Gaa n'Isiokwu

Olee Otú Ị Ga-esi Abụ Enyi Chineke?

Olee Otú Ị Ga-esi Abụ Enyi Chineke?

Ihe Baịbụl kwuru

 Gị na Chineke nwere ike ịbụ enyi ma ọ bụrụ na ị na-amụta banyere ya ma na-eme ihe ndị na-atọ ya ụtọ. Mgbe ahụzi, Chineke ‘ga-abịaru gị nso.’ (Jems 4:8) Baịbụl mere ka obi sie anyị ike na “ọ nọghị n’ebe dị anya n’ebe onye ọ bụla n’ime anyị nọ.”​—Ọrụ Ndịozi 17:27.

 Ihe ndị anyị ga-eme ka anyị na Chineke bụrụ enyi

 Na-agụ Baịbụl

  •  Ihe Baịbụl kwuru: “Akwụkwọ Nsọ dum si n’ike mmụọ nsọ Chineke.”​—2 Timoti 3:16.

  •  Ihe ọ pụtara: Ọ bụ Chineke kwuru ihe e dere na Baịbụl. O tinyere echiche ya n’obi ndị dere Baịbụl. Chineke si n’akwụkwọ a pụrụ iche gwa anyị ihe bụ́ ebumnuche ya maka anyị. O mekwara ka anyị mara ụdị onye ọ bụ, ma ịhụnanya ya, obi ebere ya na otú o si kpọọ mmegbu asị.​—Ọpụpụ 34:6; Diuterọnọmi 32:4.

  •  Ihe i nwere ike ime: Na-agụ Baịbụl kwa ụbọchị. (Joshụa 1:8) Chebara ihe ị na-agụ echiche. Jụọ onwe gị, sị: ‘Gịnị ka ihe a m na-agụ na-akụziri m banyere ụdị onye Chineke bụ?’​—Abụ Ọma 77:12.

     Weregodị ihe atụ a, gụọ Jeremaya 29:​11, jụzie onwe gị, sị: ‘Gịnị ka Chineke na-echere m? Ọ bụ udo ka ọ̀ bụ ọdachi? Ọ̀ bụ onye na-ata mmadụ ahụhụ, ka ọ̀ chọrọ ka m nwee ọdịnihu ka mma?’

 Na-ekiri ihe ndị Chineke kere

  •  Ihe Baịbụl kwuru: “Àgwà [Chineke] ndị a na-apụghị ịhụ anya ka a na-ahụ nke ọma malite mgbe e kere ụwa gaa n’ihu, n’ihi na a na-aghọta ha site n’ihe ndị e kere eke.”​—Ndị Rom 1:20.

  •  Ihe ọ pụtara: Ihe ndị Chineke kere eke a na-ahụ anya na-eme ka anyị matakwuo ụdị onye Chineke bụ, dị nnọọ ka ihe osise ma ọ bụ ngwa ọrụ na-eme ka a mata ụdị onye rụpụtara ya ma ọ bụ onye sere ya. Dị ka ihe atụ, ihe ụbụrụ mmadụ ga-ebuli, na otú o si dị mgbagwoju anya na-eme ka anyị mara na Chineke nwere amamihe dị ukwuu. Ụdị ikike dị n’anyanwụ na kpakpando na-egosi ike dị ukwuu Chineke nwere.​—Abụ Ọma 104:24; Aịzaya 40:26.

  •  Ihe i nwere ike ime: Wepụta oge kirie ihe ndị Chineke kere eke ma mụọ banyere ha. Ka ị na-ekiri ha, jụọ onwe gị, sị, ‘Gịnị ka ihe ndị a e kere eke m na-ahụ na-agwa m banyere ụdị onye Chineke bụ?’ a Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị agaghị esili n’ihe ndị e kere eke mata ihe niile gbasara Onye Kere anyị. Ọ bụkwanụ ya mere o ji nye anyị Baịbụl.

 Na-akpọ Chineke aha ya

  •  Ihe Baịbụl kwuru: “M ga-echebe ya n’ihi na ọ matawo aha m. Ọ ga-akpọku m, m ga-azakwa ya.”​—Abụ Ọma 91:​14, 15.

  •  Ihe ọ pụtara: Chineke, onye aha ya bụ Jehova, na-elekọta ndị maara aha ya ma na-akwanyere aha ya ùgwù. b (Abụ Ọma 83:18; Malakaị 3:16) Ebe ọ bụ na Chineke n’onwe ya gwara anyị aha ya, ọ pụtara na ọ chọrọ ka anyị mara onye ọ bụ. Ọ sịrị: “Abụ m Jehova. Ọ bụ ya bụ aha m.”​—Aịzaya 42:8.

  •  Ihe i nwere ike ime: Kpọọ Jehova aha ya mgbe ọ bụla ị na-ekwu okwu banyere ya.

 Kpegara Jehova ekpere

  •  Ihe Baịbụl kwuru: “Jehova nọ ndị niile na-akpọku ya nso.”​—Abụ Ọma 145:18.

  •  Ihe ọ pụtara: Jehova na-abịaru ndị ji obi ha niile na-ekpegara ya ekpere nso. Ekpere bụ otu ụzọ anyị si efe Chineke, ọ na-egosikwa na anyị na-akwanyere Chineke ùgwù.

  •  Ihe i nwere ike ime: Na-ekpegara Chineke ekpere mgbe niile. (1 Ndị Tesalonaịka 5:17) Gwa ya mkpa gị niile nakwa otú obi dị gị.​—Abụ Ọma 62:8. c

 Nwee okwukwe n’ebe Chineke nọ

  •  Ihe Baịbụl kwuru: “Ọ bụrụkwa na okwukwe adịghị, ọ gaghị ekwe omume ime ihe dị [Chineke] ezi mma.”​—Ndị Hibru 11:6.

  •  Ihe ọ pụtara: Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka anyị na Chineke bụrụ enyi, anyị ga-enwerịrị okwukwe n’ebe ọ nọ. Na Baịbụl, mmadụ inwe okwukwe abụghị naanị na onye ahụ ga-ekweta na Chineke dị. Ihe ọ pụtakwara bụ na onye ahụ ga-atụkwasị ya obi kpamkpam, kwetasiekwa ike na ọ ga-emezu nkwa ndị o kwere. Obi ga-esikwa ya ike na otú ọ chọrọ ka anyị si na-ebi ndụ kacha mma. Mmadụ agaghị ekwuli na onye ọzọ bụ enyi ya ma ọ bụrụ na ọ tụkwasịghị onye ahụ obi.

  •  Ihe i nwere ike ime: Ọ bụ ihe mmadụ ma ga-eme ka onye ahụ nwee ezigbo okwukwe. (Ndị Rom 10:17) N’ihi ya, mụọ Baịbụl nke ọma ka obi nwee ike isi gị ike na ị ga-atụkwasịli Chineke obi, nakwa na iwu ndị o nyere bụ maka ọdịmma gị. Obi ga-atọ Ndịàmà Jehova ụtọ ma gị na ha mụwa Baịbụl. d

 Na-eme ihe dị Chineke mma

  •  Ihe Baịbụl kwuru: “Nke a bụ ihe ịhụ Chineke n’anya pụtara, ka anyị na-edebe ihe o nyere n’iwu.”​—1 Jọn 5:3.

  •  Ihe ọ pụtara: Jehova bụ enyi ndị na-agbalị ike ha niile ime ihe ndị o nyere n’iwu. Ha si otú a na-egosi na ha hụrụ ya n’anya.

  •  Ihe i nwere ike ime: Ka ị na-amụ Baịbụl, chọpụta ihe ndị Chineke kpọrọ asị na ihe ndị na-adị ya mma. Jụzie onwe gị, sị, ‘Olee mgbanwe ndị m kwesịrị ime ka m nwee ike ime ihe na-atọ Onye Kere m ụtọ?’​—1 Ndị Tesalonaịka 4:1.

 Chọpụta otú ime ihe Chineke kwuru si na-abara gị uru

  •  Ihe Baịbụl kwuru: “Detụnụ Jehova ire ma hụ na ọ dị mma.”​—Abụ Ọma 34:8.

  •  Ihe ọ pụtara: Chineke chọrọ ka i jiri anya gị hụ otú ya dịruru mma. Mgbe ọ bụla ị hụwara ihe ndị na-egosi na Chineke hụrụ gị n’anya, nakwa otú o si na-akwado gị, ị ga-achọ ịbụ enyi ya.

  •  Ihe i nwere ike ime: Ka ị na-agụ Baịbụl, na-eme ihe ndị e kwuru na ya, ị ga-ahụwa uru ndị ọ na-abara gị. (Aịzaya 48:​17, 18) Legharịakwa anya ka ị hụ ndị ime ihe Chineke kwuru baarala uru. Hụ otú Chineke si nyere ha aka imeri nsogbu ndị ha nwere, otú ndụ ha na nke ndị ezinụlọ ha si ka mma na otú ha si bido inwe ezigbo obi ụtọ ná ndụ. e

 Ihe ndị na-abụghị eziokwu ndị mmadụ na-eche banyere ịbụ enyi Chineke

 Ụgha: Chineke dị nnọọ ike, dịkwa nnọọ ukwuu nke na o nweghị otú ọ ga-esi achọ ka anyị na ya bụrụ enyi.

 Eziokwu: Ọ bụ eziokwu na Chineke bụ onye kacha ike ma n’eluigwe ma n’ụwa, dịkwa nnọọ ukwuu, ọ chọrọ ka anyị na ya bụrụ enyi. Baịbụl kọrọ banyere ọtụtụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị ha na Chineke bụ ezigbo enyi.​—Ọrụ Ndịozi 13:22; Jems 2:23.

 Ụgha: Anyị enweghị ike ịma onye Chineke bụ n’ihi na Chineke dị omimi.

 Eziokwu: E nwere ihe ụfọdụ banyere Chineke siri ike nghọta, dị ka na ọ bụ Mmụọ a na-adịghị ahụ anya. Ma nke a agaghị egbochi anyị ịma onye Chineke bụ. Baịbụl kwudịrị na anyị ga-amatarịrị Chineke ma ọ bụrụ na anyị chọrọ inweta ndụ ebighị ebi. (Jọn 17:3) Baịbụl ji okwu ndị anyị ga-aghọtali gwa anyị gbasara Onye Kere anyị, kọwaara anyị ụdị onye ọ bụ, gwa anyị ihe o bu n’obi kee ụmụ mmadụ na ụwa anyị a, gwakwa anyị otú Chineke chọrọ ka anyị si na-ebi ndụ. (Aịzaya 45:​18, 19; 1 Timoti 2:4) Dịkwa ka anyị kwuburu, Baịbụl mekwara ka anyị mara ihe bụ aha Chineke. (Abụ Ọma 83:18) Ihe ndị a niile ga-enyere anyị aka ọ bụghị naanị ka anyị mata onye Chineke bụ kama ka anyị bụrụ enyi ya.​—Jems 4:8.

a Ị chọọ ịmatakwu otú ihe ndị e kere eke si na-egosi amamihe Chineke, gụọ isiokwu na-agbakarịnụ bụ́ “È Kere Ya Eke?

b Ọtụtụ ndị na-ekwu na ihe aha ahụ bụ́ Jehova pụtara bụ “Ọ Na-eme Ka Ọ Bụrụ.” Ebe ọ bụ na Chineke gwara anyị aha ya, ihe ọ pụtara bụ na ihe Chineke na-agwa anyị bụ: ‘M ga-ahụ na ihe niile m chọrọ na ihe niile bụ nzube m ga-emerịrị. O nweghị ihe ga-eme ka okwu m niile ghara imezu.’

d Ị chọọ ịmatakwu banyere ya, lee vidio bụ́ Olee Otú Anyị na Ndị Mmadụ Si Amụ Baịbụl?

e Gụọ isiokwu ndị bụ́ “Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ..”