Olee Ebe Ụwa Na-eche Ihu?
Olee Ebe Ụwa Na-eche Ihu?
ỊDỊ N’OTU ỤWA. O yiri nnọọ ihe na-adọrọ mmasị. Ọ̀ dị onye na-achọghị ya? N’ezie, e kwuwo ọtụtụ okwu banyere ịdị n’otu. Ugboro ugboro, nzukọ ndị isi ụwa ehiwewo isi n’isiokwu ahụ. N’August 2000, ihe karịrị 1,000 ndị ndú okpukpe gbakọtara n’ụlọ ọrụ Mba Ndị Dị n’Otu nke dị na New York iji nwee Nzukọ Udo Ụwa Maka Narị Afọ Iri A. Ha kwurịtara otú ha ga-esi dozie ọgba aghara ndị dị n’ụwa. Otú ọ dị, e nwere ọgba aghara ọbụna ná nnọkọ nkwurịta okwu ahụ. Otu ọkàikpe ndị Alakụba na Jeruselem jụrụ ịbịa n’ihi na onye rabaị ndị Juu bịara. Ndị ọzọ were iwe n’ihi na a kpọghị onye ndú okpukpe Tibet bụ́ Dalai Lama n’ụbọchị abụọ mbụ n’ihi ụjọ a na-atụ na nke ahụ ga-akpasu ndị China iwe.
N’October 2003, mba ndị dị n’Ụsọ Oké Osimiri Pacific kwurịtara banyere ihe ndị metụtara nchebe ụwa ná nzukọ nke Njikọ Aka Akụ̀ na Ụba Eshia na Pacific (APEC) nke e nwere na Thailand. Mba 21 bịara ya kwere nkwa ikposa ìgwè ndị na-eyi ọha egwu, kpebiekwa ihe ndị ha ga-eme iji belata ihe ize ndụ n’ụwa nile. N’agbanyeghị nke ahụ, n’oge nnọkọ nkwurịta okwu ahụ, ọtụtụ ndị tamuru ntamu banyere ihe otu praịm minista kwuru, bụ́ nke a sịrị na ọ bụ ebubo e ji oké ịkpọasị bo ndị Juu.
N’ihi Gịnị Ka Ụwa Ji Ghara Ịdị n’Otu?
Ọ bụ ezie na a na-ekwusi okwu ike banyere ime ka ụwa dị n’otu, ọ dịghị oké ihe anyị na-ahụ na-esi na ya apụta. N’agbanyeghị ezi mgbalị ọtụtụ ndị na-eme, n’ihi gịnị ka ịdị n’otu ụwa na-ejibeghị ruo ihe a kpọrọ mmadụ aka ọbụna ruo na narị afọ nke 21 a?
Ihe otu n’ime ndị praịm minista bịara nzukọ nkwurịta okwu òtù APEC ahụ kwuru zatụrụ ajụjụ ahụ. O kwuru, sị, “E nwere ihe a a na-akpọ mmadụ iji mba ya akpa nganga.” Ee, ịhụ mba n’anya erikpuola ọha mmadụ. Ọchịchọ nke ịchị onwe ha na-achịkwa mba na ìgwè agbụrụ nke ọ bụla. Mba ịchị onwe ya tinyere mmụọ ịsọ mpi na anyaukwu agbakọtawo aka na-akpata nsogbu. Mgbe mgbe, ọ bụrụ na ihe ndị metụtara mba na ihe ndị metụtara ụwa dum apụtakọta, a na-ebu ụzọ elebara ihe ndị metụtara mba anya.
Okwu ọbụ abụ ahụ bụ́ “ajọ ọrịa na-efe efe nke na-eweta ịla n’iyi” kọwara ịhụ mba n’anya n’ụzọ dabara adaba. (Abụ Ọma 91:3) Ọ kpawo ụmụ mmadụ aka ọjọọ dị ka ihe otiti, na-eduga n’oké nhụjuanya. Ịhụ mba n’anya na ihe ọ na-arụpụta bụ́ ịkpọ ndị ọzọ asị adịwo n’etiti ụmụ mmadụ ruo ọtụtụ narị afọ. Taa, ịhụ mba n’anya nọgidere na-akpatakwu nkewa, ndị ọchịchị bụ́ mmadụ enwebeghịkwa ike ịkwụsị ya.
Ọtụtụ ndị ọchịchị na-aghọta na ịhụ mba n’anya na ịchọ ọdịmma onwe onye nanị bụ isi ihe ndị na-akpata nsogbu ụwa. Dị ka ihe atụ, onye bụbu Odeakwụkwọ Ukwu nke òtù Mba Ndị Dị n’Otu bụ́ U Thant kwuru, sị: “Ọtụtụ n’ime nsogbu ndị anyị nwere taa bụ n’ihi eleghị ihe anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị . . . Otu n’ime ha bụ ụzọ na-ezighị ezi e si ele ịhụ mba n’anya anya—‘akwụnyeere m obodo m, ma ò mere nke ọma ma ò mere nke ọjọọ.’” N’agbanyeghị nke ahụ, taa, mba dị iche iche, n’ịbụ ndị ịchọ ọdịmma onwe ha nanị na-akwali, na-enyewanye nsogbu ka e kwe ka ha chịwa onwe ha. Ndị nke na-achị onwe ha achị achọtụghị ka onye ọ bụla gwa ha ihe ha ga-eme. Dị ka ihe atụ, akwụkwọ bụ́ International Herald Tribune kwuru banyere Njikọ nke Mba Ndị Dị na Europe (EU), sị: “Nsọrịta mpi na atụkwasịrịtaghị obi ka bụ ihe ndị bụ́ isi e ji mara ndọrọ ndọrọ ọchịchị na Europe. Nye ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná mba ndị so na EU, ọ ka bụ
ihe ha na-agaghị anabata bụ́ otu n’ime ha inwe ikike karịa ndị nke ọzọ na iduzi ha.”Okwu Chineke, bụ́ Bible, na-akọwa ihe nile siworo n’ọchịchị mmadụ pụta n’ụzọ ziri ezi, sị: “Mmadụ nwere ike n’ahụ́ mmadụ ibe ya imejọ ya.” (Eklisiastis 8:9) Site n’ikewasị ụwa gaa ná mba ná mba, ìgwè mmadụ nakwa ndị mmadụ n’otu n’otu ahụwo mmezu nke ụkpụrụ a dị na Bible: “Ọchịchọ nke ya onwe ya na-achọsi ike ka onye na-ekewapụ onwe ya na-achọ, ọ bụ ezi nzube ihe nile ka ọ na-alụsosi ọgụ ike.”—Ilu 18:1.
Ọ dịtụghị mgbe Onye Okike anyị, bụ́ onye maara ihe karịa anyị, zubere ka ụmụ mmadụ guzobe ọchịchị nke ha ma na-achị onwe ha. Site n’ime otú ahụ, ụmụ mmadụ elegharawo nzube Chineke na eziokwu bụ́ na ihe nile bụ nke ya anya. Abụ Ọma 95:3-5 na-ekwu, sị: “Chineke ukwu ka Jehova bụ, Ọ bụkwa Eze ukwu na-achị chi nile. Onye ebe nile nke michasịrị emi nke ụwa dị n’aka Ya: ebe dịchasị elu nke ugwu nile bụkwa nke Ya. Onye nwere oké osimiri, Ya onwe ya mekwara ya; ọ bụkwa aka Ya kpụrụ ala akọrọ.” Chineke bụ Onye Ọchịchị Kasị Elu nke anyị kwesịrị ilegara anya ịchị anyị. Site n’ịnọgide na-agbalị ịchị onwe ha, mba dị iche iche na-eme ihe megidere uche ya.—Abụ Ọma 2:2.
Gịnị Ka A Chọrọ?
Nanị ihe ga-eme ka ụwa dị n’otu bụ inwe otu ọchịchị zuru ụwa ọnụ nke ga na-ahụ maka ọdịmma nke mmadụ nile. Ọtụtụ ndị nwere ọgụgụ isi ghọtara ihe a a chọrọ. Otú ọ dị, ha na-elekarị anya ya n’ebe na-ekwesịghị ekwesị. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ndị nkọwa, gụnyere ndị ndú okpukpe, agbawo ndị mmadụ ume ilegara òtù Mba Ndị Dị n’Otu anya maka ịdị n’otu ụwa. Otú ọ dị, òtù ndị ụmụ mmadụ hiwere, n’agbanyeghị otú echiche ha dịruru ná mma, enwebeghị nke nwere ike idozi nsogbu zuru ụwa ọnụ nke ihe a kpọrọ mmadụ. Kama nke ahụ, ihe ka ọtụtụ n’òtù ndị a aghọwo nnọọ ndị na-adịghị n’otu dị ka mba dị iche iche na-adịghị.
Bible na-adọ aka ná ntị megide ilegara òtù ụmụ mmadụ anya maka ime ka ụwa dị n’otu mgbe ọ na-ekwu, sị: “Unu atụkwasịla obi n’ahụ́ ndị a maara aha ha, ma ọ bụ n’ahụ́ nwa nke mmadụ, onye ọ na-adịghị nzọpụta o nwere.” (Abụ Ọma 146:3) Nke a ọ̀ na-egosi na ọ dịghị mgbe ụwa nile ga-adị n’otu? Ọ dịghị ma ọlị. Ọ dị otú ọzọ a pụrụ isi mee ka ụwa dị n’otu.
Ọtụtụ ndị amabeghị na Chineke eguzobewo otu ọchịchị nke pụrụ ime ka ụwa nile dị n’otu. Bible na-ekwu banyere Jehova Chineke, sị: “Mụ onwe m emewo ka eze m guzosie ike n’elu Zaịọn, bụ́ ugwu nsọ m. Rịọ m, na aga m enye gị mba nile ka ha bụrụ ihe nketa gị, na nsọtụ ụwa ka ha bụrụ ihe onwunwe gị.” (Abụ Ọma 2:6, 8) Rịba ama na akụkụ Akwụkwọ Nsọ a na-ekwu na Jehova Chineke ‘emewo ka eze ya guzosie ike,’ bụ́ onye o zoro aka na ya dị ka “ọkpara m” n’amaokwu nke 7. Nke a abụghị onye ọ bụla ọzọ ma ọ́ bụghị Ọkpara kachasị elu nke Chineke, bụ́ Jizọs Kraịst onye bụ́ mmụọ, bụ́ onye e nyeworo ikike ịchị mba nile.
Otú Ụwa Nile Ga-esi Dị n’Otu
Ọtụtụ mmadụ anakwereghị ịchịisi eluigwe a nke Chineke guzobere. Mba dị iche iche chọrọ ịnọgide na-achị onwe ha n’ihi na ha chere na ọ bụ ihe ruuru ha. Otú ọ dị, Chineke agaghị anabata ndị jụrụ ịnakwere ọbụbụeze ya na ọchịchị nke o guzobere. Banyere ndị jụrụ ịnakwere ndokwa a, Abụ Ọma 2:9 na-ekwu, sị: “Ị [Ọkpara ahụ, bụ́ Jizọs Kraịst] ga-eji mkpanaka ígwè tijisie ha; dị ka ihe ọkpụite kpụrụ ka a ga-atụpịa ha.” Ma hà ghọtara ya ma ọ bụ na ha aghọtaghị ya, mba nile nọ na njem ugbu a nke ga-eduga ha n’ịlụso Chineke agha. Akwụkwọ ikpeazụ nke Bible na-ekwu banyere “ndị eze nke elu ụwa dum mmadụ bi” ịbụ ndị a chịkọtara “gaa n’agha nke oké ụbọchị nke Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile.” (Mkpughe 16:14) A ga-ekpochapụ mba ndị ahụ tinyekwara nkewasị ha. Nke a ga-enye ohere ka ọchịchị Chineke rụọ ọrụ ya n’enweghị ihe mgbochi.
Dị ka Eze Eluigwe na Ala, Jehova Chineke, site n’aka Ọkpara ya, ga-eji amamihe jiri ike Abụ Ọma nke 72 na Bible gị? N’ebe ahụ, e kwuru ihe ọchịchị nke Ọkpara Chineke ga-emere ihe a kpọrọ mmadụ. Ndị mmadụ ga-adị nnọọ n’otu, nsogbu ha nile—mmegbu, ihe ike, ịda ogbenye na ihe ndị ọzọ—ga-apụkwa n’anya.
ya gbanwee ihe ndị dị mkpa iji wee weta ịdị n’otu ụwa. Ọchịchị Chineke ga-eme ka e nwee ezi ịdị n’otu, ọ ga-agọzikwa ndị nile hụrụ ezi omume n’anya. Gịnị ma i wepụta minit ole na ole iji gụọN’ụwa nke oge a nke kewasịrị ekewasị, ọtụtụ na-eche na olileanya dị otú ahụ agaghị emezu emezu. Ma ọ ga-abụ ihie ụzọ mmadụ iche otú ahụ. Nkwa Chineke adatụbeghị, ọ dịghịkwa mgbe ọ ga-ada. (Aịsaịa 55:10, 11) Ị̀ ga-enwe mmasị ịhụ mgbanwe a? Ị pụrụ ịhụ ya. N’ezie, e nwere ndị nọ na-akwadebe maka oge ahụ ugbu a. Ha si ná mba nile, ma kama ịdị na-alụrịta ọgụ, ha ji ịdị n’otu na-edo onwe ha n’okpuru ọbụbụeze Chineke ugbu a. (Aịsaịa 2:2-4) Ole ndị ka ha bụ? A maara ha dị ka Ndịàmà Jehova. Gịnị ma ị nakwere ịkpọ òkù ha ịga ebe ha na-enwe nzukọ? O yiri ka ọ̀ ga-amasị gị iso ndị pụrụ inyere gị aka irubere ọbụbụeze Chineke isi ma nụ ụtọ ịdị n’otu nke na-agaghị akwụsị akwụsị akpakọrịta.
[Foto ndị dị na peeji nke 7]
Ndị si ná mba nile na-akwadebe maka ndụ n’ime ụwa dị n’otu
[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji nke 4]
Saeed Khan/AFP/Getty Images
[Ebe E Sigasị Nweta Foto dị na peeji nke 5]
Nwanyị na-eru újú: Igor Dutina/AFP/Getty Images; ndị na-eme ngagharị iwe: Said Khatib/AFP/Getty Images; ụgbọ agha: Joseph Barrak/AFP/Getty Images