Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị

To provide you with the best possible experience, we use cookies and similar technologies. Some cookies are necessary to make our website work and cannot be refused. You can accept or decline the use of additional cookies, which we use only to improve your experience. None of this data will ever be sold or used for marketing. To learn more, read the Global Policy on Use of Cookies and Similar Technologies. You can customize your settings at any time by going to Privacy Settings.

Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ebe ezinụlọ na-anabata di na nwunye n’ụlọ ha ma na-enye ha onyinye

Isiokwu Afọ 2016

“Ka ịhụnanya ụmụnna unu dịgide.”Ndị Hibru 13:1

Isiokwu Afọ 2016

Jizọs sịrị na ‘ọtụtụ ndị ga-akpọ ibe ha asị, nakwa na ịhụnanya nke ndị ka n’ọnụ ọgụgụ ga-ajụkwa oyi.’ (Mat. 24:10, 12) Ihe ndị a Jizọs kwuru gosiri na ihe a ga-eji mara ndị mmadụ n’oge a ga-ebibi Jeruselem n’afọ 70 bụ na ha agaghị na-ahụ ibe ha n’anya. Ma, ndị na-eso ụzọ Kraịst ga-adị iche. Ihe a ga-eji mara ha bụ na ha hụrụ ibe ha n’anya. (Jọn 13:35) Ọ ga-abụ na obi tọrọ ndị Hibru bụ́ Ndị Kraịst ụtọ mgbe ha gụrụ akwụkwọ ozi Pọl detaara ha nke gosiri na o kwetara na ha hụrụ ụmụnna ha n’anya, na-agbakwa ha ume ka ha nọgide na-ahụ ụmụnna ha n’anya.

Ọ fọla obere ugbu a ka ebibie ụwa Setan. Ndị anyị na ha bi n’oge a bụ ndị hụrụ ego n’anya, ndị hụrụ ihe ụtọ n’anya, na ndị hụrụ onwe ha n’anya ma ha ahụchaghị Chineke na ndị agbata obi ha n’anya. E nwekwara ụdị ndị a n’oge ndịozi Jizọs. (2 Tim. 3:1-4) N’agbanyeghị na anyị na ndị dị otú a bi, anyị bụ́ Ndịàmà Jehova hụrụ ibe anyị n’anya n’ụwa niile. Ka anyị nọgide na-ahụ ụmụnna anyị n’anya, si otú ahụ na-eto Jehova bụ́ Chineke nke ịhụnanya.