ISI NKE 56
Josaya Ji Iwu Chineke Kpọrọ Ihe
Josaya ghọrọ eze Juda mgbe ọ dị afọ asatọ. N’oge ahụ, ndị Juda na-eme anwansi, na-efekwa arụsị. Mgbe Josaya dị afọ iri na isii, ọ gbalịrị mụta otú Jehova chọrọ ka e si na-efe ya. Mgbe ọ dị afọ iri abụọ, o bidoro ibibi arụsị na ebe ịchụàjà niile e nwere na Juda. Mgbe ọ gbara afọ iri abụọ na isii, o mere ka a malite ịrụzigharị ụlọ nsọ Jehova.
Nnukwu onye nchụàjà aha ya bụ Hilkaya hụrụ akwụkwọ mpịakọta e dere Iwu Jehova n’ụlọ nsọ ahụ. O nwere ike ịbụ Mosis dere akwụkwọ mpịakọta ahụ. Shefan bụ́ odeakwụkwọ eze wegaara Josaya akwụkwọ mpịakọta ahụ ma malite ịgụrụ ya ihe e dere na ya. Ihe Josaya nụrụ mere ka ọ mata na ndị obodo ya na-enupụrụ Jehova isi kemgbe ọtụtụ afọ. Eze Josaya gwara Hilkaya, sị: ‘Jehova na-ewesa anyị ezigbo iwe. Gaanụ jụọ ya ihe anyị ga-eme. Ọ ga-agwa anyị ihe anyị ga-eme.’ Jehova si n’ọnụ Họlda onye amụma nwaanyị gwa ha, sị: ‘Ndị Juda ahapụla m. Ha ga-ata ahụhụ, ma ọ gaghị abụ n’oge Josaya dị ndụ n’ihi na o wedara onwe ya ala.’
Mgbe Eze Josaya nụrụ ihe a, ọ gara n’ụlọ nsọ ma kpọkọta ndị Juda niile. Ọ gụpụtaara ha Iwu Jehova. Josaya na ndị obodo ya kweziri Jehova nkwa na ha ga-eji obi ha niile rubere ya isi.
O ruola ọtụtụ afọ ndị Juda na-emebeghị Ememme Ngabiga. Ma, mgbe Josaya gụtara n’Iwu ahụ na e kwesịrị ịna-eme ya n’afọ ọ bụla, ọ gwara ndị Juda, sị: ‘Anyị ga-emere Jehova Ememme Ngabiga.’ Josaya kwadebere ka a chụọrọ Jehova àjà, haziekwa ka e nwee ndị na-abụ abụ n’ụlọ nsọ. Ndị Juda niile meziri Ememme Ngabiga na Ememme Achịcha Na-ekoghị Eko ruo ụbọchị asaa. Malite n’oge Samuel, e metụbeghị ụdị Ememme Ngabiga a Josaya na ndị obodo ya mere. Josaya ejighị Iwu Chineke gwuo egwu. Ịmụ banyere Jehova ọ̀ na-atọ gị ụtọ?
“Okwu gị bụ ọkụ m ji ahụ ebe m na-azọnye ụkwụ, bụrụkwa ìhè nke na-enwu n’ụzọ m.”—Abụ Ọma 119:105