Olee Otú M Ga-esi Na-ejide Onwe M?
ISI NKE 26
Olee Otú M Ga-esi Na-ejide Onwe M?
GỊNỊ ka i chere—ọkụ ọ̀ bara uru ka ọ́ baghị? I nwere ike ikwu na azịza ya dabeere n’ihe e ji ya eme. Ọ bụrụ na ị nọrọ n’ebe a kwanyere ọkụ n’oge ụgụrụ, ọkụ ahụ ga-eme ka ahụ́ kporo gị ọkụ. Nke ahụ bara uru. Otú ọ dị, ọ bụrụ na a hapụ ọkụ ahụ, o nwere ike gbasaa ngwa ngwa ma gbaa ụlọ ahụ niile ọkụ. Nke ahụ abaghị uru.
E nwere ike iji ya tụnyere obi gị. I jide obi gị aka, ya abaara gị uru, mee ka gị na ndị ọzọ bụrụ ezigbo enyi. Ma ọ bụrụ na i jideghị ya aka, o nwere ike imebiri gị ihe, mebikwaara ndị ọzọ.
Ugbu a ị na-eto eto, e nwere mgbe iwe ga-eju gị obi, nweekwa mgbe obi na-agaghị adị gị mma. Olee otú ị ga-esi ejide onwe gị mgbe ahụ? Ka anyị leba ihe abụọ ahụ anya otu otu.
Otú Ị Ga-esi Eme Ka Iwe Gị Dajụọ
Ọ naghị adịrị mmadụ mfe idi iwe na obi ọjọọ ma a rụsa onye ahụ arụrụala. Ụfọdụ ndị e mere ya anaghị ejideli onwe ha. N’eziokwu, Baịbụl kwuru na e nwere ndị “na-ewekarị iwe” na ndị “na-ewekarị oké iwe.” (Ilu 22:24; 29:22) Ihe a abụghị okwu egwuregwu. Ọ bụrụ na ị naghị ejideli onwe gị ma a kpasuo gị iwe, i nwere ike mee ihe ị ga-emecha kwaa mmakwaara. N’ihi ya, olee otú ị ga-esi ejide onwe gị ma a rụsa gị arụrụala?
Ihe mbụ ị ga-eme bụ ichebara ihe ahụ e mere gị echiche nke ọma, mara ma ị̀ ga-echefuli ya. * (Abụ Ọma 4:4) Cheta na ‘iji ihe ọjọọ akwụ ụgwọ ihe ọjọọ’ ga-eme ka nsogbu ahụ ka njọ. (1 Ndị Tesalonaịka 5:15) Mgbe i chebachaara ihe ahụ echiche ma kpee ekpere maka ya, ị ga-ahụ na i nwere ike ịhụ ihe mere ị ga-eji kwụsị iwe ahụ. Ozugbo i mere ya, iwe ahụ ga-adajụ.—Abụ Ọma 37:8.
Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na iwe ahụ akwụsịghị? Baịbụl kwuru na e nwere “oge ịgbachi nkịtị na oge ikwu okwu.” (Ekliziastis 3:7) Ì nwere ike ịgakwuru onye ahụ kpasuru gị iwe? Ọ bụrụ na ọ dịghị mma ime otú ahụ, o nwere ike ịbara gị uru ma ị gwa papa gị na mama gị ma ọ bụ enyi gị toro eto otú obi dị gị. Ọ bụrụ na mmadụ kpachaara anya chọọ ịkpasu gị iwe, gbalịa ka ị ghara iwesa ya iwe. Ihe e dere na peeji nke 221 ga-enyere gị aka icheta ihe ndị ọzọ ị ga-eme n’ihe ndị ọ na-abụ e mee gị ugbu a, iwe ewewe gị.
N’ezie, kpekuo Jehova ekpere ma rịọ ya ka o nyere gị aka ka ị ghara iburu onye mejọrọ gị iwe n’obi. Buru n’obi na n’agbanyeghị na ị gaghị agbanweli ihe e mere gị, i nwere ike ịgbanwe ihe ị chọrọ ime. Ọ bụrụ na i kwe ka iwe ju gị obi, ị ga-adịzi ka azụ̀ loro nkò. Ọ ga-eme ka onye ọzọ na-echere gị echiche, na-agwa gị otú obi ga-adị gị. Ọ ka mma ka ọ bụrụ gị ga na-ekpebi otú obi ga-adị gị.—Ndị Rom 12:19.
Ihe Ị Ga-eme Mgbe Obi Na-adịghị Gị Mma
Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na isii aha ya bụ Laura kwuru, sị: “Ọ dịbeghị anya obi jọwara m njọ, mụ akatọwa onwe m. O nweghị ihe na-eme m obi ụtọ ná ndụ. Ana m ebegide ákwá hie ụra.” Dị ka Laura, nsogbu ụwa na-agwụ ọtụtụ ndị na-eto eto ike. Gịnwa kwanụ? Ike ụwa nwere ike ịgwụ gị n’ihi ihe papa gị na mama gị, ndị enyi gị na ndị nkụzi gị chọrọ ka i mee; mgbanwe ndị ị na-enwe n’ahụ́ gị ugbu a ị na-eto eto; ma ọ bụ iche na ị baghị uru n’ihi ntakịrị ihe ụfọdụ i mejọrọ.
Ụfọdụ ndị na-eto eto na-emerụ onwe ha ahụ́ iji mee ka ahụ́ ruo ha ala. * Ọ bụrụ otú ahụ ka ị na-eme, gbalịa chọpụta ihe kpatara ya. Dị ka ihe atụ, mmadụ imerụ onwe ya ahụ́ na-abụkarị ụzọ e si edi nchekasị. È nwere ihe na-eme ka ị na-echegbu onwe gị—ma eleghị anya, ọnọdụ ezinụlọ unu ma ọ bụ ndị enyi gị?
Otu n’ime ihe kacha mma ị ga-eme mgbe obi na-adịghị gị mma bụ ịkọrọ papa gị ma ọ bụ mama gị ma ọ bụkwanụ Onye Kraịst ọ bụla mere okenye, onye nwere ike ịbụ onye “a mụrụ maka oge nsogbu.” (Ilu 17:17) Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na isii aha ya bụ Liliana gara kọọrọ ụfọdụ ụmụnna nwaanyị bụ́ Ndị Kraịst otú obi dị ya. O kwuru, sị: “Ebe ọ bụ na ha tọrọ m, ndụmọdụ ha baara m uru. Ha aghọọla ndị enyi m.” * Nwa agbọghọ ọzọ dị afọ iri na ise aha ya bụ Dana kwuru na ahụ́ malitere iru ya ala mgbe o tinyekwuru oge n’ozi ọma. O kwuru, sị: “Ọ bụ ihe kacha mma m kwesịrị ime. N’eziokwu, ọ bụ oge m kacha nwee obi ụtọ ná ndụ!”
Nke ka nke, ọ bụrụ na obi adịghị gị mma, na-ekpe ekpere. Ọbụ abụ bụ́ Devid maara otú ahụhụ na-adị. Ọ bụ ya mere o ji dee, sị: “Tụkwasị Jehova ibu arọ gị, ya onwe ya ga-akwadokwa gị.” (Abụ Ọma 55:22) Jehova maara ahụhụ ị na-ata. Ọzọkwa, ‘ihe banyere gị na-emetụ ya n’obi.’ (1 Pita 5:7) Ọ bụrụ na obi gị na-ama gị ikpe, cheta na ‘Chineke karịrị obi gị, marakwa ihe niile.’ (1 Jọn 3:20) Ọ ka gị mara ihe mere obi ji ajọ gị njọ, o nwekwara ike ibupụrụ gị nsogbu ahụ.
Ọ bụrụ na obi ka na-ajọ gị njọ, o nwere ike ịbụ na ị na-arịa ọrịa, dị ka ịda mbà n’obi. * Ọ bụrụ otú ahụ, ọ ga-adị mma ịga ụlọ ọgwụ ka e lee gị ahụ́. Ọ bụrụ na i leghara ya anya, o yiri ịgbali redio dị n’ụgbọala gị elu ka ị ghara ịnụ ụda njin ụgbọala gị chọrọ ịkụ akụ. Ọ kacha mma ka i lebara nsogbu ahụ anya. N’eziokwu, ọnọdụ gị ekwesịghị imewe gị ihere. Ọtụtụ ndị na-eto eto na-arịa ụdị ọrịa ahụ na-aga ụlọ ọgwụ ka a gwọọ ha.
Cheta na e nwere ike iji otú obi dị gị tụnyere ọkụ. I jide onwe gị, ya abaara gị uru; ma í jideghị onwe gị, ya emebie ihe. Mee ihe niile i nwere ike ime ka ị na-ejide onwe gị. N’eziokwu, mgbe ụfọdụ, i nwere ike kwuo ma ọ bụ mee ihe ị ga-emecha kwaa mmakwaara. Ma nwee ndidi. Ka oge na-aga, ị ga-amụta ijide onwe gị ka ị ghara ime ihe ọ bụla batara gị n’obi.
Ị̀ na-achọkarị ka i zuo okè? Ya bụrụ otú ahụ, olee otú ị ga-esi die ihe ị na-emejọ?
[Ihe odide ala ala peeji]
^ par. 8 Ọ bụrụ na ọ bụ okwu ka a chọrọ gị, gụọ Isi nke 14 n’akwụkwọ a, ka ị hụ ihe ndị a gwara gị mee. Ọ bụrụkwanụ na ọ bụ enyi gị kpasuru gị iwe, ihe e kwuru n’Isi nke 10 nwere ike ịbara gị uru.
^ par. 13 E nwere ọtụtụ ụzọ ndị na-akpachara anya emerụ onwe ha ahụ́ na-esi eme ya, dị ka ibekasị onwe ha ahụ́, ịda onwe ha ọkụ, ichihịa onwe ha ahụ́ ma ọ bụ ịkpụcha akpụkpọ ahụ́ ha.
^ par. 14 Ọ bụrụ na ị gaghị ekwuli okwu n’ihu onye ahụ, gbalịa deere ya akwụkwọ ozi ma ọ bụ kpọọ ya n’ekwe ntị. Ihe mbụ ga-eme ka obi dajụọ gị bụ ịkọrọ onye ihe na-adabara gị na ya otú obi dị gị.
^ par. 16 Gụkwuo banyere ịda mbà n’obi na nwanne akwụkwọ a e bụ ụzọ bipụta, isi nke 13.
AMAOKWU BAỊBỤL
“Ekwela ka ihe ọjọọ merie gị, kama jiri ihe ọma na-emeri ihe ọjọọ.”—Ndị Rom 12:21.
NDỤMỌDỤ
Kwa ụbọchị, gwa papa gị na mama gị otu ihe ọma meere gị—a sịgodị na ọ bụ ntakịrị ihe. Ọ bụrụzie na i nwee nsogbu siri ike, ọ ga-adịkwuru gị mfe ịgwa ha. Ha ga-enwekwu mmasị ige gị ntị.
Ị̀ MA NA . . . ?
Ọ bụrụ na i highị ezigbo ụra, i righịkwa ihe ahụ́ gị chọrọ, ọ ga-esiri gị ike ime ka obi dị gị mma.
IHE M GA-EME!
Ihe na-akacha enye m nsogbu n’obi bụ ․․․․․
Otú m ga-esi merie ya bụ ․․․․․
Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․
GỊNỊ KA I CHERE?
● Gịnị mere iwe ọkụ anaghị adị Chineke mma?
● Olee otú iwe ọkụ nwere ike isi mebiere gị ihe?
● Mgbe obi na-adịghị gị mma, olee ihe ụfọdụ ga-enyere gị aka idi ya?
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 223]
“Ihe kacha mkpa bụ ịma na o nwere onye hụrụ m n’anya, onye m nwere ike ịkọrọ otú obi dị m mgbe obi na-adịghị mụ mma.”—Jennifer
[Chaatị na Foto ndị dị na peeji nke 221]
Ebe M Dere Ihe
Na-achị Iwe Gị
Dee ihe n’ebe a
Ihe Atụ
Nwa klas anyị kọrọ m ọnụ
Ihe M Na-ekwesịghị Ime
Ịgwa ya okwu ọjọọ
Ihe Ka Mma M Kwesịrị Ime
Ịgbachi ya nkịtị, gosi ya na ọ gaghị akpasuli m iwe
Ihe Atụ
Nwanne m “gbaziiri” akpụkpọ ụkwụ m na-eyikarị n’agwaghị m agwa
Ihe M Na-ekwesịghị Ime
Imegwara ya, “gbaziri” ihe ya
Ihe Ka Mma M Kwesịrị Ime
․․․․․
Ihe Atụ
Papa m na mama m kwuru na mụ agaghị apụ èzí
Ihe M Na-ekwesịghị Ime
․․․․․
Ihe Ka Mma M Kwesịrị Ime
․․․․․
[Foto dị na peeji nke 220]
Onye na-ebu iwe n’obi yiri azụ̀ loro nkò—ọ bụ onye ọzọ na-achị ha abụọ