IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | ALỤMDI NA NWUNYE
Otú Ị Ga-esi Na-enwekwu Ndidi
“Otú di na nwunye si emeso ibe ha ihe kwa ụbọchị nwere ike ime ka a mata ma hà na-enwere ibe ha ndidi. O nwere ike ịbụ na inwe ndidi adịchaghị gị mkpa mgbe ị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwaanyị. Ma ọ dị ezigbo mkpa iji mee ka di na nwunye na-ebi nke ọma.”—John.
Gịnị mere i ji kwesị ịna-enwe ndidi?
Mgbe unu lụrụ, unu ga-abịa mata onwe unu nke ọma nke na i nwere ike ịhụkwu ebe di gị ma ọ bụ nwunye gị na-anaghị emecha nke ọma.
“Mgbe oge ụfọdụ unu lụrụ gachara, ọ na-adị mfe ilekwasị anya n’àgwà ndị ahụ na-anaghị amasị gị di gị ma ọ bụ nwunye gị na-akpa. I mewe otú ahụ, ọ ga-adịrị gị mfe ịghara ịna-enwezi ndidi.”—Jessena.
Enweghị ndidi nwere ike ime ka i kwuo okwu n’echeghị echiche.
“M na-adị ngwa ikwu ihe dị m n’obi nke na mgbe ụfọdụ, m na-ekwu ihe m na-ekwesịghị ikwu. Ọ bụrụ na m na-enwekwu ndidi, m ga-ebu ụzọ chee ma ihe m chọrọ ikwu ọ̀ dị ezigbo mkpa. O nwekwara ike ime ka m kpebie na ọ dịghị mkpa.”—Carmen.
Baịbụl kwuru, sị: “Ịhụnanya nwere ogologo ntachi obi na obiọma.” (1 Ndị Kọrịnt 13:4) Ọ dị mma ka mmadụ abụọ hụrụ ibe ha n’anya na-enwere ibe ha ndidi. Ma ọ naghị adị otú ahụ mgbe niile. John e kwuru okwu ya ná mmalite kwuru, sị: “Inwekwu ndidi na-esi ike, ma ị ghara inwekwu ndidi anaghị esi ike. Otú ahụ ka ọ dịkwa n’àgwà ndị ọzọ. Mmadụ ga-agbasi mbọ ike tupu ya ana-enwekwu ndidi.”
Olee otú ị ga-esi na-enwe ndidi?
Mgbe ihe mberede mere, ya esiere gị ike inwe ndidi.
Ihe atụ: Mgbe di gị ma ọ bụ nwunye gị gwara gị okwu ọjọọ, ya adị ka ọ̀ bụ gị gwagwara ya.
Ihe Baịbụl kwuru: “Adịla ngwa ná mmụọ gị ịbụ onye a kpasuru iwe, n’ihi na iwe iwe bụ ihe na-adịgide n’obi ndị nzuzu.”—Ek 7:9.
Otú ị ga-esi na-enwe ndidi: Cheretụ. Tupu gị agwa ya okwu, gwa onwe gị na ihe di gị ma ọ bụ nwunye gị bu n’obi kwuo okwu ahụ abụghị ka ọ kpasuo gị iwe ma ọ bụ kparịa gị. Otu akwụkwọ aha ya bụ Fighting for Your Marriage, kwuru, sị: “Ọtụtụ n’ime anyị na-agbakwasịkarị ụkwụ n’ihe anyị chere di anyị ma ọ bụ nwunye anyị bu n’obi kwuo okwu meso ya ihe karịa n’ihe yanwa bu n’obi kwuo ihe o kwuru.”
Ọ bụrụgodị na di gị ma ọ bụ nwunye gị chọrọ ịkpasu gị iwe, i nwere ike ime ka udo dị ma ọ bụrụ na ịna-enwe ndidi ma ghara ịchọ ka ị gwagwara ya ihe ọ gwara gị. Baịbụl kwuru, sị: “Ọ bụrụ na nkụ adịghị, ọkụ na-anyụ.”—Ilu 26:20.
“Ọ bụrụ na ọ dịwa gị ka nwunye gị ọ̀ bụzi onye iro gị, kwụsị ma chee ihe mere i ji hụ ya n’anya, ma gbalịa meere ya ihe ọma ozugbo.”—Ethan.
Ihe ị ga-echebara echiche:
Olee ihe ị na-eme ma di gị ma ọ bụ nwunye gị gwa gị okwu ọjọọ ma ọ bụ mee gị ihe na-adịghị mma?
Olee otú ị ga-esi na-enwekwu ndidi mgbe ọzọ o mere gị ụdị ihe ahụ?
Mgbe di gị ma ọ bụ nwunye gị na-eme gị otu ihe na-ewe gị iwe ugboro ugboro.
Ihe atụ: Di gị ma ọ bụ nwunye gị na-egbukarị oge, ya ana-eme ka obi na-ajọ gị njọ ka ị na-eche ya.
Ihe Baịbụl kwuru: “Na-ediri ibe unu ihe ma na-agbaghara ibe unu kpamkpam.”—Ndị Kọlọsi 3:13.
Otú ị ga-esi na-enwe ndidi: Na-ebute adịm ná mma gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị ụzọ karịa ihe ga-abara naanị gị uru. Jụọ onwe gị, sị, ‘Ọ bụrụ na ihe a emee ka mụ na ya see okwu, ọ̀ ga-akpa alụmdi na nwunye anyị aka ọjọọ?’ Chetakwa na “anyị niile na-asụ ngọngọ ọtụtụ ugboro.” (Jems 3:2) Nke a pụtara na e nwekwara ebe ndị ị ga-arụ ọrụ na ha.
“Mgbe ụfọdụ, m na-enwere enyi m ndidi karịa ka m na-enwere di m. Echere m na ihe kpatara ya bụ na mụ na di m na-anọkarị mụ ana-ahụ ebe ndị ọ na-anaghị emecha nke ọma. Ma ọ bụrụ na m na-enwere ya ndidi, m na-egosi na m hụrụ ya n’anya ma na-akwanyere ya ùgwù. N’ihi ya, inwe ndidi dị ezigbo mkpa n’alụmdi na nwunye m.”—Nia.
Ihe ị ga-echebara echiche:
Ì na-enwere di gị ma ọ bụ nwunye gị ndidi n’ebe ndị ọ na-anaghị eme nke ọma?
Olee otú ị ga-esi na-enwekwuru ya ndidi n’ọdịnihu?