ISI NKE 35
Hana Kpere Ekpere Ka Ọ Mụta Nwa Nwoke
Otu onye Izrel aha ya bụ Elkena lụrụ ụmụ nwaanyị abụọ. Aha ha bụ Hana na Penina. Ma, Elkena hụrụ Hana n’anya karịa Penina. Penina na-akparị Hana mgbe niile n’ihi na ọ mụtaghị nwa, ma Penina nwere ọtụtụ ụmụ. N’afọ ọ bụla, Elkena na-akpọrọ ezinụlọ ya aga ife Chineke n’ụlọikwuu dị na Shaịlo. Otu ụbọchị ha nọ ebe ahụ, ọ chọpụtara na obi adịghị Hana, nwunye ya ọ hụrụ n’anya, mma. Ọ sịrị Hana: ‘Biko, ebezila ákwá. Anọ m ya. Ahụrụ m gị n’anya.’
Mgbe e mechara, Hana gawara n’ụlọikwuu ka o kpee ekpere naanị ya. Ọ nọ na-ebesi ákwá ike, na-arịọ Jehova ka o nyere ya aka. O kwere Jehova nkwa, sị: ‘Ọ bụrụ na i nye m nwa nwoke, m ga-enye gị ya, ọ ga-eji ndụ ya niile jeere gị ozi.’
Ịlaị, Nnukwu Onye Nchụàjà, hụrụ Hana ka egbugbere ọnụ ya na-emegharị emegharị, ya echee na mmanya na-egbu ya. Hana gwara ya, sị: ‘Onyenwe m, o nweghị mmanya na-egbu m. Enwere m ezigbo nsogbu, m na-akọrọ ya Jehova.’ Ịlaị chọpụtara na ihe yanwa kwuru adịghị mma. Ọ gwaziri Hana, sị: ‘Ka Chineke nye gị ihe ị na-achọ.’ Ihe a Ịlaị kwuru mere ka obi ruo Hana ala, ya alawa. O rughị otu
afọ, Hana amụta nwa nwoke ma gụọ ya Samuel. Olee otú i chere obi dị Hana ugbu a ọ mụtara nwa?Hana echefughị nkwa o kwere Jehova. Ozugbo Samuel tolitetụrụ, ọ kpọtara ya n’ụlọikwuu ka o jewere Jehova ozi. Ọ gwara Ịlaị, sị: ‘Lee nwa ahụ m rịọrọ Jehova ka o nye m. Enyefeela m ya Jehova, ọ ga-eji ndụ ya niile jeere ya ozi.’ Elkena na Hana na-aga eleta Samuel kwa afọ, ha na-achịtakwara ya uwe ọhụrụ na-enweghị aka. Jehova mere ka Hana mụta ụmụ nwoke atọ ọzọ na ụmụ nwaanyị abụọ.
“Na-arịọnụ, a ga-enye unu. Na-achọnụ, unu ga-achọta.”—Matiu 7:7