Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Mmụọ Adịbeghị Ndụ n’Ụwa ma Nwụọ

Ndị Mmụọ Adịbeghị Ndụ n’Ụwa ma Nwụọ

Ndị Mmụọ Adịbeghị Ndụ n’Ụwa ma Nwụọ

Ndị mmụọ dị adị! N’ime ógbè ebe ndị bụ mmụọ, e nwere ma mmụọ ndị dị mma ma ndị dị njọ. Hà bụ mmadụ ndị dịworo ndụ n’ụwa ma nwụọ?

Ee e, ha abụghị. Mgbe mmadụ nwụrụ, nwoke ma ọ bụ nwanyị ahụ adịghị agabiga banye n’ụwa nke ndị bụ mmụọ, dị ka ọtụtụ ndị na-eche. Ànyị si aṅaa mara nke a? N’ihi na Bible kwuru otú ahụ. Bible bụ akwụkwọ nke eziokwu nke sitere n’aka nanị otu ezi Chineke ahụ, onye aha ya bụ Jehova. Jehova kere ụmụ mmadụ; ọ maara nke ọma ihe na-eme ha mgbe ha nwụrụ.​—Abụ Ọma 83:18; 2 Timoti 3:16.

Bible na-ekwu na Chineke ‘weere ájá sitere n’ala’ kpụọ Adam, bụ́ nwoke mbụ ahụ. (Jenesis 2:7) Chineke tinyere ya n’ime Paradaịs, bụ́ ogige Iden. A sị na Adam rubeere iwu Jehova isi, ọ gaghị anwụworị; ọ ka gaara adị ndụ n’elu ala taa. Ma mgbe Adam leziri anya mebie iwu Chineke, Chineke gwara ya, sị: “Ị ga-alata n’ala; n’ihi na e siri na ya wepụta gị; n’ihi na ájá ka ị bụ, ọ bụkwa ájá ka ị ga-alata.”​—Jenesis 3:19.

Gịnị ka nke a pụtara? Ọ dị mma, olee ebe Adam nọ tupu Jehova ekee ya site n’ájá? Ọ dịghị ebe ọ nọ. Ọ bụghị mmụọ nke a na-amụbeghị amụ nke ka nọ n’eluigwe. Ọ dịghị adị. Ya mere, mgbe Jehova kwuru na Adam “ga-alata n’ala,” ihe ọ na-ekwu bụ na Adam ga-anwụ anwụ. Ọ gabigaghị banye n’ógbè nke ndị bụ mmụọ. Mgbe ọ nwụrụ, Adam ghọghachiri onye na-adịghị ndụ, onye na-adịghị adị. Ọnwụ bụ ọnọdụ nke adịghị ndụ.

Ma gịnị banyere ndị ọzọ ndị nwụworonụ? Hà bụkwa ndị na-adịghị adị? Bible na-aza:

“Ha nile [ma ụmụ mmadụ ma anụmanụ] na-ala n’otu ebe; ha nile siri n’ájá pụta, ha nile na-alaghachikwa n’ájá.”​—Eklisiastis 3:20.

“Ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla.”​—Eklisiastis 9:5.

“Ma ịhụnanya ha, ma ịkpọasị ha, ma ekworo ha, . . . [alawo] n’iyi.”​—Eklisiastis 9:6.

“Ọ dịghị ọrụ ma ọ bụ ichepụta echiche ma ọ bụ ihe ọmụma dị na Sheol [ili], bụ́ ebe ị na-ala.”​—Eklisiastis 9:​10New World Translation.

“[Mmadụ] wee laghachi n’ala o si pụta; n’ụbọchị ahụ echiche ya nile alawo n’iyi.”​—Abụ Ọma 146:4.

Akụkụ akwụkwọ nsọ ndị a hà na-esiri gị ike ịnakwere? Ya bụrụ otú ahụ, chee echiche banyere nke a: N’ọtụtụ ezinụlọ, onye bụ nwoke na-akpata ego iji kwadoo ezinụlọ ya. Mgbe nwoke ahụ nwụrụ, ezinụlọ ya na-amalitekarị ịta ahụhụ ihe isi ike. Mgbe ụfọdụ nwunye ya na ụmụ ya adịghị enwe ọbụna ego ga-ezuru ha ịzụta ihe oriri. Ma eleghị anya ndị iro nke nwoke ahụ ga na-emekpọ ha ọnụ. Ugbu a jụọ onwe gị, sị: ‘A sị na nwoke ahụ dị ndụ n’ụwa nke ndị bụ mmụọ, n’ihi gịnị ka ọ na-anọgideghị na-akwado ezinụlọ ya? N’ihi gịnị ka ọ na-adịghị echebe ezinụlọ ya pụọ n’aka ndị ajọ mmadụ?’ Ọ bụ n’ihi na akụkụ akwụkwọ nsọ ndị ahụ bụ eziokwu. Nwoke ahụ adịghị ndụ, o nweghị ike ime ihe ọ bụla.​—Abụ Ọma 115:17.

Nke a ọ̀ pụtara na ọ dịghị mgbe ọ bụla ọzọ ndị nwụrụ anwụ ga-adịghachi ndụ? Ee e, ọ pụtaghị nke ahụ. Anyị ga-ekwu okwu banyere mbilite n’ọnwụ mgbe e mesịrị. Ma ọ pụtara na ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ị na-eme. Ha apụghị ịhụ gị, ịnụ ihe ị na-ekwu ma ọ bụ ịkpanyere gị ụka. Ọ dịghị mkpa ka ị na-atụ ha egwu. Ha apụghị inyere gị aka, ha apụghị imerụ gị ahụ.​—Eklisiastis 9:4; Aịsaịa 26:14.

[Foto dị na peeji nke 4]

Adam sitere n’ájá, laghachikwa n’ájá

[Foto ndị dị na peeji nke 5]

Ọ bụ nanị ndị dị ndụ pụrụ ime ihe ndị a

[Foto ndị dị na peeji nke 6]

Ndị nwụrụ anwụ apụghị inyere ndị nọ n’agụụ aka ma ọ bụ chebe ndị a na-emekpọ ọnụ