Olee Ndị Ga-aga Eluigwe?
Ihe Baịbụl kwuru
Chineke na-ahọrọ mmadụ ole na ole ji obi ha niile na-efe ya bụ́ ndị ọ ga-abụ ha nwụọ, ya akpọlite ha n’ọnwụ, ha agaa eluigwe. (1 Pita 1:3, 4) A họrọhaala ha, ha ga-anọgide na-eme ka okwukwe ha na-esikwu ike, na-ebikwa ndụ otú Chineke si chọọ. Ọ bụrụ na ha emeghị otú ahụ, a ga-ewere ha ka ndị na-erughị eru inweta oké ha n’eluigwe.—Ndị Efesọs 5:5; Ndị Filipaị 3:12-14.
Olee ihe ndị na-aga eluigwe na-aga ime n’ebe ahụ?
Ha ga-eso Jizọs chịa dị ka ndị eze na ndị nchụàjà ruo otu puku afọ. (Mkpughe 5:9, 10; 20:6) Ọ bụ hanwa ga-aghọ “eluigwe ọhụrụ,” ya bụ, ọchịchị ga-esi n’eluigwe na-achị “ụwa ọhụrụ,” nke bụ́, ndị ezi omume ga-ebi n’ụwa. Ndị ahụ ga-eso Jizọs chịa ga-enye aka mee ka ụmụ mmadụ dịrị otú ahụ Chineke chọburu ka ha dịrị.—Aịzaya 65:17; 2 Pita 3:13.
Mmadụ ole ka a ga-akpọlite n’ọnwụ, ha agaa eluigwe?
Baịbụl kwuru na a ga-akpọlite otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ n’ọnwụ, ha agaa eluigwe. (Mkpughe 7:4) N’ọhụụ dị n’akwụkwọ Mkpughe 14:1-3, Jọn onyeozi hụrụ “Nwa Atụrụ ahụ ka o guzo n’Ugwu Zayọn, ya na otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ.” N’ọhụụ a, “Nwa Atụrụ ahụ” nọchịrị anya Jizọs e si n’ọnwụ kpọlite. (Jọn 1:29; 1 Pita 1:19) “Ugwu Zayọn” nọchiri anya otú e si bulie Jizọs elu, ya na otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ga-eso ya chịa n’eluigwe.—Abụ Ọma 2:6; Ndị Hibru 12:22.
Na Baịbụl, e nwere aha a kpọrọ ndị a ‘a kpọrọ, na ndị a họọrọ’ ka ha soro Jizọs chịa. A kpọrọ ha “ìgwè atụrụ nta.” (Mkpughe 17:14; Luk 12:32) Ihe a Baịbụl kpọrọ ha gosiri na ha ga-adị obere n’ọnụ ọgụgụ ma e jiri ha tụnyere ọnụ ọgụgụ ndị niile bụ́ atụrụ Jizọs.—Jọn 10:16.
Ihe ndị na-abụghị eziokwu ndị mmadụ na-ekwu banyere ndị ga-aga eluigwe
Ụgha: Ndị ezi omume niile ga-aga eluigwe.
Eziokwu: Chineke kwere nkwa na ihe ka ọtụtụ ná ndị ezi omume ga-adị ndụ ebighị ebi n’ụwa.—Abụ Ọma 37:11, 29, 34.
Jizọs sịrị: “Ọ dịghịkwa onye ọ bụla rịgowooro n’eluigwe.” (Jọn 3:13) Ihe a o kwuru gosiri na mmadụ ndị dị ka Ebreham, Mozis, Job, na Devid bụ́ ndị ezi omume nwụrụ tupu ya abịa, agaghị eluigwe. (Ọrụ Ndịozi 2:29, 34) Kama, ha nwere olileanya na a ga-akpọlite ha n’ọnwụ, ha adịrị ndụ n’ụwa.—Job 14:13-15.
Ihe a na-akpọ ụdị mbilite n’ọnwụ a, ya bụ, ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ha agaa eluigwe, bụ “mbilite n’ọnwụ mbụ.” (Mkpughe 20:6) Ihe ọ pụtara bụ na a ga-enwekwa ụdị mbilite n’ọnwụ ọzọ. Ọ ga-abụ nke ndị a ga-akpọlite, ha ebiri n’ụwa.
Baịbụl na-akụzi na mgbe Alaeze Chineke ga-achịwa ụwa, “ọnwụ agaghị adị ọzọ.” (Mkpughe 21:3, 4) Ebe ọ bụ na e nwetụbeghị mgbe ọnwụ dị n’eluigwe, ọ pụtara na ọ bụ n’ụwa ka nkwa ahụ ga-emezurịrị.
Ụgha: Ọ bụ onye ọ bụla ga-eji aka ya ekpebi ma ọ̀ ga-aga eluigwe ka ọ̀ ga-ebi n’ụwa.
Eziokwu: Ọ bụ Chineke na-ekpebi onye ga-enweta “òkù a kpọrọ ịga eluigwe,” n’ime ndị niile ji obi ha niile na-efe Chineke. (Ndị Filipaị 3:14) Chineke anaghị ahọrọ onye ọ bụla maka na ọ na-agụ onye ahụ agụụ ịga eluigwe.—Matiu 20:20-23.
Ụgha: Olileanya ibi ndụ ebighị ebi n’ụwa enweghị oké ihe ọ bụ, ọ bụkwa ndị na-erughị eru ịga eluigwe nwere ụdị olileanya ahụ.
Eziokwu: Chineke kpọrọ ndị ga-adị ndụ ebighị ebi n’ụwa “ndị m,” “ndị m họọrọ,” na ndị “Jehova gọziri agọzi.” (Aịzaya 65:21-23) Ọ bụ ha ga-emezu ihe Chineke bu n’obi mgbe o kere ụmụ mmadụ, ya bụ, ka ha zuo okè ma dịrị ndụ ebighị ebi n’ụwa bụ́ paradaịs.—Jenesis 1:28; Abụ Ọma 115:16; Aịzaya 45:18.
Ụgha: Ọnụ ọgụgụ ahụ bụ́ otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ e kwuru okwu ya n’akwụkwọ Mkpughe abụghị ọnụ ọgụgụ nkịtị, o nwere ihe ọ nọchịrị anya ya.
Eziokwu: Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ọnụ ọgụgụ dị n’akwụkwọ Mkpughe nwere ihe ha nọchịrị anya ya, ma ụfọdụ ọnụ ọgụgụ e dere na ya bụ ọnụ ọgụgụ nkịtị. Dị ka ihe atụ, o kwuru banyere “aha iri na abụọ nke ndịozi iri na abụọ nke Nwa Atụrụ ahụ.” (Mkpughe 21:14) Lee ihe doro anya mere a ga-eji kwuo na e kwesịrị iwere otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ka ọnụ ọgụgụ nkịtị.
Mkpughe 7:4 kwuru banyere “ọnụ ọgụgụ nke ndị ahụ a kara akara [ma ọ bụ ndị ahụ a họọrọ ịga eluigwe], ya bụ, otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ.” N’amaokwu ndị na-esonu, e kwuru okwu òtù ọzọ dị iche bụ́ “oké ìgwè mmadụ, nke onye ọ bụla na-enweghị ike ịgụta ọnụ.” Ndị so ‘n’oké ìgwè mmadụ’ ahụ ga-enwetakwa nzọpụta si n’aka Chineke. (Mkpughe 7:9, 10) Ọ bụrụ na ọnụ ọgụgụ ahụ bụ́ otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ abụghị ọnụ ọgụgụ nkịtị, kama e ji ya akọwa otu òtù a na-amaghị ọnụ ọgụgụ ya, ọ pụtaranụ na o nweghizi ihe dị iche ya na “oké ìgwè mmadụ” ahụ. a
Ihe ọzọ bụ na mmadụ otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ahụ bụ ndị ‘e si n’etiti ụmụ mmadụ zụta dị ka mkpụrụ mbụ.’ (Mkpughe 14:4) “Mkpụrụ mbụ” ahụ a kpọrọ ha gosiri na ha bụ mmadụ ole na ole a họọrọ. Nke a gosiri na ndị ga-eso Jizọs chịa dị ole na ole ma e jiri ha tụnyere imirikitimi ndị ha ga-achị n’ụwa.—Mkpughe 5:10.
a N’otu akwụkwọ kwuru gbasara Mkpughe isi 1 ruo 7 a na-akpọ An Exegetical Commentary, na peeji ya nke 474, otu ọkachamara aha ya bụ Robert L. Thomas, kwuru gbasara otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ahụ e kwuru okwu ya ná Mkpughe 7:4. Ọ sịrị: “Ọnụ ọgụgụ a bụ ọnụ ọgụgụ nkịtị e ji gosi ọdịiche dị n’etiti ya na ọnụ ọgụgụ ahụ onye ọ bụla na-enweghị ike ịgụta ọnụ e kwuru okwu ya na Mkpughe 7:9. Ọ bụrụ na ọnụ ọgụgụ a abụghị ọnụ ọgụgụ nkịtị, ọ pụtara na e nweghịzi ọnụ ọgụgụ dị n’akwụkwọ Mkpughe a ga-ewere ka ọnụ ọgụgụ nkịtị.”