Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 99

Onye Na-elekọta Ụlọ Mkpọrọ Ghọrọ Onye Kraịst

Onye Na-elekọta Ụlọ Mkpọrọ Ghọrọ Onye Kraịst

Na Filipaị, e nwere otu nwa agbọghọ na-eje ozi mmụọ ọjọọ ji. Mmụọ ọjọọ a mere ka ọ na-akọrọ ndị mmadụ ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu. Ihe a ọ na-eme na-enyekwa ndị nwe ya nnukwu ego. Mgbe Pọl na Saịlas bịara na Filipaị, o so ha na-agagharị ruo ọtụtụ ụbọchị. Mmụọ ọjọọ ahụ mere ka ọ na-eti mkpu, sị: “Ndị a bụ ndị ohu Chineke Onye Kacha Elu.” Pọl gwara mmụọ ọjọọ ahụ, sị: ‘Ana m enye gị iwu n’aha Jizọs ka i si n’ime ya pụta.’ Mmụọ ọjọọ ahụ esi n’ime nwa agbọghọ ahụ pụta.

Mgbe ndị nwe nwa agbọghọ ahụ hụrụ na ha agaghịzi na-eji ya enweta ego, ezigbo iwe were ha. Ha kpụụrụ Pọl na Saịlas gakwuru ndị isi obodo. Ha gwara ha, si: ‘Ndị a na-emebi iwu obodo anyị, na-enyekwa obodo anyị niile nsogbu.’ Ndị isi obodo ahụ nyere iwu ka a pịa Pọl na Saịlas ihe ma tụba ha n’ụlọ mkpọrọ. Onye na-elekọta ụlọ mkpọrọ ahụ tụbara ha n’ọnụ ụlọ mkpọrọ dị n’ime ime nke kacha gbaa ọchịchịrị ma tụọ ha ọtọsị n’ụkwụ.

Pọl na Saịlas bụwara abụ ma na-eto Jehova, ndị mkpọrọ ndị ọzọ ana-ege ha ntị. N’etiti abalị, oké ala ọma jijiji mere na mberede, ụlọ mkpọrọ ahụ niile amawa jijiji. Ibo ụzọ ya niile meghere, agbụ e kere ndị mkpọrọ ahụ tọpụkwara. Onye na-elekọta ụlọ mkpọrọ ahụ ji ọsọ gbaba n’ime ime ma hụ na ụzọ ya niile meghechara emeghe. O chere na ndị mkpọrọ ahụ niile agbaala ọsọ, ya amịrị mma agha ka o gbuo onwe ya.

Ozugbo ahụ, Pọl tiri mkpu, sị: ‘Emerụla onwe gị ahụ́! Anyị niile nọ n’ebe a!’ Onye na-elekọta ụlọ mkpọrọ ahụ gbabara n’ime ime ụlọ mkpọrọ ahụ ma daa n’ihu Pọl na Saịlas. Ọ jụrụ ha, sị: “Gịnị ka m ga-eme ka a zọpụta m?” Ha gwara ya, sị: ‘Gị na ndị ezinụlọ gị kwere na Jizọs.’ Pọl na Saịlas maliteziri ịkụziri ha okwu Jehova. E mekwara nwoke ahụ na ndị ezinụlọ ya niile baptizim.

“Ndị mmadụ ga-ejide unu ma kpagbuo unu, kpụrụ unu gaa n’ụlọ nzukọ, tụbakwa unu n’ụlọ mkpọrọ. A ga-akpụgakwa unu n’ihu ndị eze na ndị gọvanọ n’ihi aha m. Unu ga-eji ohere ahụ gbaara ndị ọzọ àmà.”​—Luk 21:12, 13