Gịnị Ka M Ga-eme Ma Ọ Bụrụ na Ọgwụ Ike Ma Ọ Bụ Mmanya Eriela Papa M Ma Ọ Bụ Mama M Ahụ́?
ISI NKE 23
Gịnị Ka M Ga-eme Ma Ọ Bụrụ na Ọgwụ Ike Ma Ọ Bụ Mmanya Eriela Papa M Ma Ọ Bụ Mama M Ahụ́?
“Papa m gwara anyị ka ya gaa rụzie ụgbọala ya, anyị echegide ya chi ejiwe, anyị ahụghị ya. Mama m akpọọ ya n’ekwe ntị, ma ọ zaghị. Ka oge gatụrụ, achọpụtara m na obi erukwaghị mama m ala, ya ejikerewe ịpụ. Ọ gwaziri m, sị: ‘Ana m aga ịchọ papa gị.’
“E mechaa, mama m lọtara—naanị ya. Ajụrụ m ya, sị: ‘Ọ̀ bụ papa m anọghị ebe ahụ?’ Ya asị m, ‘Mba.’
“Amataziri m na papa m amalitekwala aghụghọ ahụ ọ na-aghọ. Ọ bụkwa ihe o mere oge gara aga. Ihe kpatara ya bụ na ọgwụ ike eriela papa m ahụ́. Mgbe ọ lọtara, ezigbo iwe ji mụ na mama m. N’echi ya, atụpụghịrị m ya ọnụ, ihe ahụ m mere wutekwara m.”—Karen, dị afọ iri na anọ.
ỌTỤTỤ nde ndị na-eto eto na-achị obi n’aka kwa ụbọchị n’ihi na ha na-edi nsogbu papa ha ma ọ bụ mama ha ọgwụ ike ma ọ bụ mmanya riri ahụ́ na-enye ha. Ọ bụrụ na ụdị ihe ahụ eriela papa gị ma ọ bụ mama gị ahụ́, o nwere ike na-emechu gị ihu, na-eme gị obi ọjọọ ma na-akpasu gị iwe.
Dị ka ihe atụ, papa Mary na-eyi ezigbo mmadụ ma ọ pụọ n’èzí. Ma ndị mmadụ amaghị na ọ bụ onye aṅụrụma. Ọ na-agwa ndị ezinụlọ ya okwu ọjọọ ma na-emesi ha ike. Mary kwara arịrị, sị: “Ndị mmadụ na-abịa agwa anyị na anyị nwere ezigbo nna, nakwa na nke anyị ka mma.” *
Ọ bụrụ na mmanya ma ọ bụ ọgwụ ike eriela papa gị ma ọ bụ mama gị ahụ́, olee otú ị ga-esi na-edi ya?
Chọpụta Ihe Kpatara Ya
Ihe mbụ bụ na ọ bara uru ka ị ghọta nsogbu papa gị na mama gị na-enwe. Ilu 1:5 kwuru, sị: “Onye nwere nghọta na-enweta ezi ntụziaka.” N’ihi ya, ọ ga-abara gị uru ma ị mata ihe ihe iri mmadụ ahụ́ pụtara, onye mmanya ma ọ bụ ọgwụ ike na-eri ahụ́, nakwa ihe mere o ji rie ya ahụ́.
Dị ka ihe atụ, ịbụ onye aṅụrụma apụtaghị ịṅụbiga mmanya ókè mgbe ụfọdụ. Kama, onye aṅụrụma bụ onye na-aṅụ oké mmanya mgbe niile, onye ọ na-anaghịkwa ekwe nkwụsị. * Ọ bụ onye mmanya riri ahụ́, ọ naghịkwa ejideli onwe ya ma ọ ṅụwa mmanya. Mmanya riri ya ahụ́ na-akpatara ezinụlọ ya nsogbu, na-emebi ọrụ ya, na-akpatakwara ya ọrịa.
Ọ bụ eziokwu na ihe nwere ike ime ka mmanya rie ụfọdụ ndị ahụ́ bụ na o si ha n’ọbara, ihe ọzọ nwekwara ike ịbụ Ilu 14:13) A mụdịrị ụfọdụ n’ime ha n’ezinụlọ ebe papa na mama bụcha ndị aṅụrụma. Ụdị ndị ahụ na-aṅụ oké mmanya iji chefuo ihe ndị mere ha mgbe ha bụ ụmụaka. Ihe ndị ahụ nwekwara ike ime ka mmadụ bụrụ onye ọgwụ ike riri ahụ́.
otú obi na-adị ha. N’eziokwu, ọtụtụ ndị aṅụrụma na-echere onwe ha echiche na-adịghị mma. (N’ezie, mmadụ ịṅụ oké mmanya ma ọ bụ ọgwụ ike ga-eme ka nsogbu ya ka njọ; ọ na-eme ka ọ ghara iche echiche nke ọma, meekwa ka ọ ghara inwe obi mmadụ. N’ihi ya, o nwere ike ịdị mkpa ka papa gị ma ọ bụ mama gị gakwuru ndị ọkachamara ka ha nyere ya aka ịkwụsị mmanya ma ọ bụ ọgwụ ike ahụ riri ya ahụ́.
Atụla Anya Ihe Ha Na-agaghị Emeli
N’eziokwu, ịmata ihe mere papa gị ma ọ bụ mama gị ji na-akpa àgwà na-adịghị mma agaghị eme ka nsogbu ahụ kwụsị. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ bụrụ na ị mata ihe mere mmanya ma ọ bụ ọgwụ ike ji rie ya ahụ́, ọ ga-eme ka i metara ya ebere.
Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na papa gị ma ọ bụ mama gị gbajiri ụkwụ, ị̀ ga-atụ anya ka gị na ya gbaa bọl? Ọ́ bụrụkwanụ na ị ma na ihe mere o ji gbajie ụkwụ bụ na o zuzuru nzuzu? O doro anya
na obi agaghị adị gị mma. Otú ọ dị, ị ma na ụkwụ ya agaghị ekwe ya gbaa bọl ruo mgbe ọ dịrị ya mma. Ị ghọta ya otú ahụ, ọ ga-eme ka ị ghara ịtụ anya ka o mee ihe ọ na-agaghị emeli.N’otu aka ahụ, papa ma ọ bụ mama bụ́ onye aṅụrụma ma ọ bụ onye ọgwụ ike riri ahụ́ agaghị na-eche echiche nke ọma, isi agaghịkwa akpakọ ya ọnụ. N’eziokwu, ọ bụ onye ahụ ji aka ya kpatara onwe ya nsogbu ahụ. Nzuzu papa gị ma ọ bụ mama gị na-ezuzu kwesịrị iwe gị iwe. Otú ọ dị, papa gị ma ọ bụ mama gị agaghị enwe ike ilekọta gị nke ọma ruo mgbe a gwọrọ ya nsogbu ya. Ọ bụrụ na ị ghọta na ihe ahụ riri papa gị ma ọ bụ mama gị ahụ́ mere ka ọ dị ka onye gbajiri ụkwụ, o nwere ike ime ka ị ghara ịtụ anya ka o mee ihe ọ na-agaghị emeli.
Ihe Ị Ga-eme
Ghọta na ị ga na-edi nsogbu papa gị ma ọ bụ mama gị na-enye gị, ọ gwụla ma ọ gbanwere omume ya. Ma, olee ihe ị ga-eme ugbu a?
Echela na ọ bụ gị kpatara nsogbu ahụ. Ọ bụ papa gị ma ọ bụ mama gị kpatara nsogbu ahụ, ọ bụghị onye ọzọ. Ndị Galeshia 6:5 kwuru, sị: “Onye ọ bụla ga-ebu ibu nke ya.” Ọ bụghị gị ga-agwọ ya nsogbu ya, ọ bụghịkwanụ iwu na ị ga-eme ka ọ ghara ịta ahụhụ ga-esi n’omume ya pụta. Dị ka ihe atụ, i kwesịghị ịghara onye were ya n’ọrụ ụgha, ọ bụghịkwa iwu na ị ga-ekubata ya n’ime ụlọ ma ọ nọrọ n’ihu ụlọ na-ehi ụra mmanya.
Gwa ya ka ọ chọọ onye ga-agwọ ya. Ihe ga-akacha bụrụ nsogbu ya nwere ike ịbụ ikwetadị na ya nwere nsogbu. Ọ bụrụ na ọ bụ papa gị nwere nsogbu ahụ, mgbe anya doro ya, mama gị na ụmụnne gị ndị tọrọ gị nwere ike ịgakwuru ya, gwa ya nsogbu omume ya na-ewetara ezinụlọ unu nakwa ihe o kwesịrị ime.
Ọzọkwa, ọ ga-abara ya uru ma o dee azịza ajụjụ ndị a: Gịnị ga-eme mụ na ezinụlọ m ma ọ bụrụ na mụ akwụsịghị ịṅụ oké mmanya ma ọ bụ ọgwụ ike? Olee uru ọ ga-abara m ma m kwụsị ya? Gịnị ka m ga-eme ka e nyere m aka?
Ọ bụrụ na nsogbu chọrọ ịmalite n’ụlọ, pụọ. Ilu 17:14 kwuru, sị: “Tupu esemokwu amalite, si n’ebe ahụ pụọ.” Etinyela ọnụ n’esemokwu n’ihi na ọ ga-eme ka ị baa ná nsogbu. I nwere ike ịbanye n’ime ụlọ gị ma ọ bụ gaa n’ụlọ enyi gị. Ọ bụrụ na ọ dawa tigbuo zọgbuo, i nwere ike ịkpọ ndị mmadụ ka ha bịa nye aka.
Ekwela ka obi gị na-ama gị ikpe. Obi na-ama ụfọdụ ndị na-eto eto ikpe ma ha wesa papa ha ma ọ bụ mama ha mmanya ma ọ bụ ọgwụ ike riri ahụ́ iwe. Ọ dịghị njọ ma i wee iwe, nke ka nke, ma ọ bụrụ na Ndị Efesọs 6:2, 3) Ma ‘ịsọpụrụ’ papa gị ma ọ bụ mama gị pụtara irubere ya isi, otú ahụ i kwesịrị irubere onye uwe oji ma ọ bụ ọkàikpe isi. Ọ pụtaghị na omume ya dị gị mma. (Ndị Rom 12:9) Ọ pụtaghịkwa na ị bụ onye ọjọọ ma ọ bụrụ na mmanya ma ọ bụ ọgwụ ike ahụ riri ya ahụ́ adịghị gị mma; a sị ka e kwuwe, ịṅụ oké mmanya na ọgwụ ike abụghị ihe ọma!—Ilu 23:29-35.
omume ya mere ka ọ ghara ịhụ gị n’anya ma na-elekọta gị otú kwesịrị ekwesị. N’eziokwu, Baịbụl nyere gị iwu ka ị sọpụrụ papa gị na mama gị. (Nwee ezigbo ndị enyi. Ọ bụrụ na nsogbu na-adị n’ụlọ, o nwere ike ime ka i chefuo ihe i kwesịrị ime. N’ihi ya, o kwesịrị ekwesị ka gị na ndị uche ha kpakọrọ ọnụ nakwa ndị ha na Jehova dị ná mma na-akpa. Ndị nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst nwere ike ịgba gị ume ma nyere gị aka, meekwa ka ahụ́ na-eru gị ala n’agbanyeghị nsogbu dị n’ezinụlọ unu. (Ilu 17:17) Ọ bụrụ na ị na-akpa ezinụlọ ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ nso, ị ga-amụta otú e kwesịrị isi na-ebi n’ezinụlọ, nke ga-eme ka ị ghara ịmụta ihe nlereanya ọjọọ ị na-ahụ n’ezinụlọ unu.
Chọọ enyemaka. Ihe ga-enyere gị aka bụ ịchọta dimkpa bụ́ ezigbo mmadụ, onye ihe na-adabara gị na ya, ị ga na-akọrọ otú obi dị gị. Ndị okenye ọgbakọ ga-enyere gị aka ma ị chọọ. Baịbụl kwuru na ha dị ka “ebe izere ifufe na ebe mgbaba iji zere oké mmiri ozuzo, dị ka mmiri iyi ndị dị n’ala mmiri na-adịghị, dị ka ndò nke oké nkume dị elu n’ala kpọrọ nkụ.” (Aịzaya 32:2) N’ihi ya, ụjọ atụla gị, emekwala ihere ịgakwuru ha ka ha kasie gị obi ma dụọ gị ọdụ.
N’ime ụzọ ihe isii e kwuru ebe a, dee nke ị ga-achọ ibu ụzọ mee. ․․․․․
O nwere ike ị gaghị akwụsịli nsogbu dị n’ụlọ unu, ma i nwere ike ime ka ọ ghara ime gị obi ọjọọ. Kama ịchọwa ka ị na-agwa papa gị ma ọ bụ mama gị ihe ọ ga-eme, gwawa onwe gị ihe ị ga-eme. Pọl onyeozi dere, sị: ‘Na-eme ihe ga-ewetara onwe gị nzọpụta.’ (Ndị Filipaị 2:12) Ime otú ahụ ga-enyere gị aka inwe olileanya, o nwekwara ike ime ka papa gị ma ọ bụ mama gị chọọ onye ga-enyere ya aka n’ihe ahụ riri ya ahụ́.
Olee ihe ị ga-eme ma ọ bụrụ na papa gị na mama gị na-esekarị okwu? Olee otú ị ga-esi die obi ọjọọ ọ na-eme gị?
[Ihe odide ala ala peeji]
^ par. 7 Ọ bụrụ na papa gị ma ọ bụ mama gị bụ́ onye aṅụrụma na-emesi gị ike, i kwesịrị ịchọ onye ga-enyere gị aka. Gwa ya onye toro eto ị tụkwasịrị obi. Ọ bụrụ na ị bụ Onyeàmà Jehova, i nwere ike ịkọrọ ya okenye ọgbakọ ma ọ bụ Onye Kraịst ọzọ tozuru okè.
^ par. 11 Onye aṅụrụma ma ọ bụ onye ọgwụ ike riri ahụ́ nwere ike ịbụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị.
AMAOKWU BAỊBỤL
“Nghọta mmadụ nwere na-eme ka ọ ghara iwe iwe ọsọ ọsọ.” —Ilu 19:11.
NDỤMỌDỤ
Kama ịkpọ papa gị ma ọ bụ mama gị asị, kpọọ ihe ọjọọ ahụ ọ na-eme asị.—Ilu 8:13; Jud 23.
Ị̀ MA NA . . . ?
N’ime Baịbụl, ‘nsọpụrụ’ nwere ike ịpụta irubere mmadụ isi n’ihi ikike e nyere ya. (Ndị Efesọs 6:1, 2) N’ihi ya, ịsọpụrụ papa gị ma ọ bụ mama gị apụtaghị na omume ya ga-adị gị mma mgbe niile.
IHE M GA-EME!
Ọ bụrụ na papa m ma ọ bụ mama m na-akpọ mmadụ iyi ma ọ bụ na-akụ mmadụ ihe, ihe m ga-eme bụ
Otú m ga-esi agwa papa m ma ọ bụ mama m ka ọ chọọ enyemaka bụ
Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ
GỊNỊ KA I CHERE?
● Gịnị mere mmanya ma ọ bụ ọgwụ ike ji eri ụfọdụ ndị ahụ́?
● Gịnị mere o ji bụrụ na ọ bụghị gị mere ka mmanya ma ọ bụ ọgwụ ike rie papa gị ma ọ bụ mama gị ahụ́?
● Olee ihe ị ga-agbanweli n’ọnọdụ gị, oleekwa otú i nwere ike isi eme ya?
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 192]
“Ama m na papa m na mama m nwere ike imechu m ihu n’ọdịnihu, ma amakwa m na ọ bụrụ na mụ atụkwasị Jehova obi, ọ ga-enye m ike idi ya.”—Maxwell
Igbe dị na peeji nke 198]
Ihe Ị Ga-eme Ma Papa Gị Ma Ọ Bụ Mama Gị Kwụsị Ife Jehova
Ọ bụrụ na papa gị ma ọ bụ mama gị akwụsị ime ihe Baịbụl kwuru—ma eleghị anya, kwuodị na ya achọkwaghị ịbụ Onyeàmà Jehova—gịnị ka ị ga-eme?
● Buru n’obi na Jehova agaghị ata gị ụta maka àgwà ọjọọ papa gị ma ọ bụ mama gị na-akpa. Baịbụl kwuru, sị: “Onye ọ bụla n’ime anyị ga-aza Chineke ajụjụ maka onwe ya.”—Ndị Rom 14:12.
● Ejikwala onwe gị na-atụnyere ndị ọzọ na-eto eto, ndị ọnọdụ ha ka nke gị mma. (Ndị Galeshia 5:26) Otu nwa okorobịa papa ya hapụrụ ezinụlọ ha kwuru, sị: “Kama ịnọ na-eche ụdị ihe ahụ, ọ ka mma iche otú ị ga-esi edi ya.”
● Na-akwanyere papa ma ọ bụ mama gị ahụ na-akpa àgwà ọjọọ ùgwù. Ya sị gị mee ihe, mee ya ma ọ bụrụ na o megideghị ihe Baịbụl kwuru. Jehova nyere ụmụ iwu ka ha na-asọpụrụ papa ha na mama ha, ma papa ha ma ọ bụ mama ha ọ̀ bụ onye kwere ekwe ma ọ bụ na ọ bụghị. (Ndị Efesọs 6:1-3) Ọ bụrụ na ị na-asọpụrụ papa gị na mama gị ma na-erubere ha isi n’agbanyeghị ihe ha na-emejọ, ị na-egosi na ị hụrụ Jehova n’anya.—1 Jọn 5:3.
● Ka gị na ọgbakọ Ndị Kraịst na-akpachi anya. Ọgbakọ a bụ ezinụlọ buru ibu na-efe Chineke, nke ga-eme ka ahụ́ ruo gị ala. (Mak 10:30) E nwere otu nwa okorobịa aha ya bụ David. Mgbe papa ya kwụsịrị ife Jehova, ụjọ tụrụ ya na ndị ọgbakọ ha ga na-agbara ya na ndị ọzọ nọ n’ezinụlọ ha ọsọ. Ma David chọpụtara na ụjọ na-atụ ya enweghị isi na ọdụ. O kwuru, sị: “Ha emeghị anyị ka ndị a jụrụ ajụ. O mere ka o doo m anya na ọgbakọ hụrụ anyị n’anya n’ezie.”
[Foto dị na peeji nke 194]
Ị ghọta na ihe ahụ riri papa gị ma ọ bụ mama gị ahụ́ mere ka ọ dị ka onye gbajiri ụkwụ, o nwere ike ime ka ị ghara ịtụ anya ka o mee ihe ọ na-agaghị emeli