Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe A Na-aga Ịkọ ná Nkebi nke 13

Ihe A Na-aga Ịkọ ná Nkebi nke 13

Jizọs bịara n’ụwa ka o jiri ndụ ya chụọ àjà iji gbapụta ụmụ mmadụ na-ezughị okè. Ọ bụ eziokwu na ọ nwụrụ, o meriri ụwa. Jehova ahapụghị Ọkpara ya n’ili, ọ kpọlitere ya n’ọnwụ. Jizọs dị umeala n’obi. O jeere ndị ọzọ ozi ma gbaghara ha mgbe ha mejọrọ ihe. Mgbe a kpọlitechara ya n’ọnwụ, ọ pụtara n’ihu ndị na-eso ụzọ ya. Ọ kụziiri ha otú ha ga-esi arụ ọrụ dị mkpa o nyere ha rụọ. Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, nyere nwa gị aka ka ọ ghọta na anyị kwesịrị iso rụọ ọrụ a n’oge anyị a.

NÁ NKEBI A

ISI NKE 87

Nri Anyasị Ikpeazụ Jizọs Riri

Mgbe Jizọs na ndịozi ya na-eri nri anyasị ikpeazụ, ọ gwara ha ihe ndị dị mkpa ha ga na-eme.

ISI NKE 88

E Jidere Jizọs

Judas Iskarịọt kpọ ìgwè mmadụ ndị ji mma agha na osisi bịa n’ogige Getsemeni ka ha jide Jizọs.

ISI NKE 89

Pita Gọnahụrụ Jizọs

Gịnị mere n’ogige ụlọ Keyafas? Gịnị mere Jizọs n’ime ụlọ Keyafas?

ISI NKE 90

Jizọs Nwụrụ na Gọlgọta

Gịnị mere Paịlet ji nye iwu ka e gbuo Jizọs?

ISI NKE 91

A Kpọlitere Jizọs n’Ọnwụ

Olee ihe ndị dị ịtụnanya merenụ mgbe e gbuchara Jizọs?

ISI NKE 92

Jizọs Pụtara n’Ihu Ndị Gara Igbu Azụ̀

Olee ihe Jizọs mere iji mee ka ha bịakwute ya?

ISI NKE 93

Jizọs Laghachiri Eluigwe

Ma tupu ya alaghachi eluigwe, o nyere ndị na-eso ụzọ ya otu iwu dị ezigbo mkpa.