ISI NKE 14
Otu Ohu nke Rubeere Chineke Isi
Josef bụ otu n’ime ụmụ ikpeazụ Jekọb mụrụ. Ụmụnne ya ndị tọrọ ya hụrụ na nna ha hụrụ ya n’anya karịa ha. Olee otú i chere obi dị ha maka ihe a? Ha nweere Josef anyaụfụ, kpọọkwa ya asị. Josef rọrọ ụfọdụ nrọ pụrụ iche ma kọọrọ ya ụmụnne ya. Ha ghọtara na nrọ ndị ahụ pụtara na otu ụbọchị, ha ga-akpọrọ Josef isiala. Ihe a mere ka ha kpọkwuo ya asị.
Otu ụbọchị, ụmụnne Josef nọ na-azụ atụrụ n’ebe dị nso na Shikem. Jekọb zigara Josef ka ọ gaa mata ma ahụ́ ọ̀ dịkwa ha. Mgbe ha hụrụ ya n’ebe dị anya ka ọ na-abịa, ha gwara ibe ha, sị: “Lee, ọrọ nrọ abịawala. Bịanụ ka anyị gbuo ya.” Ha jidere ya ma tụba ya n’otu olulu miri emi. Ma otu n’ime ụmụnne ya aha ya bụ Juda sịrị: ‘Ka anyị ghara igbu ya. Kama, ka anyị ree ya ka ọ gaa gbawa ohu.’ N’ihi ya, ha resịrị ya ndị ahịa si Midian na-aga Ijipt. Ha rere ya mkpụrụ ego ọlaọcha iri abụọ.
Ụmụnne Josef chịịrị uwe ya, bịanye ya n’ọbara ewu ma chịgara ya nna ha. Ha gwara nna ha, sị: ‘Ihe a ọ́ bụghị uwe nwa gị?’ N’ihi ya, Jekọb chere na anụ ọhịa adọgbuola Josef. Obi gbawara ya. E nweghị onye na-akasili ya obi.
Mgbe Josef na ndị ahụ zụụrụ ya ruru Ijipt, otu onye a ma ama aha ya bụ Pọtịfa zụụrụ ya ka ọ gbawara ya ohu. Ma Jehova nọnyeere Josef. Pọtịfa chọpụtara na Josef na-arụsi ọrụ ike nakwa na ọ bụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi. Obere oge, Pọtịfa mere ya onye na-elekọta ihe niile o nwere.
Nwunye Pọtịfa hụrụ na Josef mara mma ma gbasie ike. Kwa ụbọchị, ọ na-agwa Josef ka ya na ya kwaa iko. Olee ihe Josef
ga-eme? O kweghị eme ihe a o kwuru. Josef gwara ya, sị: ‘Mba. Ọ bụ ihe ọjọọ. Nna m ukwu tụkwasịrị m obi, ị bụkwa nwunye ya. Ọ bụrụ na mụ na gị akwaa iko, m ga-emehie Chineke.’Otu ụbọchị, nwunye Pọtịfa chọrọ ịmanye Josef ka ya na ya kwaa iko. O jidere Josef n’uwe. Ma, ọ hapụụrụ ya uwe ya gbaa ọsọ. Mgbe Pọtịfa lọtara, nwunye ya gwara ya na Josef chọrọ idina ya n’ike. Ihe a ọ gwara ya abụghị eziokwu. Ihe a mere ka ezigbo iwe wee Pọtịfa, ya atụba Josef n’ụlọ mkpọrọ. Ma, Jehova echefughị Josef.
“N’ihi ya, wedanụ onwe unu ala otú Chineke, onye dị ike, chọrọ, ka o bulie unu elu mgbe oge ruru.”—1 Pita 5:6