Ihe Ndị A Kọrọ na Baịbụl Gbasara Jizọs Hà Bụ Eziokwu?
Ihe Baịbụl kwuru
Mgbe Luk, onye so dee Baịbụl, na-akọ akụkọ gbasara Jizọs, ọ sị na ya leziri anya nke ọma nyochaa ihe ndị ya kọrọ bido ná mmalite ruo ná ngwụcha.—Luk 1:3.
Ụfọdụ ndị na-ekwu na mgbe ndịozi Jizọs nwụchara, ndị mmadụ gara degharịa akụkọ Matiu, Mak, Luk, na Jọn kọrọ gbasara Jizọs.
Ma, e nwere otu mpempe akwụkwọ ndị mgbe ochie a hụrụ n’Ijipt na nso nso a. Ihe a na-akpọ ya ugbu a bụ Papyrus Rylands 457 (P52). Ọ dị na n’otu ọ́bá akwụkwọ a na-akpọ Rylands Library, nke dị n’obodo Manchesta, n’Ingland. Ihe e dere na ya bụ ihe Jọn onyeozi dere na Jọn 18:31-33, 37, 38.
A hụla ọtụtụ mpempe akwụkwọ e dere Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, ma ọ bụ nke a kacha ha niile mee ochie. Ọtụtụ ndị ọkà mmụta kwuru na e dere ya ihe dị ka afọ iri abụọ na ise ka Jọn dechara nke ahụ o ji aka ya dee. Ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ otú ahụ Jọn si kọọ akụkọ ahụ ka e sikwa kọọ ya ná mpempe akwụkwọ a.