Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Akwụkwọ Mgbe Ochie nke Bara Uru Taa

Akwụkwọ Mgbe Ochie nke Bara Uru Taa

Ọtụtụ ndị kwetara na Baịbụl bụ akwụkwọ dị nsọ na-ekwu banyere Chineke. Ma, Baịbụl na-agwakwa anyị ihe ndị bara uru ga-enyere anyị aka kwa ụbọchị.

Dị ka ihe atụ, legodị ihe ụfọdụ ndị kwuru banyere uru ịgụ Baịbụl na ime ihe ha mụtara na ya baara ha.

“Obi na-eruzi m ala ugbu a. Anaghịzi m echegbukarị onwe m. Obi na-adịzi m ụtọ ugbu a karịa mgbe mbụ.”—Fiona.

“Ịmụ Baịbụl emeela ka ndụ m nwee isi ma na-atọ m ụtọ.”—Gnitko.

“Ndụ m akala mma ugbu a karịa mgbe mbụ. Anaghị m ejizi oge m niile arụ ọrụ. Enwekwuola m oge mụ na ezinụlọ m ji anọrị.”—Andrew.

Ọ bụghị naanị mmadụ ole na ole a kwuru na Baịbụl na-abara ha uru. N’ebe niile n’ụwa, ọtụtụ ndị achọpụtala na ime ihe Baịbụl kwuru na-abara ha uru kwa ụbọchị.

Ka anyị lee otú Baịbụl nwere ike isi nyere mmadụ aka ime ka ndụ ya kakwuo mma n’ihe banyere . . .

  • Ahụ́ ike

  • Mmadụ ijide onwe ya

  • Ezinụlọ na ndị enyi

  • Ego

  • Ihe ime mmụọ

Isiokwu ndị na-esonụ ga-egosi na Baịbụl abụghị naanị akwụkwọ dị nsọ, kama na ọ bụkwa akwụkwọ ga-abara mmadụ uru kwa ụbọchị.