Gaa n'Isiokwu

Gịnị Ka M Ga-ekpe n’Ekpere?

Gịnị Ka M Ga-ekpe n’Ekpere?

Ihe Baịbụl kwuru

 I nwere ike ikpe ekpere rịọ Chineke ihe ọ bụla dabara n’uche ya otú Baịbụl kwuru. Baịbụl sịrị: “Ihe ọ bụla nke anyị rịọrọ ya dị ka uche ya si dị, ọ na-anụ olu anyị.” (1 Jọn 5:14) I nwere ike ịgwa Chineke ihe na-enye gị nsogbu n’obi. Baịbụl kwuru, sị: “Wụpụnụ obi unu n’ihu [Chineke] dị ka mmiri.”—Abụ Ọma 62:8.

Ihe ụfọdụ i nwere ike ikpe n’ekpere bụ:

  •   Ka Chineke nyere gị aka ka i nwee okwukwe n’ebe ọ nọ.—Luk 17:5.

  •   Ka o nye gị mmụọ nsọ ya, ma ọ bụ ike ya nke na-arụ ọrụ mgbe niile, ka i nwee ike ime ezi ihe.—Luk 11:13.

  •   Ka o nye gị ike ị ga-eji merie nsogbu ndị bịaara gị ma merie ọnwụnwa.—Ndị Filipaị 4:13.

  •   Ka o mee ka obi ruo gị ala.—Ndị Filipaị 4:6, 7.

  •   Ka o nye gị amamihe ị ga-eji na-eme mkpebi ndị dị mma.—Jems 1:5.

  •   Ka o nye gị nri ụbọchị.—Matiu 6:11.

  •   Ka ọ gbaghara gị mmehie gị.—Matiu 6:12.