Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ̀ na-agụsi gị agụụ ike ịhụ mgbe Chineke ga-emere anyị ihe ndị o kwere anyị ná nkwa?

NKEBI NKE 7

Nkwa Dị Iche Iche Chineke Ga-emezu n’Alaeze Ya​—⁠Chineke Ga-eme Ihe Niile Ka Ha Dị Ọhụrụ

Nkwa Dị Iche Iche Chineke Ga-emezu n’Alaeze Ya​—⁠Chineke Ga-eme Ihe Niile Ka Ha Dị Ọhụrụ

KA E were ya na e nwere otu ụbọchị ị gara ịghọ apụl. Ka ị nọ na-aghọ ya, gị ahụ nke gbara agba chara ezigbo ọchịcha. Gị aghọrọ ya, ísì ọma ya ekuba gị n’imi. Gị ewerezie ya tinye na nkata i tinyejuru ndị ọzọ. Ị nọ na-aghọ apụl kemgbe ụtụtụ, ma ike agwụbeghị gị, ị chọrọ ịghọtakwu. Ị nọ ebe ahụ ị nọ lepụ anya, hụ mama gị na ụfọdụ ndị ikwu na ibe unu bịara inyere ya aka. Ka ha nọ na-aghọ apụl a, ha ana-akparịta ụka, na-achịkwa ọchị. Obi dị mama gị ezigbo ụtọ. Mama gị a dị ka agbọghọbịa. Gị ana-ele ya, cheta na otú a ọ dị ugbu a ka ọ dị mgbe ị ka bụ nwata ọtụtụ afọ gara aga. Gị ana-ajụ onwe gị ma onye a ọ̀ bụkwadị mama gị ahụ ị hụrụ mgbe ọ kara nká n’ụwa ochie. Ihe ọzọ gbatakwara gị n’obi bụ oge ya na ọrịa nọ na-alụ n’ụwa ochie ahụ, gị abịa jide ya aka n’aka, o teghịkwa aka ya ekubie ume. I chetakwara ákwá i bere mgbe a nọ na-eli ya. Ma, ọ bụ ya ka ị na-ahụ ka ya na ọtụtụ ndị ọzọ nọ, ahụ́ dịkwa ya ezigbo mma.

O doro anyị anya na ụdị ihe a ga-emerịrị otu ụbọchị. Olee otú anyị si mara? Anyị ma na ihe a ga-eme n’ihi na Chineke kwuru na ya ga-eme ya. Ọ na-emezukwa nkwa ọ bụla o kwere. Na nkebi nke asaa a, anyị ga-eleba anya n’otú Chineke ga-esi emezu ihe ụfọdụ o kwuru na ya ga-eme n’oge na-adịghị anya. Ọ ga-eme ihe ndị ahụ tupu a lụọ agha Amagedọn. Anyị ga-elebakwa anya n’ụfọdụ nkwa ndị magburu onwe ha Chineke ga-emezu n’Alaeze ya mgbe a lụchara agha Amagedọn. Obi ga-atọ anyị ezigbo ụtọ mgbe Alaeze Chineke ga na-achị ụwa niile ma mee ihe niile ka ha dị ọhụrụ.

NÁ NKEBI A

ISI NKE 21

Chineke Ga-eji Alaeze Ya Bibie Ndị Iro Ya

I nwere ike ijikere ugbu a maka agha Amagedọn.

ISI NKE 22

Chineke Ga-eji Alaeze Ya Mee Uche Ya n’Ụwa

Olee ihe ga-eme ka obi sie gị ike na Jehova ga-emezu nkwa niile o kwere?