Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 7

Ụlọ Elu Babel

Ụlọ Elu Babel

Mgbe Iju Mmiri ahụ gachara, ụmụ Noa na ndị nwunye ha mụrụ ọtụtụ ụmụ. Ụmụ ha toro, mụtakwa ụmụ nke ha. Ha gbasara ebe dị iche iche n’ụwa otú Jehova gwara ha mee.

Ma, ụfọdụ n’ime ụmụ ha emeghị ihe ahụ Jehova gwara ha. Ha gwara ibe ha, sị: ‘Ka anyị rụọnụ obodo biri na ya. Anyị ga-arụ ụlọ elu nke elu ya ga-eru n’eluigwe. Aha anyị ga na-ewukwa ewu.’

Obi adịghị Jehova mma maka ụlọ a ha nọ na-arụ. N’ihi ya, ọ kwụsịrị ha ịrụ ya. Ị̀ ma otú o si mee ya? O mere ka ha malite ịsụ asụsụ dị iche iche na mberede kama ịsụ otu asụsụ. Ha kwụsịrị ịrụ ụlọ ahụ, ebe ọ bụ na ha anaghịzi aghọta ihe ibe ha na-ekwu. A kpọrọ obodo ahụ Babel, nke pụtara “Ọgba Aghara.” Ndị mmadụ si ebe ahụ pụọ gaa biri n’ebe dị iche iche n’ụwa. Ma, ha akwụsịghị ihe ọjọọ ndị ha na-eme n’ebe ndị ahụ ha gara biri. Ma, è nwere onye n’ime ha ka hụrụ Jehova n’anya? Anyị ga-achọpụta n’isi nke asatọ.

“Onye ọ bụla nke na-ebuli onwe ya elu ka a ga-eweda ala, ma onye na-eweda onwe ya ala ka a ga-ebuli elu.”​—Luk 18:14