Ihe A Na-aga Ịkọ ná Nkebi nke 4
Nkebi a ga-akọrọ anyị gbasara Josef, Job, Mozis na ndị Izrel. Ha niile diri nsogbu Ekwensu kpataara ha. E megburu ụfọdụ n’ime ha, tụọ ụfọdụ mkpọrọ, jiri ụfọdụ mere ohu, gbuodị ụfọdụ ndị ezinụlọ ha. Ma, Jehova si n’ụzọ dị iche iche chebe ha. Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, nyere nwa gị aka ka ọ ghọta otú ndị ohu Jehova ndị ahụ si fee ya n’agbanyeghị ahụhụ ha tara.
Jehova ji Ihe Otiti Iri o tiri ndị Ijipt gosi na ya ka chi ha niile ike. Mee ka nwa gị ghọta otú Jehova si chebe ndị ya n’oge gara aga na otú o si na-echebe ndị ya taa.
NÁ NKEBI A
ISI NKE 14
Otu Ohu nke Rubeere Chineke Isi
Gịnị mere Josef ji taa ezigbo ahụhụ n’agbanyeghị na o mere ihe ziri ezi?
ISI NKE 15
Jehova Echefughị Josef
Ọ bụ eziokwu na Josef na nne na nna ya, nakwa ụmụnne ya ebighị nso, Chineke gosiri ya na ọ nọnyeere ya.
ISI NKE 19
Ihe Otiti Atọ Ndị Mbụ E Tiri Ndị Ijipt
Fero kpataara ndị obodo ya nsogbu n’ihi na mpako mere ka ọ ghara ime ihe Jehova gwara ya mee.
ISI NKE 21
Ihe Otiti nke Iri
Ihe otiti a gbawara ndị Ijipt obi nke na Fero, bụ́ onye mkpako, kwetaziri ka ndị Izrel laa.
ISI NKE 22
Ọrụ Ebube Jehova Rụrụ n’Osimiri Uhie
Fero anwụghị n’ihe otiti iri ndị ahụ, ma ọ̀ lanahụrụ ọrụ ebube a Chineke rụrụ n’Osimiri Uhie?