Otú Mmụọ Chineke Si Duo Ndị Kraịst Na Narị Afọ Mbụ Na Otú O si Edu Ndị Kraịst Taa
Otú Mmụọ Chineke Si Duo Ndị Kraịst Na Narị Afọ Mbụ Na Otú O si Edu Ndị Kraịst Taa
“Ọrụ ndị a niile ka otu mmụọ nsọ ahụ na-arụ.”—1 KỌR. 12:11.
1. Olee ihe ndị anyị ga-atụle n’isiokwu a?
GỊNỊ na-agbata gị n’obi ma ị nụ okwu ahụ bụ́ Pentikọst? E nwere ihe pụrụ iche mere na Pentikọst 33 O. A. (Ọrụ 2:1-4) Chineke wụsara ndị ohu ya mmụọ nsọ n’ụbọchị ahụ. O si otú ahụ malite iji mmụọ nsọ na-edu ndị ohu ya n’ụzọ dị iche. N’isiokwu bu nke a ụzọ, anyị tụlere ụzọ ụfọdụ mmụọ Chineke si nyere ndị kwesịrị ntụkwasị obi aka n’oge ochie ha arụọ ọrụ tara akpụ e nyere ha. Ma, olee ihe dị iche n’otú mmụọ Chineke si duo ndị ohu Chineke tupu Kraịst abịa n’ụwa na otú o si duo Ndị Kraịst na narị afọ mbụ? Oleekwa otú mmụọ nsọ si enyere Ndị Kraịst aka taa? Ka anyị tụlee ajụjụ ndị a.
“Lee! . . . Nwa Agbọghọ Bụ́ Ohu Jehova!”
2. Olee otú mmụọ nsọ si rụọ ọrụ n’ahụ́ Meri?
2 Meri so nọrọ ná nnukwu ụlọ dị n’ụlọ elu na Jeruselem mgbe a wụsara ndị na-eso Ọrụ 1:13, 14) Ma, ọ hụla ihe mmụọ Jehova rụrụ n’ihe karịrị afọ iri atọ tupu ụbọchị ahụ a wụsara ndị na-eso ụzọ Jizọs mmụọ nsọ. Jehova si n’eluigwe bufee ndụ Ọkpara ya n’akpa nwa Meri mgbe ọ ka bụ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke ka e nwee ike ịmụ Ọkpara ya n’ụwa. Ọ bụ “mmụọ nsọ” mere ka ọ dị ime ahụ.—Mat. 1:20.
ụzọ Jizọs mmụọ nsọ e kwere ha ná nkwa. (3, 4. Olee otú Meri si kpaa àgwà, oleekwa otú anyị nwere ike isi na-eme ka ya?
3 Gịnị mere e ji nye Meri ihe ùgwù ahụ pụrụ iche? Mgbe mmụọ ozi Jehova gwachara Meri ihe bụ́ uche Jehova, Meri sịrị: “Lee! Abụ m nwa agbọghọ bụ́ ohu Jehova! Ka o mee dị ka i kwuru.” (Luk 1:38) Ihe Meri kwuru gosiri ụdị obi o nwere, bụ́kwa nke Chineke maara. Ihe o kwuru ozugbo e ziri ya ozi a gosiri na ọ dị njikere ịnabata ihe bụ́ uche Chineke n’okwu a. Ọ gaghị chewe otú ndị mmadụ ga-esi na-ele ya anya ma ya dịrị ime ma ọ bụkwanụ ihe nwoke kwere nkwa ịlụ ya ga-eme ma ọ nụ ya. Mgbe Meri kwuru na ya bụ onye kacha ala ná ndị ohu Jehova, o gosiri na ya tụkwasịrị Jehova obi kpamkpam nakwa na ya weere ya ka Nna ya ukwu.
4 Ò nwetụla mgbe ọ dị gị ka ọrụ e nyere gị n’ọgbakọ karịrị gị? Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya, sị, ‘M̀ tụkwasịrị Jehova obi kpamkpam na ọ ga-eme ka ihe niile gaa dị ka uche ya si dị? M̀ dị njikere n’eziokwu ịrụ ọrụ e nyere m?’ Ka obi sie gị ike na Chineke na-enye ndị tụkwasịrị ya obi kpamkpam na ndị na-eme uche ya mmụọ ya.—Ọrụ 5:32.
Mmụọ Nsọ Nyeere Pita Aka
5. Olee otú mmụọ nsọ si nyere Pita aka tupu Pentikọst nke afọ 33 O.A.?
5 Mmụọ nsọ kpakwara ike n’ahụ́ Pita onyeozi tupu Pentikọst 33 O.A otú ahụ o si kpaa ike n’ahụ́ Meri. Jizọs nyere ya na ndịozi Jizọs ndị ọzọ ikike ịchụpụ ndị mmụọ ọjọọ. (Mak 3:14-16) Ọ bụ eziokwu na e nweghị ọtụtụ ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru banyere nke a, o yiri ka Pita ò ji ikike ahụ rụọ ọrụ. Mmụọ nsọ Chineke nyekwaara Pita aka ịga ije n’elu mmiri mgbe Jizọs gwara ya ka o si n’elu Oké Osimiri Galili bịakwute ya. (Gụọ Matiu 14:25-29.) O doro anya na obi siri Pita ike na mmụọ nsọ ga-enyere ya aka ịrụ ọrụ ndị dị ike. N’oge na-adịghị anya, mmụọ nsọ ga-enyere Pita na ndị ọzọ na-eso ụzọ Jizọs aka ịrụ ihe ndị ọzọ.
6. Olee ihe mmụọ nsọ nyeere Pita aka ime na Pentikọst n’afọ 33 O.A. nakwa mgbe ọ gachara?
6 N’oge Ememme Pentikọst nke afọ 33 O.A., e nyere Pita na ndị ọzọ ikike ịsụ asụsụ ndị ala ọzọ bịara Jeruselem n’oge ahụ na-asụ. Pita gwaziri ìgwè mmadụ gbakọrọnụ okwu. (Ọrụ 2:14-36) E nwere mgbe Pita tụrụ ndị mmadụ ụjọ mee ihe ọ na-ekwesịghị, nweekwa oge ndị o mere ihe n’echebaraghị ha echiche. Ma ugbu a, ọ katara obi gbaara ndị mmadụ àmà n’agbanyeghị na a sị ha ekwusazila ozi ọma, na-akpagbukwa ha. (Ọrụ 4:18-20, 31) E nwekwara mgbe Chineke mere ka ọ mata ihe e zoro ezo. (Ọrụ 5:8, 9) E nwedịrị mgbe e nyere ya ikike ịkpọlite onye nwụrụ anwụ n’ọnwụ.—Ọrụ 9:40.
7. Olee ihe Jizọs kụziri bụ́ ndị dokwuru Pita anya mgbe e jichara mmụọ nsọ tee ya mmanụ?
7 Tupu Pentikọst, Pita ghọtadịrị ọtụtụ eziokwu ndị Jizọs kụziiri ha. (Mat. 16:16, 17; Jọn 6:68) Ma, e nwere ụfọdụ ihe Jizọs kụziri bụ́ ndị na-edochaghị ha anya tupu Pentikọst. Dị ka ihe atụ, Pita aghọtaghị na a ga-akpọlite Kraịst n’ọnwụ n’ụbọchị nke atọ ya aghọọ mmụọ, ọ ghọtaghịkwa na Alaeze Jizọs ga-adị n’eluigwe. (Jọn 20:6-10; Ọrụ 1:6) Pita aghọtachaghị otú mmadụ ga-esi ghọọ mmụọ ma na-achị n’Alaeze eluigwe. Ọ bụ mgbe e jichara mmụọ nsọ mee ya baptizim ya esoro na ndị nwere olileanya ịga eluigwe ka ọ ghọtara ihe ndị a Jizọs kụziri.
8. Olee ihe ma ndị e tere mmanụ ma “atụrụ ọzọ” na-aghọta?
Efe. 3:8-11, 18) Taa, ma ndị e tere mmanụ ma “atụrụ ọzọ” na-amụcha eziokwu ndị ahụ ma na-aghọta ha. (Jọn 10:16) Obi ọ̀ dị gị ụtọ na mmụọ nsọ na-enyere gị aka ịmụta ihe dị n’Okwu Chineke na ịghọta ya?
8 Ọ bụ mgbe a wụsachara ndị na-eso ụzọ Jizọs mmụọ nsọ ka ha ghọtara ihe ndị ha na-aghọtabughị. Mmụọ nsọ nyere ndị dere Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst ike ha edee ihe ndị dị ezigbo mkpa gbasara nzube Jehova, bụ́ ndị baara anyị uru. (Pọl “Jupụtara na Mmụọ Nsọ”
9. Olee ihe mmụọ nsọ nyere Pọl ike ime?
9 E nwere onye ọzọ natara mmụọ nsọ mgbe ihe dị ka otu afọ gachara ka a wụsachara ndị na-eso ụzọ Jizọs mmụọ nsọ na Pentikọst nke afọ 33 O.A. Ọ bụ Sọl, onye e mechara kpọwa Pọl. Mmụọ nsọ nyere Pọl ike ime ihe ndị na-abara anyị uru taa. E nyere Pọl onyeozi ike mmụọ nsọ ide akwụkwọ iri na anọ dị na Baịbụl. Mmụọ nsọ nyekwaara Pọl aka otú o si nyere Pita. O mere ka Pọl ghọta na e nwere ndị ga-aga eluigwe eyikwasị ha anwụghị anwụ na ereghị ure, meekwa ka ọ kọwaa ya otú doro anya. Mmụọ nsọ nyere Pọl ike ya agwọọ ndị ọrịa, mee ka ndị mmụọ ọjọọ ji nwere onwe ha, kpọlitedị ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. Ma, e nwere ihe ọzọ ka mkpa mmụọ nsọ nyere ya ike ime, bụ́kwanụ nke a na-enye ndị ohu Chineke niile ike ime taa, ọ bụ eziokwu na a naghị enye ha ya n’ụzọ ọrụ ebube.
10. Olee otú mmụọ nsọ si mee ka Pọl nwee ike ikwu okwu?
10 Pọl, bụ́ onye “jupụtara na mmụọ nsọ,” ji obi ike baara otu dibịa afa mba. Nke a masịrị onye na-achị Saịprọs, bụ́ onye nọ na-ege ntị mgbe ahụ. Onye ahụ na-achị Saịprọs nabatara eziokwu, “n’ihi na ozizi Jehova juru ya anya.” (Ọrụ 13:8-12) O doro anya na Pọl ma nke ọma otú mmụọ Chineke si enyere mmadụ aka ikwu eziokwu. (Mat. 10:20) O mechara rịọ ọgbakọ dị n’Efesọs ka ha rịọchitere ya arịrịọ ka e mee ka o nwee “ike ikwu okwu.”—Efe. 6:18-20.
11. Olee otú mmụọ nsọ si duo Pọl?
11 Ọ bụ eziokwu na mmụọ nsọ mere ka Pọl nwee ike ikwu okwu, e nwere mgbe o gbochiri ya ikwu okwu n’obodo ụfọdụ. Mgbe Pọl na-eje ozi ala ọzọ, mmụọ Chineke duru ya. (Ọrụ 13:2; gụọ Ọrụ Ndịozi 16:6-10.) Jehova ka na-eji mmụọ ya eduzi ọrụ nkwusa anyị. Dị ka Pọl mere, ndị ohu Jehova niile na-erubere ya isi na-agbasi mbọ ike iji obi ike na ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma. Ọ bụ eziokwu na otú Chineke si eji mmụọ ya edu anyị taa dị iche n’otú o si duo Ndị Kraịst n’oge Pọl, ka obi sie anyị ike na Jehova na-eji mmụọ nsọ eme ka ndị kwesịrị ekwesị nụ eziokwu ahụ.—Jọn 6:44.
“Onyinye Dị Iche Iche”
12-14. Mmụọ nsọ ọ̀ na-arụ otu ọrụ n’ahụ́ ndị ohu Chineke niile? Kọwaa.
12 O doro anya na akụkọ banyere otú Jehova si gọzie ọgbakọ ndị e nwere na narị afọ mbụ, bụ́ ndị ndị nọ na ha bụ ndị e tere mmanụ, na-agba ndị ohu Chineke raara 1 Kọr. 12:4-6, 11) N’eziokwu, mmụọ nsọ nwere ike ịrụ ọrụ otú dị iche iche n’ahụ́ ohu Chineke nke ọ bụla maka nzube dị iche. Ma “ìgwè atụrụ nta” Kraịst ma “atụrụ ọzọ” ya nwere ike inweta mmụọ nsọ. (Luk 12:32; Jọn 10:16) Ma, ọ bụghị mgbe niile ka mmụọ nsọ na-arụ otu ụdị ọrụ n’ahụ́ onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ.
onwe ha nye Jehova taa ume. Cheta ihe Pọl gwara ọgbakọ dị na Kọrịnt banyere onyinye pụrụ iche mmụọ nsọ nyere ha. Ọ sịrị: “E nwere onyinye dị iche iche, ma e nwere otu mmụọ nsọ ahụ; e nwekwara ije ozi dị iche iche, ma e nwere otu Onyenwe anyị ahụ; e nwekwara ịrụ ọrụ dị iche iche, ma ọ bụ otu Chineke ahụ bụ́ onye na-arụ ihe niile n’ime mmadụ niile.” (13 Dị ka ihe atụ, e ji mmụọ nsọ họpụta ndị okenye. (Ọrụ 20:28) Ma, ọ bụghị ndị niile e ji mmụọ nsọ tee mmanụ bụ ndị okenye. Olee ihe nke a na-eme ka anyị ghọta? Ọ na-eme ka anyị ghọta na mmụọ nsọ na-arụ ọrụ dị iche iche n’ahụ́ ndị nọ n’ọgbakọ.
14 Ọ bụ otu mmụọ ahụ nke na-eme ka ndị e tere mmanụ mara na ha bụ “ndị e doro dị ka ụmụ” ka Jehova ji kpọlite Ọkpara ọ mụrụ naanị ya n’ọnwụ ka ọ bụrụ onye na-anaghị anwụ anwụ n’eluigwe. (Gụọ Ndị Rom 8:11, 15.) Ọ bụkwa otu mmụọ ahụ ka Jehova ji kee eluigwe na ụwa nakwa ihe ndị dị n’ime ha. (Jen. 1:1-3) O jikwa otu mmụọ ahụ mee ka Bezalel ruo eruo ịrụ ọrụ pụrụ iche n’ụlọikwuu, jiri ya nye Samsịn ike o ji rụọ ọrụ ndị dị egwu, jirikwa ya mee ka Pita nwee ike ije ije n’elu mmiri. N’ihi ya, ka anyị ghara iche na ọ bụ naanị ndị e ji mmụọ nsọ tee mmanụ ka mmụọ nsọ na-edu. Iji mmụọ nsọ tee mmadụ mmanụ bụ otu n’ime ọrụ pụrụ iche e ji mmụọ nsọ arụ. Ọ bụ naanị ndị Chineke họọrọ ka ọ na-eji mmụọ nsọ ete mmanụ.
15. À ga na-eji mmụọ nsọ na-eme ndị mmadụ baptizim ruo mgbe ebighị ebi? Kọwaa.
15 Mmụọ nsọ na-arụ ọrụ dị iche iche n’ahụ́ ndị ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi kemgbe ụwa, ya bụ, kemgbe ọtụtụ puku afọ tupu a malite iji ya na-ete ụfọdụ ndị mmanụ. Na Pentikọst nke afọ 33 O.A., a malitere iji mmụọ nsọ na-ete ụfọdụ ndị mmanụ, ma, a gaghị na-eme nke a ruo mgbe ebighị ebi. A ga-akwụsị iji mmụọ nsọ na-eme ndị mmadụ baptizim, ma mmụọ nsọ ga na-arụ ọrụ n’ahụ́ ndị ohu Chineke ka ha nwee ike ịna-eme uche ya ruo mgbe ebighị ebi.
16. Olee ihe mmụọ nsọ na-enyere ndị ohu Chineke aka ha ana-eme taa?
16 Olee ihe mmụọ Jehova na-eme ka a na-arụ n’ụwa taa? Mkpughe 22:17 kwuru ihe ọ bụ. Ọ sịrị: “Mmụọ nsọ na nwaanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ na-asị: ‘Bịa!’ Onye ọ bụla nke nụrụ ya, ya sịkwa: ‘Bịa!’ Onye ọ bụla nke akpịrị na-akpọ nkụ, ya bịakwa; onye ọ bụla nke chọrọ, ya nara mmiri nke ndụ ahụ n’efu.” Mmụọ Chineke na-eme ka Ndị Kraịst nke oge a na-akpọ “onye ọ bụla nke chọrọ” òkù ka ọ bịa nara mmiri nke ndụ n’efu. Ndị Kraịst e tere mmanụ na-ebute ụzọ na nke a. Ma, atụrụ ọzọ ahụ na-eso ha akpọ òkù a. Ọ bụ otu mmụọ nsọ ahụ na-edu ma ndị e tere mmanụ ma atụrụ ọzọ ahụ. Ma ndị e tere mmanụ ma atụrụ ọzọ ararala onwe ha nye Jehova, emeekwa ha baptizim “n’aha nke Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ.” (Mat. 28:19) Ha niile na-ekwe ka mmụọ Chineke na-enyere ha aka ịkpa àgwà na-egosi na ha nwere mkpụrụ nke mmụọ nsọ. (Gal. 5:22, 23) Atụrụ ọzọ ahụ na-ekwekwa ka mmụọ nsọ na-enyere ha aka otú o si enyere ndị e tere mmanụ. Nke a na-emekwa ka ha na-agbasi mbọ ike na-eme ihe Jehova chọrọ, nke na-eme ka ha dịrị nsọ.—2 Kọr. 7:1; Mkpu. 7:9, 14.
Na-arịọ Ka E Nye Gị Mmụọ Nsọ
17. Olee ihe ga-egosi na mmụọ nsọ na-arụ ọrụ n’ime anyị?
17 Ma ì nwere olileanya ịga eluigwe ma 2 Kọr. 4:7) Ndị ọzọ nwere ike ịna-akwa gị emo ma ị na-ekwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke. Ma, cheta na “ọ bụrụ na a na-akọcha [gị] n’ihi aha Kraịst, [i] nwere obi ụtọ, n’ihi na mmụọ nke ebube, ya bụ, mmụọ nke Chineke, dịkwasịrị [gị].”—1 Pita 4:14.
ọ̀ bụ nke ịdị ndụ ebighị n’ụwa, Jehova nwere ike inye gị “ike karịrị ike nkịtị” ka i nwee ike ịna-eme uche ya mgbe niile ma nweta ụgwọ ọrụ. (18, 19. Olee otú Jehova ga-esi eji mmụọ nsọ ya nyere gị aka, gịnịkwa ka i kpebisiri ike ime?
18 Mmụọ nsọ bụ onyinye Chineke na-enye ndị na-achọsi mmụọ nsọ ike. O nwere ike ime ka anyị na-eme ihe niile anyị nwere ike ime n’ozi Jehova. “Ọ bụ Chineke na-arụ ọrụ n’ime unu, n’ihi ihe dị ya ụtọ, ka unu wee na-enwe ọchịchọ ma na-eme ihe.” Mmụọ nsọ e nyere anyị na mbọ anyị na-agbasi ike ‘ijidesi okwu nke ndụ ike,’ ga-eme ka anyị nwee ike ‘iji egwu na ịma jijiji na-eme ihe ga-ewetara anyị nzọpụta.’—Fil. 2:12, 13, 16.
19 Ebe obi siri gị ike na mmụọ nsọ ga-enyere gị aka, na-arụsi ọrụ ọ bụla Chineke nyere gị ike, na-arụ ya nke ọma, na-arịọkwa Jehova ka o nyere gị aka. (Jems 1:5) Ọ ga-enyere gị aka ịghọta Okwu ya, idi nsogbu ndị bịaara gị, na ikwusa ozi ọma. Jizọs gwara anyị, sị: “Na-arịọnụ, a ga-enye unu; na-achọnụ, unu ga-achọta; na-akụnụ aka, a ga-emeghere unu.” Mmụọ nsọ sokwa n’ihe ndị a ga-enye anyị ma anyị rịọ maka ya. (Luk 11:9, 13) Na-arịọ Jehova ka ị dị ka ndị fere ya ofufe, ma ndị nke oge ochie ma ndị nke oge a, bụ́ ndị mmụọ nsọ duru.
Ì Nwere Ike Ịkọwa?
• Dị ka Meri mere, olee àgwà anyị nwere ike ịna-akpa Chineke agọzie anyị?
• Olee otú o si bụrụ na mmụọ nsọ duru Pọl?
• Olee otú mmụọ nsọ si edu ndị ohu Chineke taa?
[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]
[Foto dị na peeji nke 24]
Mmụọ Chineke nyere Pọl ike ịbara onye ndị mmụọ ọjọọ na-enye ike mba
[Foto dị na peeji nke 26]
Taa, mmụọ nsọ na-enyekwara Ndị Kraịst niile aka n’agbanyeghị ihe bụ́ olileanya ha