Olee Otú Jizọs Kwuru Ka Anyị Si Na-emeso Ndị Ọzọ?
Ihe Baịbụl kwuru
Mgbe Jizọs na-akụzi ihe n’elu ugwu, o kwuru, sị: “Unu kwesịrị ịna-emere ndị mmadụ ihe niile unu chọrọ ka ha na-emere unu.” (Matiu 7:12; Luk 6:31) Akwụkwọ bụ́ Encyclopedia of Philosophy kwuru na otú ọzọ e nwere ike isi kwuo ihe a Jizọs kwuru bụ: “Na-emesonụ ndị mmadụ otú unu chọrọ ka ha si na-emeso unu.”
Gịnị ka ihe a Jizọs kwuru pụtara?
Jizọs ji ihe a o kwuru na-agba anyị ume ka anyị na-emeso ndị ọzọ otú anyị chọrọ ka ha si na-emeso anyị. Dị ka ihe atụ, ọ na-atọ ọtụtụ ndị ụtọ ma ndị ọzọ kwanyere ha ùgwù, jiri obiọma meso ha ihe, gosikwa ha na ha hụrụ ha n’anya. N’ihi ya, ọ dabara adaba na anyị ga ‘na-emeso ndị mmadụ otú anyị chọrọ ka ha na-emeso anyị.’—Luk 6:31.
Gịnị mere ihe a Jizọs kwuru ji baa uru?
Ihe ahụ Jizọs kwuru nwere ike ịbara anyị uru n’ihe niile. Dị ka ihe atụ, o nwere ike . . .
Ime ka di na nwunye na-ebi n’udo.—Ndị Efesọs 5:28, 33.
Inyere ndị nne na nna aka ịzụ ụmụ ha nke ọma.—Ndị Efesọs 6:4.
Ime ka mmadụ na ndị enyi ya, ndị agbata obi ya, na ndị ọrụ ibe ya dịrị ná mma.—Ilu 3:27, 28; Ndị Kọlọsi 3:13.
Ihe ahụ Jizọs kwuru dabara n’ihe e kwuru n’ọtụtụ ebe n’ebe a na-akpọkarị Agba Ochie na Baịbụl. Ihe a Jizọs kụziri “ka Iwu Mosis [ya bụ, akwụkwọ ise mbụ dị na Baịbụl], na Akwụkwọ Ndị Amụma [ya bụ, akwụkwọ ndị e dere amụma dị iche iche na ha] na-akụzi.” (Matiu 7:12) E nwere ike ikwu na otú ahụ Jizọs kwuru ka anyị si na-emeso ndị ọzọ mere ka isi ihe dị n’Agba Ochie doo anya, ya bụ, mmadụ ịhụ onye agbata obi ya n’anya.—Ndị Rom 13:8-10.
Jizọs ò ji ihe ahụ o kwuru na-agwa anyị ihe anyị ga-erite n’aka ndị ọzọ?
Mba. Ihe Jizọs lekwasịrị anya n’ihe ahụ o kwuru bụ imere ndị ọzọ ihe. Mgbe Jizọs kwuru otú anyị kwesịrị isi na-emeso ndị ọzọ, ihe ọ nọ na-ekwu abụghị naanị otú anyị ga-esi na-emeso ndị mmadụ, kama otú anyị ga-esikwa na-emeso ndị iro anyị. (Luk 6:27-31, 35) N’ihi ya, ihe ahụ Jizọs kwuru na-akụziri anyị ịna-emere mmadụ niile ihe ọma.
Olee otú ị ga-esi eme ihe a Jizọs kwuru?
1. Na-eleru anya ala. Gbaa mbọ na-achọpụta otú ihe si dịrị ndị nọ gị gburugburu. Dị ka ihe atụ, i nwere ike hụ onye bu ọtụtụ ihe ọ zụrụ n’ahịa, ma ọ bụ nụ na e nwere onye agbata obi gị nọ n’ụlọ ọgwụ, ma ọ bụkwanụ chọpụta na e nwere onye ọrụ ibe gị obi na-adịchaghị mma. Ọ bụrụ na ‘ị na-achọ ihe ga-adị ndị ọzọ mma,’ ị ga-achọta ohere ị ga-eji kwuo ma ọ bụ mee ihe ga-enyere ha aka.—Ndị Filipaị 2:4.
2. Na-emetere ndị ọzọ ebere. Weregodị ya na ọ bụ gị ka ihe mere ndị ọzọ mere. Olee otú obi ga-adị gị ma ọ bụrụ gị ka o mere? (Ndị Rom 12:15) Ị gbalịa chọpụta otú obi dị ndị ọzọ, o nwere ike ime ka i nyere ha aka.
3. Dịrị njikere ịgbanwe ihe ị chọrọ ime. Buru n’obi na mmadụ niile abụghị otu. Ihe ndị ọzọ ga-achọ ka e meere ha nwere ike ọ bụghị ihe gịnwa ga-achọ ka e meere gị. N’ihi ya, ọ bụ eziokwu na e nwere ọtụtụ ihe i nwere ike imere ndị ọzọ, gbaa mbọ ka ọ bụrụ ihe ha chọrọ ka ị ga-emere ha.—1 Ndị Kọrịnt 10:24.