“Onye Ọ Bụla Ga-ebu Ibu nke Ya”
“Onye Ọ Bụla Ga-ebu Ibu nke Ya”
“Onye ọ bụla n’ime anyị ga-aza Chineke ajụjụ maka onwe ya.” —Ndị Rom 14:12.
1. Olee ezi mkpebi ụmụ okorobịa Hibru atọ mere?
ỤMỤ okorobịa Hibru atọ bi na Babilọn aghaghị ime mkpebi metụtara ọnwụ na ndụ. Hà ga-akpọ isiala nye nnukwu ihe oyiyi, bụ́ nke iwu obodo ahụ kwuru ka a kpọọrọ isiala? Ka hà ga-ajụ ife ya ka a tụba ha n’oké ọkụ? E nyeghị Shedrak, Mishak, na Abednego ohere ịjụ onye ọ bụla ihe ha ga-eme; ọ dịghịkwanụ ha mkpa ịjụ onye ọ bụla. N’egbughị oge, ha kwuru, sị: “Mara, eze, na chi gị nile ka anyị na-agaghị adị na-efe, ọ bụkwa onyinyo ọlaedo ahụ nke i guzobeworo ọtọ ka anyị na-agaghị akpọ isiala nye.” (Daniel 3:1-18) Ndị Hibru atọ ahụ buuru ibu dịịrị ha.
2. Ònye n’ezie kpebiiri Paịlet ihe ọ ga-eme banyere Jizọs Kraịst, nke ahụ ò mekwara ka ụta ghara ịdịrị onye ọchịchị Rom ahụ?
2 Ihe dị ka narị afọ isii ka nke ahụ gasịrị, otu onye ọchịchị nụrụ ebubo ndị e boro otu nwoke. Mgbe o lebara anya n’okwu ahụ, ọ bịara doo ya anya na aka nwoke ahụ dị ọcha. Otú ọ dị, ìgwè mmadụ nọgidere na-ekwu ka e gbuo ya. Mgbe onye ọchịchị ahụ gbalịtụrụ ịtọhapụ nwoke ahụ, ọ hapụrụ ọrụ dịịrị ya ma kwere ka e gbuo nwoke ahụ. Ọ kwọrọ aka ya ma kwuo, sị: “Aka m dị ọcha n’ebe ọbara nwoke a dị.” O nyefeziri ha nwoke ahụ ka ha gaa kpọgbuo ya. Ee, kama ịrụ ọrụ dịịrị ya nke bụ́ ime mkpebi banyere Jizọs Kraịst, Pọntiọs Paịlet kwere ka ndị ọzọ meere ya mkpebi. Ọ dịghị mmiri ga-asachapụli ihe ọjọọ ahụ o mere site n’ịma Jizọs ikpe n’ụzọ na-ezighị ezi.—Matiu 27:11-26; Luk 23:13-25.
3. N’ihi gịnị ka anyị na-ekwesịghị iji hapụ ndị ọzọ ka ha na-emere anyị mkpebi?
3 Olee banyere gị? Mgbe i nwere mkpebi ime, ị̀ na-eme ka ndị Hibru atọ ahụ, ka ị̀ na-ahapụ ndị ọzọ ka ha meere gị ya? Ime mkpebi adịghị mfe. Ọ na-achọ mmadụ itozu okè iji mee mkpebi ndị ziri ezi. Dị ka ihe atụ, ọ dị mkpa ka ndị nne na nna meere ụmụ ha Ndị Galeshia 6:1, 2) Kama nke ahụ, ọ bụ ibu nke “onye ọ bụla n’ime anyị ga-aza Chineke ajụjụ maka ya.” (Ndị Rom 14:12) Bible kwuru, sị: “Onye ọ bụla ga-ebu ibu nke ya.” (Ndị Galeshia 6:5) N’ihi ya, olee otú anyị pụrụ isi na-eme mkpebi ndị amamihe dị na ha ná ndụ? Nke mbụ, anyị aghaghị ịghọta adịghị ike anyị dị ka ụmụ mmadụ na ihe anyị kwesịrị ime iji merie ha.
ndị obere ezi mkpebi. Otú ọ dị, ime mkpebi na-esi nnọọ ike mgbe e nwere ọnọdụ tara akpụ na mgbe e nwere ihe dị iche iche a ga-atụle. Otú ọ dị, ibu ọrụ nke ime mkpebi adịghị arọ nke na a ga-agụnye ya ‘n’ibu arụ,’ ma ọ bụ ihe ndị na-enye nsogbu, ndị “ndị ruru eru n’ụzọ ime mmụọ” pụrụ inyere anyị aka buo. (Isi Ihe Dị Mkpa
4. Olee ihe dị ezigbo mkpa anyị kwesịrị ịmụta site ná nnupụisi di na nwunye mbụ ahụ?
4 Obere oge ka e kesịrị mmadụ, di na nwunye mbụ mere mkpebi nke kpatara ọdachi. Ha kpebiri iri mkpụrụ sitere n’osisi ịma ezi ihe na ihe ọjọọ. (Jenesis 2:16, 17) Olee ihe mkpebi ha dabeere na ya? Bible na-ekwu, sị: “Nwanyị wee hụ na osisi ahụ dị mma ihe oriri, na ọ bụkwa ihe na-agụ anya agụụ ile, na ihe a na-achọsi ike ka osisi ahụ bụkwa ime ka mmadụ nwee uche, o were ụfọdụ n’ime mkpụrụ ya, rie; o nyekwa di ya, tinyere onwe ya, o wee rie.” (Jenesis 3:6) Ihe mere Iv ji mee mkpebi ahụ o mere bụ n’ihi na ọ na-eche nanị banyere onwe ya. Omume ya mere ka Adam sonyere ya. N’ihi ya, mmehie na ọnwụ ‘gbasara ruo mmadụ nile.’ (Ndị Rom 5:12) Nnupụisi Adam na Iv kwesịrị ịkụziri anyị otu ihe dị mkpa banyere adịghị ike mmadụ: Ọ gwụla ma mmadụ ò kwere ka Chineke na-eduzi ya, ọ ga na-eme mkpebi ndị na-ezighị ezi.
5. Olee nduzi Jehova nyeworo anyị, oleekwa ihe anyị na-aghaghị ime iji rite uru na ya?
5 Anyị kwesịrị nnọọ inwe obi ụtọ na Jehova Chineke na-eduzi anyị! Akwụkwọ Nsọ na-agwa anyị, sị: “Ntị gị abụọ ga-anụkwa okwu n’azụ gị, sị, Nke a bụ ụzọ, jeenụ ije n’ime ya; mgbe unu na-eche ihu n’aka nri, na mgbe unu na-eche ihu n’aka ekpe.” (Aịsaịa 30:21) Jehova na-eji Okwu ya, bụ́ Bible e dere n’ike mmụọ nsọ, agwa anyị okwu. Anyị aghaghị ịmụ Akwụkwọ Nsọ ma mata ya nke ọma. Iji mee mkpebi ndị ziri ezi, anyị kwesịrị ịdị na-eri “nri siri ike [nke] dịịrị ndị tozuru okè.” Anyị na-esitekwa ‘n’iji ikike nghọta anyị eme ihe zụọ ya ịmata ọdịiche dị n’ihe ziri ezi na ihe ọjọọ.’ (Ndị Hibru 5:14) Anyị pụrụ ịzụ ikike nghọta anyị site n’itinye ihe ndị anyị na-amụta n’Okwu Chineke n’ọrụ.
6. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka akọnuche anyị na-arụ ọrụ nke ọma?
6 Akọnuche anyị na-arụ ọrụ dị mkpa ná mkpebi ndị anyị na-eme. Akọnuche anyị nwere ike ikpe anyị ikpe, o nwekwara ike ‘ibo anyị ebubo ma ọ bụ ọbụna ịgọpụ anyị.’ (Ndị Rom 2:14, 15) Otú ọ dị, ọ bụrụ na anyị chọrọ ka akọnuche anyị na-arụ ọrụ nke ọma, anyị aghaghị iji Okwu Chineke zụọ ya ma mee ka ọ na-akpali anyị itinye Okwu Chineke n’ọrụ. Omenala na-emetụtakarị akọnuche a na-azụghị azụ. Ebe anyị bi na echiche ndị ọzọ pụkwara iduhie anyị. Gịnị na-eme akọnuche anyị ma ọ bụrụ na anyị ana-elegharakarị ihe ndị ọ gwara anyị anya ma na-eme ihe ndị megidere ụkpụrụ Chineke? Ka oge na-aga, ọ pụrụ iyi ihe “e ji ígwè ọkụ” daa, dị ka ahụ́ siri esi—nke ihe na-anaghị afụ ụfụ. (1 Timoti 4:2) N’aka nke ọzọ, akọnuche e ji Okwu Chineke zụọ pụrụ ịbụ ezi ihe nduzi.
7. Olee isi ihe dị anyị mkpa iji na-eme mkpebi ndị amamihe dị na ha?
7 Ya mere, ihe bụ́ isi dị mmadụ mkpa iji na-eme mkpebi ndị amamihe dị na ha bụ inwe ezi ihe ọmụma sitere n’Akwụkwọ Nsọ na inwe ike itinye ya n’ọrụ. Kama ime mkpebi n’echeghị ya eche, anyị kwesịrị iwepụta oge chọpụta ihe bụ́ ụkpụrụ Chineke ma jiri ikike iche echiche anyị tinye ya n’ọrụ. Ọbụna mgbe ọ dị anyị mkpa ime mkpebi ozugbo—dị ka ọ dị Shedrak, Mishak, na Abednego—anyị ga-adị nnọọ njikere ma ọ bụrụ na anyị nwere ezi ihe ọmụma nke Okwu Chineke ma jiri ya zụọ akọnuche anyị. Iji ghọta otú ịgbalị itozu okè pụrụ isi nyekwuoro anyị aka n’ime mkpebi, ka anyị tụlee akụkụ abụọ nke ndụ.
Olee Ndị Anyị na Ha Ga Na-akpakọrịta?
8, 9. (a) Olee ụkpụrụ ndị na-egosi na ọ dị mkpa izere mkpakọrịta ọjọọ? (b) Mkpakọrịta ọjọọ ọ̀ bụ nanị mgbe anyị so ndị na-akpa àgwà ọjọọ na-akpakọrịta ihu na ihu? Kọwaa.
8 Pọl onyeozi dere, sị: “Ka a ghara iduhie unu. Mkpakọrịta ọjọọ na-emebi àgwà bara uru.” (1 Ndị Kọrint 15:33) Jizọs Kraịst gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Unu abụghị akụkụ nke ụwa.” (Jọn 15:19) Mgbe anyị mụtara ụkpụrụ ndị a, anyị na-aghọta nnọọ na ọ dị mkpa ka anyị zere iso ndị na-akwa iko, ndị bụ́ di ma ọ bụ nwunye na-akwa iko, ndị ohi, ndị aṅụrụma, na ndị na-akpa àgwà ndị dị otú ahụ na-akpakọrịta. (1 Ndị Kọrint 6:9, 10) Otú ọ dị, ka anyị na-amụtakwu eziokwu Bible, anyị na-aghọta na iso ndị dị otú ahụ anọkọ site n’ikiri ha na fim, na telivishọn, n’ihu kọmputa ma ọ bụ n’ịgụ banyere ha n’akwụkwọ dị nnọọ njọ dị ka iso ha akpakọrịta ihu na ihu. A pụkwara ikwu otu ihe ahụ banyere iso “ndị ihu abụọ” ekwurịta okwu n’ebe a na-ekwurịta okwu n’Intanet.—Abụ Ọma 26:4.
9 Olee banyere anyị na ndị ọ pụrụ ịbụ na ha na-akpa ezi àgwà ma bụrụ ndị na-ekweghị n’ezi Chineke ahụ ịkpachi anya? Akwụkwọ Nsọ na-agwa anyị, sị: “Ụwa dum dị n’ike aka nke ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19) Anyị na-aghọta na mkpakọrịta ọjọọ abụghị nanị iso ndị na-anabata ihe ọjọọ ma ọ bụ ndị omume ha rụrụ arụ na-akpakọrịta. N’ihi ya, ọ bụ ihe amamihe dị na ya iso nanị ndị hụrụ Jehova n’anya na-akpachi anya.
10. Olee ihe na-enyere anyị aka ime mkpebi dị ka ndị tozuru okè n’ihe banyere otú anyị na ndị ụwa ga na-emekọrịtaru ihe?
10 Ọ gaghị ekwe omume izere iso ndị ụwa emekọrịta ihe ọ bụla, nke ahụ abụghịkwa ihe a chọrọ anyị n’aka. (Jọn 17:15) Ikwusa ozi ọma, ịga akwụkwọ, ịga ọrụ na-emecha ka anyị na ndị ụwa na-emekọrịta ihe. Onye Kraịst di ya ma ọ bụ nwunye ya bụ onye na-ekweghị ekwe pụrụ iso ndị ụwa na-emekọ ihe karịa ndị ọzọ. Otú ọ dị, ọ bụrụ na anyị azụọ ikike nghọta anyị azụọ, anyị ga-aghọta na anyị na ndị ụwa imekọrịta ihe ụfọdụ mgbe ọ dị mkpa na anyị na ha ịkpachi anya abụtụghị otu ihe. (Jems 4:4) N’ihi ya, anyị na-enwe ike ime mkpebi dị ka ndị tozuru okè mgbe anyị na-ekpebi ma ànyị ga-eso eme ihe ndị a na-eme ma a gbasaa akwụkwọ, dị ka egwuregwu ụlọ akwụkwọ na ịgba egwú, nakwa mgbe anyị na-ekpebi ma ànyị ga-aga nnọkọ oriri na nkwari na oriri ndị a na-emere ndị ọrụ ibe anyị.
Ịhọrọ Ọrụ
11. Olee ihe mbụ anyị ga-atụle mgbe anyị na-eme mkpebi ndị metụtara ọrụ?
11 Itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ dị ka ndị tozuru okè na-enyere anyị aka mgbe anyị na-ekpebi otú anyị ga-esi ‘na-egboro ndị ezinụlọ anyị mkpa ha.’ (1 Timoti 5:8) Ihe mbụ anyị ga-atụle bụ ọrụ ahụ n’onwe ya—ihe ọ ga-achọ ka anyị na-eme. Ọ bụ nnọọ ihe na-ezighị ezi ịhọrọ ọrụ na-akwado ihe Bible katọrọ kpọmkwem. N’ihi ya, Ndị Kraịst anaghị anara ọrụ ndị nwere ike ịgụnye ikpere arụsị, izu ohi, iji ọbara eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, ma ọ bụ ihe ndị ọzọ Akwụkwọ Nsọ katọrọ. Anyị agaghịkwa agha ụgha ma ọ bụ ghọgbuo mmadụ, ma a sịgodị na onye anyị na-arụrụ ọrụ agwa anyị mee otú ahụ.—Ọrụ 15:29; Mkpughe 21:8.
12, 13. Olee ihe ndị ọzọ ọ dị mkpa ka anyị tụlee mgbe anyị na-eme mkpebi ndị metụtara ọrụ ma e wezụga ọrụ ahụ n’onwe ya?
12 Gịnị ma ọ bụrụ na ọ dịghị ihe ọ bụla Chineke chọrọ anyị n’aka nke ọrụ ahụ n’onwe ya megidere? Ka anyị na-amụtakwu eziokwu ahụ ma na-azụkwu ikike nghọta anyị, anyị na-abịa ghọta ihe ndị ọzọ anyị na-aghaghị ịtụle. Gịnị ma ọ bụrụ na ọrụ ahụ ga-eme ka anyị tinye aka n’ihe Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị, dị ka ịza fon n’ebe a na-agba chaa chaa? Ebe anyị ga-anọ rụọ ọrụ ahụ na ebe a ga-esi nweta ego a ga-eji kwụọ anyị ụgwọ kwesịkwara ka anyị tụlee ha. Dị ka ihe atụ, Onye Kraịst bụ́ onye ọrụ ngo kwụụrụ onwe ya ọ̀ ga-etinye akwụkwọ ka e nye ya ọrụ ga-emetụta ite ụlọ chọọchị Krisendọm agba ma si otú ahụ kere òkè n’ịkwado okpukpe ụgha?—2 Ndị Kọrint 6:14-16.
13 Gịnị ma ọ bụrụ na onye anyị na-arụrụ ọrụ anata ọrụ ite ebe a na-anọ efe ofufe ágbá? N’ọnọdụ a, ọ ga-adị mkpa ka anyị tụlee ihe ndị dị ka otú anyị nweruru ikike ịchịkwa ihe a na-eme na otú anyị ga-ekereru òkè n’ọrụ ahụ. Gịnịkwa maka ijere ọha ozi dị mma, dị ka ike akwụkwọ ozi n’ebe nile n’obodo, gụnyere ebe ndị na-akwado omume rụrụ arụ? Ụkpụrụ ahụ dị na Matiu 5:45 ọ́ gaghị emetụta mkpebi anyị? Anyị agaghị eleghara otú ịrụ ọrụ ahụ kwa ụbọchị nwere ike isi metụta akọnuche anyị anya. (Ndị Hibru 13:18) N’ezie, ibu ibu dịịrị anyị nke ime mkpebi dị ka ndị tozuru okè n’ihe metụtara ọrụ chọrọ ka anyị mee ka ikike nghọta anyị dịkwuo nkọ ma zụọ akọnuche Chineke nyere anyị azụọ.
“N’ụzọ Gị Nile Mara Ya”
14. Mgbe anyị na-eme mkpebi, olee ihe ndị anyị kwesịrị ime?
14 Oleekwanụ banyere mkpebi ndị anyị na-eme banyere ihe ndị ọzọ, dị ka agụmakwụkwọ na ịnabata ma ọ bụ ịjụ ụdị ọgwụgwọ ụfọdụ? Mgbe anyị nwere mkpebi ọ bụla ime, anyị aghaghị ịchọpụta ụkpụrụ Bible ndị metụtara ya ma jirizie ikike iche echiche anyị tinye ụkpụrụ ndị ahụ n’ọrụ. Eze Solomọn maara ihe nke Izrel oge ochie kwuru, sị: “Tụkwasị Jehova obi gị nile, adaberekwala [ná] nghọta gị: n’ụzọ gị nile mara Ya, Ya onwe ya ga-emekwa ka okporo ụzọ gị nile zie ezie.”—Ilu 3:5, 6.
15. Olee ihe anyị na-amụta n’aka Ndị Kraịst oge mbụ n’ihe banyere ime mkpebi?
15 Mgbe mgbe, mkpebi ndị anyị na-eme na-emetụta ndị ọzọ, ọ dịkwa mkpa ka anyị chebara nke a echiche. Dị ka ihe atụ, Ndị Kraịst narị afọ mbụ anọghịzi n’okpuru ọtụtụ iwu ndị kagburu iri ihe oriri ụfọdụ bụ́ ndị dị n’Iwu Mozis. Ha nwere ike ikpebi iri ụdị nri ụfọdụ Iwu ahụ kagburu, bụ́kwa ndị na-adịghị ihe ọzọ megidere ha. N’agbanyeghị nke ahụ, Pọl onyeozi dere banyere anụ pụrụ inwe ihe jikọrọ ya na ụlọ arụsị, sị: “Ọ bụrụ na ihe oriri na-eme ka nwanna m sụọ ngọngọ, m gaghị atakwa anụ ọzọ ma ọlị, ka m 1 Ndị Kọrint 8:11-13) A gbara Ndị Kraịst oge mbụ ume ka ha na-echebara akọnuche ndị ọzọ echiche iji wee ghara ime ka ha sụọ ngọngọ. Mkpebi anyị ekwesịghị ime ka anyị bụrụ “ihe na-eme ka a sụọ ngọngọ.”—1 Ndị Kọrint 10:29, 32.
wee ghara ime ka nwanna m sụọ ngọngọ.” (Na-achọ Amamihe Chineke
16. Olee otú ekpere si enyere anyị aka n’ime mkpebi?
16 Ihe na-enyere anyị nnọọ aka n’ime mkpebi bụ ekpere. Jems onye na-eso ụzọ kwuru, sị: “Ọ bụrụ na amamihe kọrọ onye ọ bụla n’ime unu, ka ọ nọgide na-arịọ Chineke, n’ihi na o ji mmesapụ aka na-enye mmadụ nile ihe, n’akọchaghịkwa akọcha; a ga-enyekwa ya.” (Jems 1:5) Anyị pụrụ iji obi ike jekwuru Jehova n’ekpere ma rịọ ya ka o nye anyị amamihe dị anyị mkpa iji mee mkpebi ndị ziri ezi. Ka anyị na-agwa ezi Chineke ahụ ihe ndị na-echegbu anyị ma na-achọ nduzi ya, mmụọ nsọ nwere ike inyere anyị aka ịghọtakwu akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị anyị na-atụle ma chetara anyị ndị ọ pụrụ ịbụ na anyị leghaara anya.
17. Olee otú ndị ọzọ pụrụ isi nyere anyị aka mgbe anyị na-eme mkpebi?
17 Ndị ọzọ hà pụrụ inyere anyị aka n’ime mkpebi? Ee, Jehova enyela anyị ndị tozuru okè n’ọgbakọ. (Ndị Efesọs 4:11, 12) Anyị pụrụ ịkpọtụrụ ha, karịsịa ma ọ bụrụ na mkpebi anyị na-achọ ime bụ nke gbara ọkpụrụkpụ. Ndị nwere amamihe miri emi nke Okwu Chineke na ndị nwerela ahụmahụ ná ndụ nwere ike ichetara anyị ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ ndị ọzọ ndị nwere ike imetụta mkpebi anyị ma nyere anyị aka ‘ijide ihe ndị ka mkpa n’aka.’ (Ndị Filipaị 1:9, 10) Otú ọ dị, ọ dị otu ihe anyị kwesịrị icheta: Anyị aghaghị ịkpachara anya ka ndị ọzọ ghara imere anyị mkpebi. Ọ bụ ọrụ dịịrị anyị.
Ọ̀ Na-arụpụta Ezi Ihe Mgbe Nile?
18. Gịnị ka a pụrụ ikwu banyere ihe ga-esi n’ezi mkpebi pụta?
18 Mkpebi nile kwekọrọ nnọọ n’ụkpụrụ Bible na ndị e ji akọnuche mee hà na-arụpụta ezi ihe mgbe nile? Ee, n’ikpeazụ. Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ, ha pụrụ ịkpata nsogbu mgbe ahụ e mere ha. Shedrak, Mishak, na Abednego maara na mkpebi ha mere ịghara ife nnukwu ihe oyiyi ahụ pụrụ ịkpatara ha ọnwụ. (Daniel 3:16-19) N’otu aka ahụ, mgbe ndịozi gwachara ndị Sanhedrin ndị Juu na ha aghaghị irubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ, a pịara ha ihe tupu a hapụ ha. (Ọrụ 5:27-29, 40) Ọzọkwa, “mgbe na ihe ndapụta” nwere ike ime ka mkpebi ọ bụla kpata ọdachi. (Eklisiastis 9:11) Ọ bụrụ na anyị ataa ahụhụ ụfọdụ n’agbanyeghị na anyị mere ezi mkpebi, anyị pụrụ inwe obi ike na Jehova ga-enyere anyị aka idi ya nakwa na ọ ga-agọzi anyị n’ikpeazụ.—2 Ndị Kọrint 4:7.
19. Olee otú anyị pụrụ isi jiri obi ike buru ibu anyị n’ime mkpebi?
19 Ya mere, mgbe anyị na-eme mkpebi, anyị aghaghị ịchọpụta ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ ndị metụtara ya ma jiri ikike iche echiche anyị tinye ụkpụrụ ndị ahụ n’ọrụ. Anyị kwesịrị nnọọ ikele Jehova maka otú o si eji mmụọ nsọ ya na ndị tozuru okè n’ọgbakọ enyere anyị aka! Ebe anyị nwere ihe ndị ahụ ga-eduzi anyị na ihe ndị ọzọ ga-enyere anyị aka, ka anyị jiri obi ike buo ibu ọrụ dịịrị anyị nke ime mkpebi ndị amamihe dị na ha.
Gịnị Ka Ị Mụtara?
• Olee isi ihe dị mkpa n’ime ezi mkpebi?
• Olee otú ime mgbalị itozu okè si emetụta ndị anyị na-ahọrọ iso akpakọrịta?
• Olee ihe ụfọdụ dị mkpa anyị kwesịrị ịtụle mgbe anyị na-eme mkpebi ndị metụtara ọrụ?
• Olee ihe ndị ga-enyere anyị aka mgbe anyị na-eme mkpebi?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto dị na peeji nke 22]
Nnupụisi Adam na Iv na-akụziri anyị ihe dị ezigbo mkpa
[Foto dị na peeji nke 24]
Tupu i mee mkpebi gbara ọkpụrụkpụ, chọpụta ụkpụrụ Bible ndị metụtara ya