Ihe E Ji Akụziri M Baịbụl
Ihe E Ji Akụziri M Baịbụl
ỤMỤAKA DỊ AFỌ ATỌ GBADAWA
Mmiri na-ezo.
Toochi ekwuo, sị,
“Mmiri a ekweghị m pụọ èzí.
Gịnị mere na mmiri a ekweghị akwụsị akwụsị?”
Ma, o juru Toochi anya
ịhụ na anyanwụ awaala,
mmiri ahụ akwụsịkwa izo.
Obi tọrọ Toochi ụtọ!
Ọ gbapụrụ n’èzí. Ị̀ ma ihe ọ hụrụ mgbe ọ gbapụrụ n’èzí? Ihe ọ hụrụ mara ezigbo mma.
Toochi kwuru, sị, “Amaghị m na ọ bụ mmiri ozuzo nke si n’aka Chineke na-eme ka okooko osisi puo!”
IHE NDỊ NNE NA NNA GA-EME
Gwa nwa gị ka o gosi gị:
Windo Toochi Okooko osisi
Nnụnụ Osisi
Lee ma ị̀ ga-ahụ ihe ndị a zoro ezo.
Abụzụ Ụgbọelu
Gụọ Ọrụ Ndịozi 14:17. Gịnị mere Jehova ji mee ka mmiri na-ezo?