Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú M Si Eru Uju Ò Kwesịrị Ekwesị?

Otú M Si Eru Uju Ò Kwesịrị Ekwesị?

ISI NKE 16

Otú M Si Eru Uju Ò Kwesịrị Ekwesị?

Ọ bụ eziokwu na isiokwu a kwuru banyere mgbe mama ma ọ bụ papa nwụrụ, ihe a kọwara ga-abara mmadụ uru mgbe onye ọzọ nọ n’ezinụlọ ha ma ọ bụ ezigbo enyi ya nwụrụ.

“Mgbe mama m nwụrụ, ọ dị m ka ụwa agwụla. Amaghị m ihe m ga-eme. Ọ bụ mama m mere ezinụlọ anyị ji dị n’otu.”—Karyn.

ỌNWỤ nne ma ọ bụ nna so n’ihe na-akacha ewute mmadụ. Mgbe e mechara, ọtụtụ ihe ị na-echetụbeghị mbụ nwere ike ịbatawa gị n’obi. Otu nwa okorobịa aha ya bụ Brian dị afọ iri na atọ mgbe obi nkụchi gburu papa ya. Ọ sịrị: “N’abalị anyị chọpụtara na ọ nwụọla, naanị ihe anyị nwere ike ime bụ ibe ákwá na ịmakụ ibe anyị.” Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Natalie dị afọ iri mgbe ọrịa kansa gburu papa ya. Ọ sịrị: “Amaghị m ihe m ga-eme. N’ihi ya, anọ m na-ele anya shii. Ákwá ekweghị m obube.”

Otú ndị mmadụ si eru uju ma mmadụ nwụọ dị iche iche. Baịbụl kwuru na “onye ọ bụla” nwere “ihe na-egbu ya mgbu na ihe na-afụ ya ụfụ.” (2 Ihe E Mere 6:29) Buru ihe a Baịbụl kwuru n’obi ma chetụgodị otú obi dị gị mgbe mama gị ma ọ bụ papa gị nwụrụ. N’okpuru ebe a, dee (1) otú obi dị gị mgbe ị chọpụtara na mama gị ma ọ bụ papa gị anwụọla, na (2) otú obi dị gị ugbu a. *

1 ․․․․․

2 ․․․․․

Ihe ị zara nwere ike igosi na obi adịtụwala gị mma. O nweghị ihe o mere. Ọ pụtaghị na i chefuola mama gị ma ọ bụ papa gị. Ihe ị zara nwekwara ike igosi na obi ka dị gị otú ọ dị gị mgbe mbụ ma ọ bụkwanụ na ọ kala njọ. Otú i si eru uju nwere ike iyi ebili mmiri, nke na-anaghị akwụ otu ebe, ma e mechaa, ya akwụsị n’ike. O nweghị ihe o mere, a sịgodị na ọtụtụ afọ agafeela kemgbe mama gị ma ọ bụ papa gị nwụrụ. Ajụjụ dị mkpa bụ, Olee otú i nwere ike isi die ọnwụ onye ahụ n’agbanyeghị otú i si eru uju?

Ákwá gụọ gị, bee ya! Ibe ákwá na-eme ka obi dịtụ onye na-eru uju mma. Ma, obi nwere ike ịdị gị otú ọ dị otu nwa agbọghọ aha ya bụ Alicia, onye dị afọ iri na itoolu mgbe mama ya nwụrụ. Ọ sịrị, “Echere m na m besie ákwá ike, ọ ga-adị ka mụ enweghị okwukwe.” Ma chegodị echiche: Jizọs Kraịst bụ nwoke zuru okè, nweekwa okwukwe siri ike na Chineke. Ma “anya mmiri gbara” ya mgbe ezigbo enyi ya bụ́ Lazarọs nwụrụ. (Jọn 11:35) N’ihi ya, atụla ụjọ ibe ákwá. Ibe ákwá apụtaghị na i nweghị okwukwe! Alicia sịrị: “Emechara m bee ezigbo ákwá. M bere ákwá kwa ụbọchị.” *

Obi mawa gị ikpe, chọpụta ihe kpatara ya. Karyn dị afọ iri na atọ mgbe mama ya nwụrụ. Ọ sịrị: “N’abalị ọ bụla tupu mụ alakpuo, m na-aga n’ebe mama m na-arahụ gaa susuo ya ọnụ, sị ya ‘ka chi bọọ.’ Agaghị m susuo ya ọnụ n’otu abalị, mgbe chi bọrọ, m hụrụ na mama m anwụọla. Ama m na ekwesịghị m ịtawa onwe m ụta, ma obi mawara m ikpe n’ihi na agaghị m hụ ya n’abalị ikpeazụ ahụ, nakwa n’ihi ihe ndị mere mgbe chi bọrọ. Papa m gara ọrụ n’obodo ọzọ. Tupu ya apụọ, ọ gwara mụ na nwanne m nwaanyị ka anyị na-aga ele otú mama anyị mere. Ma n’ụbọchị ahụ, anyị alakpughị n’oge. N’ụtụtụ ya, mgbe m gara n’ebe mama m na-arahụ, achọpụtara m na ọ naghịzi eku ume. Obi gbawara m, n’ihi na ahụ́ dị ya tupu papa m apụwa!”

Obi nwere ike ịna-amatụ gị ikpe otú ahụ ọ mara Karyn n’ihi na i meghị ihe ụfọdụ i kwesịrị ime. Naanị ihe i nwedịrị ike ịna-echeta bụ ihe ndị ị gaara eme ma a sị na ị ma. ‘A sị na m ma, m gaara agwa papa m ka ọ gaa ụlọ ọgwụ.’ ‘A sị na m ma, m gaara aga hụ mama m n’oge.’ Ọ bụrụ na ụdị ihe a na-echegbu gị, cheta na o nweghị ihe o mere ma ị kwaa ụta maka ihe ndị i chere ị gaara eme ma a sị na ị ma. Nke bụ́ eziokwu bụ na ị garaghị eme ihe i mere ma a sị na ị ma ihe ga-emenụ. Ma ị maghịnụ. N’ihi ya, i kwesịghị ịtawa onwe gị ụta. Ọ bụghị gị gburu mama gị ma ọ bụ papa gị! *

Gwa ndị ọzọ otú obi dị gị. Ilu 12:25 sịrị: “Okwu ọma na-eme ka [mmadụ] ṅụrịa ọṅụ.” I mee ka a ghara ịma otú obi dị gị, o nwere ike isiri gị ike idi ọnwụ ahụ. Ma, ị kọọrọ onye ị tụkwasịrị obi otú obi dị gị, o nwere ike ịgwa gị “okwu ọma” nke ga-agba gị ume mgbe ahụ obi na-adịghị gị mma.

Gwa Chineke. I kpee ekpere, ‘wụpụ obi gị dị ka mmiri’ n’ihu Jehova Chineke, o nwere ike ime ka obi ruo gị ala. (Abụ Ọma 62:8) Ekpere abụghị ihe mmadụ ji eme ka obi dị ya mma. Kama, ọ bụ ịrịọ ‘Chineke nke nkasi obi niile, onye na-akasi anyị obi ná mkpagbu anyị niile,’ arịrịọ. (2 Ndị Kọrịnt 1:3, 4) Chineke na-esi n’Okwu ya bụ́ Baịbụl akasi anyị obi. (Ndị Rom 15:4) Ọ ga-adị mma ma i depụta amaokwu Akwụkwọ Nsọ ndị na-akasi gị obi ma debe ya ebe ị ga-ahụ ya ngwa ngwa. *

Mmadụ anaghị akwụsị iru uju n’otu ntabi anya. Ma Baịbụl na-akasi anyị obi n’ihi na ọ gwara anyị na n’ime ụwa ọhụrụ Chineke kwere anyị ná nkwa, “ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ.” (Mkpughe 21:3, 4) I nwekwara ike ịchọpụta na ịtụgharị uche n’ụdị nkwa ahụ ga-enyere gị aka idi ọnwụ mama gị ma ọ bụ papa gị.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 6 Ọ bụrụ na ajụjụ abụọ ahụ siiri gị ike ugbu a, i nwere ike ịza ha ma e mechaa.

^ par. 10 Echela na ị ga-eberịrị ákwá iji gosi na ị na-eru uju. Onye ọ bụla nwere otú o si eru uju. Ihe ị ga-eburu n’obi bụ: Ọ bụrụ na anya mmiri eju gị anya, mara na o nwere ike ịbụ “oge ịkwa ákwá.”—Ekliziastis 3:4.

^ par. 12 Ọ bụrụ na obi ka na-ama gị ikpe, kọọrọ mama gị ma ọ bụ papa gị dị ndụ ma ọ bụkwanụ onye ọzọ toro eto otú obi dị gị. Ka oge na-aga, ị ga-emecha mụta otú i kwesịrị isi na-ele ihe anya.

^ par. 14 Amaokwu ndị kasirila ụfọdụ ndị obi bụ: Abụ Ọma 34:18; 102:17; 147:3; Aịzaya 25:8; Jọn 5:28, 29.

AMAOKWU BAỊBỤL

“[Chineke] ga-ehichapụkwa anya mmiri niile n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ niile agabigawo.”—Mkpughe 21:4.

NDỤMỌDỤ

Na-ede ihe ọ bụla i chetara banyere mama gị ma ọ bụ papa gị ahụ nwụrụ anwụ. Ime otú ahụ nwere ike inyere gị ezigbo aka idi ọnwụ ya.

Ị̀ MA NA . . . ?

Mmadụ ibe ákwá apụtaghị na onye ahụ adịghị ike. Ebreham, Josef, Devid, na Jizọs bụ ụmụ nwoke siri ike. Ma ha bere ákwá mgbe ha na-eru uju.—Jenesis 23:2; 50:1; 2 Samuel 1:11, 12; 18:33; Jọn 11:35.

IHE M GA-EME!

Ọnwụ papa m ma ọ bụ mama m wutewe m nke ukwuu, ihe m ga-eme bụ ․․․․․

Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m dị ndụ banyere okwu a bụ ․․․․․

GỊNỊ KA I CHERE?

● Gịnị mere o ji dị mma ka ị na-echeta ihe ndị na-eme gị obi ụtọ banyere papa gị ma ọ bụ mama gị nwụrụ anwụ?

● Gịnị mere ide ihe i chetara ga-eji nyere gị aka idi uju ị na-eru?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 112]

“Ekweghị m ka onye ọ bụla mara otú obi dị m. Ọ gaara akara m mma ma a sị na m kọọrọ ya onye ọzọ. Ọ gaara enyere m aka idi ya.”—Devid

[Igbe/Foto dị na peeji nke 113]

CHANTELLE

“Papa m rịara ọrịa ihe dị ka afọ ise, ọrịa ya nọkwa na-aka njọ kwa ụbọchị. Adị m afọ iri na isii mgbe o gburu onwe ya. Mama m mechara kọọrọ mụ na nwanne m nwoke tọrọ m ihe niile na-emenụ. O kwekwara ka anyị kpebie ihe ụfọdụ banyere olili ya. Ihe ahụ o mere nyeere anyị aka idi ọnwụ papa anyị. Echere m na ụmụaka anaghị achọ ka e zochiere ha ihe ndị ha kwesịrị ịma, nke ka nke, ihe ndị dị mkpa otú a. Ka oge na-aga, ọ na-adịziri m mfe ikwu banyere ọnwụ papa m. Mgbe ọ bụla ákwá gụrụ m, m na-aga otu ebe ma ọ bụ gakwuru enyi m, bee ákwá. Ndụmọdụ m bụ: Ọ bụrụ na ị chọrọ ikwu banyere ya, gakwuru onye ezinụlọ unu ma ọ bụ ndị enyi gị. Ihe ọ bụla i nwere ike ime ka obi dị gị mma, mee ya.”[1]

[Igbe/Foto dị na peeji nke 113, 114]

LEAH

“Mama m rịara ọrịa strok mgbe m dị afọ iri na itoolu. Ọ nwụrụ mgbe afọ atọ gachara. Mgbe e mechara, ekpebiri m ịkara obi. Ihe ga-esiri papa m ezigbo ike ma ọ bụrụ na mụ akaraghị obi. Mgbe m dị obere, mama m na-elekọta m mgbe ọ bụla ahụ́ na-adịghị m. M na-echeta otú o si emetụ m aka n’ahụ́ ma ọ chọọ ịmata ma m̀ nwere ahụ́ ọkụ. Ọ na-abụ ihe ụfọdụ mee, mụ echeta na mama m anọghịzi. M na-agbalị ime ka a ghara ịma otú obi dị m. Ma ọ naghị eme ka obi dị mụ mma. N’ihi ya, m na-ele foto ya mgbe ụfọdụ ka m nwee ike ibe ákwá. Ịgwa ndị enyi m otú obi dị m nyekwaara m aka. Baịbụl kwere nkwa na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ ka ha biri n’ụwa nke ga-aghọ paradaịs. (Jọn 5:28, 29) Mgbe ọ bụla m na-eche banyere olileanya m nwere ịhụ mama m ọzọ, mgbe m na-echekwa banyere ihe m kwesịrị ime ka m nwee ike ịhụ ya, obi na-adịtụ mụ mma.”[1]

[Igbe/Foto dị na peeji nke 114]

BETHANY

“Ọ dị m ka ya bụrụ na m na-echeta mgbe m gwara papa m, ‘Ahụrụ m gị n’anya.’ Ama m na m gwara ya otú ahụ, ma echetaghị m mgbe m kwuru ya. M chọrọ ịna-echeta ya. Adị m naanị afọ ise mgbe ọ nwụrụ. Ọrịa strok bịara papa m mgbe ọ na-ehi ụra, e buru ya gaa ụlọ ọgwụ. Mgbe m tetara n’ụtụtụ, anụrụ m na ọ nwụọla. Mgbe e mechara, ọ na-abụ, m kwuwe banyere papa m, iwe ana-ewe m. Ma, ka oge na-aga, ịnụ akụkọ banyere ya malitere ịtọ m ụtọ n’ihi na o nyerela m aka ịmatakwu ụdị onye ọ bụ. Ndụmọdụ m na-enye onye ọ bụla mama ya ma ọ bụ papa ya nwụrụ bụ: Na-echeta oge ndị ahụ gị na ya nọrọ. Deekwa ihe niile i chetara banyere ya ka ị ghara ichefu ha. Gbalịa mee ka okwukwe gị sie ike ka i nwee ike ịhụ mgbe a ga-akpọlite ya n’ọnwụ n’ụwa ọhụrụ Chineke.”[3]

[Igbe dị na peeji nke 116]

Ebe M Dere Ihe

Dee Ihe I Chetara

Dee ihe ụfọdụ na-eme gị obi ụtọ ma i cheta papa gị ma ọ bụ mama gị nwụrụ anwụ. ․․․․․

Dee ihe i chere ị gaara agwa papa gị ma ọ bụ mama gị mgbe ọ ka dị ndụ. ․․․․․

Ka e were ya na e nwere nwanne gị ị tọrọ nke obi ka na-ama ikpe maka ọnwụ papa gị ma ọ bụ mama gị. Dee ihe i nwere ike ikwu iji kasie ya obi. (O nwere ike ime ka ị kwụsị ịta onwe gị ụta.) ․․․․․

Dee ihe abụọ ma ọ bụ atọ ị gaara amata banyere papa gị ma ọ bụ mama gị nwụrụ anwụ mgbe ọ dị ndụ. Jụzie papa gị ma ọ bụ mama gị dị ndụ otu n’ime ihe ndị ahụ i dere. ․․․․․

Gụọ Ọrụ Ndịozi 24:15. Olee otú olileanya ahụ e kwuru n’amaokwu a si enyere gị aka idi ọnwụ papa gị ma ọ bụ mama gị? ․․․․․

[Foto dị na peeji nke 115]

Iru uju nwere ike iyi ebili mmiri, nke na-akwụsị n’ike