Ị̀ Jụtụla Onwe Gị Ajụjụ Ndị A?
Ọ̀ bụrụ na Chineke hụrụ anyị n’anya, olee ihe mere o ji kwe ka ihe ọjọọ na-eme, anyị ana-atakwa ahụhụ ruo ugbu a?
Olee ihe mere obi ji sie anyị ike na anyị bi n’oge ọgwụgwụ nke ụwa a?
Olee otú anyị si mara na nkwa ndị Baịbụl kwere gbasara Alaeze Chineke ga-emezu?
Ihe Baịbụl kwuru ọ̀ ga-enyeliri anyị aka ime mkpebi ndị ga-abara anyị uru ná ndụ?
N’ihi ịhụnanya onye kere anyị nwere n’ebe anyị nọ, ọ zaala anyị ajụjụ ndị a nakwa ajụjụ ndị ọzọ. Ị chọọ ịmata azịza ndị ahụ, gaa n’adres Ịntanet anyị bụ́ jw.org/ig. E nwere ọtụtụ ihe ga-enyere ndị mmadụ aka ịmụ Baịbụl n’ebe ahụ.
Ị ga-ahụkwa ihe ndị ọzọ, dị ka, isiokwu dị iche iche, ihe a na-egere egere, vidio, ajụjụ ọnụ a gbara ndị mmadụ, akwụkwọ dị iche iche nakwa Baịbụl na ya. A gaghị ana gị ego ọ bụla maka ha.