ISI NKE 24
Ha Emeghị Ihe Ha Kwuru
Jehova gwara Mozis, sị: ‘Bịakwute m n’ugwu. M ga-ede iwu m ná mbadamba nkume ma nye gị ya.’ Mozis rịgooro n’ugwu ahụ ma nọrọ ebe ahụ ụbọchị iri anọ ehihie na abalị. Mgbe Mozis nọ n’ugwu ahụ, Jehova dere Iwu Iri ahụ ná mbadamba nkume abụọ ma were ha nye ya.
Mgbe oge ụfọdụ gachara, ndị Izrel chere na Mozis ahapụla ha. Ha gwara Erọn, sị: ‘Anyị chọrọ onye ga na-edu anyị. Meere anyị chi.’ Erọn gwara ha, sị: ‘Nyenụ m ọlaedo unu.’ Ọ gbazere ọlaedo ndị ahụ ma jiri ha kpụọ ihe oyiyi nwa ehi. Ndị Izrel kwuru, sị: ‘Nwa ehi a bụ Chi anyị nke dupụtara anyị n’ala Ijipt.’ Ha malitere ịkpọrọ nwa ehi ọlaedo ahụ isiala, meekwara ya ememme. Ihe a ha mere, ọ̀ dị njọ? Ee, ọ dị njọ. Gịnị mere o ji dị njọ? Ọ bụ n’ihi na ha ekwela Jehova nkwa na ọ bụ naanị ya ka ha ga na-efe. Ma, ugbu a, ha emezughị nkwa ahụ ha kwere Jehova.
Jehova hụrụ ihe na-emenụ, ma gwa Mozis, sị: ‘Gbada, gakwuru ndị gị. Ha na-enupụrụ m isi ma na-efe chi ọzọ.’ Mozis si n’ugwu ahụ gbadata, o bukwa mbadamba nkume abụọ ahụ n’aka.
Ka Mozis na-abịaru nso n’ebe ndị Izrel mara ụlọikwuu, ọ nụrụ abụ ha na-abụ. Ọ hụrụ ha ka ha na-agba egwú ma na-akpọrọ nwa ehi ahụ isiala. Mozis were ezigbo iwe. Ọ tụrụ mbadamba nkume ndị ahụ n’ala, ha akụrisịa. Ọ kụriri ihe oyiyi nwa ehi ahụ ozugbo. Mozis jụziri Erọn, sị: ‘Gịnị mere i ji mee ụdị ihe a?’ Erọn gwara ya, sị: ‘Ewela iwe. Ị manụ ndị a nke ọma. Ha chọrọ chi ha ga na-efe, ọ bụ ya mere m ji tụba ọlaedo ha n’ọkụ, nwa ehi a apụta.’ Erọn ekwesịghị imere ha chi ahụ. Mozis gaghachiri n’ugwu ahụ ma rịọ Jehova ka ọ gbaghara ndị Izrel mmehie ha.
Jehova gbaghaara ndị niile ji obi ha chọọ irubere ya isi. Ị̀ hụla ihe mere ndị Izrel kwesịrị iji na-eme ihe Mozis gwara ha?
“Mgbe ọ bụla i kwere Chineke nkwa, egbula oge imezu ya, n’ihi na ihe ndị nzuzu adịghị atọ ya ụtọ. Ihe i kwere ná nkwa, mezuo ya.”—Ekliziastis 5:4