Onye Kraịst mere mmehie dị oké njọ ekwesịghị ikpuchi ya ọ bụrụgodị na ọ na-atụ ụjọ na a ga-achụpụ ya n’ọgbakọ?
Ọma 32:1-5; Ilu 28:13; Jems 5:14, 15
Gụọkwa isiokwu bụ́ “Mmehie—Ikwupụta Mmehie”
Gịnị mere na anyị na ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ ekwesịghị ịna-akpachi anya, n’agbanyeghị na a chụpụghị ha n’ọgbakọ?
Ọ bụrụ na nwanna egwuo nwanna ibe ya wayo ma ọ bụ kwutọọ aha ya, gịnị ka onye ahụ e mejọrọ nwere ike ime? Gịnị mere ọ ga-eji mee otú ahụ?
Gịnị mere Ndị Kraịst ụkwụ siri ike n’ọgbakọ ji kwesị ịna-enye ndị na-anaghị akpa àgwà dị mma ndụmọdụ?